Akwụkwọ ntụziaka niile na Ọkpụkpọ oku niile
37. Stek, Ngalaba ukwu, na Ngalaba nta Ndị Pụrụiche


“37. Stek, Ngalaba ukwu, na Ngalaba nta Ndị Pụrụiche,” Nhọrọ niile sitere na Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe (2023).

“37. Stek, Ngalaba ukwu, na Ngalaba nta Ndị Pụrụiche,” Nhọrọ niile sitere na Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe

Foto, oyiyi
ndị na-eri nri na ezi

37.

Stek, Ngalaba ukwu, na Ngalaba nta Ndị Pụrụiche

37.0

Ndubata

Onyeisi stek nwere ike tụpụta imepe stek, ngalaba ukwu, na ngalaba nta ndị pụrụiche iji jeere ndị otù ozi dị ka edepụtara n’isiakwụkwọ nke a.

37.1

Asụsụ Ngalaba ukwu na Ngalaba nta niile

Onyeisi stek nwere ike tụpụta ikewapụta asụsụ ngalaba ukwu ma ọ bụ ngalaba nta maka ndị otù stek (1) ndị na-adịghị asụ asụsụ ala ma ọ bụ (2) ndị na-asụ asụsụ ogbu.

37.7

Otu ndị dị niime Stek, Mishọn, na Mpaghara niile

Otù ndị a bụ obere nchịkọta ndị otù enyere ikike nke bishọp, onyeisi ngalaba nta, ma ọ bụ onyeisi mishọn na-elekọta. Onyeisi stek ma ọ bụ onyeisi mishọn nwere ike rọpụta ikepụta otu otu maka ọnọdụ ndị a sotere:

  • Ime njem nke ndị nwere ike ịbụ ndị otù bịaru na ngalaba ukwu ma ọ bụ ngalaba nta siri ike.

  • Ndị otù ole ma ole na-asụ asụsụ dị iche site na ndị a na-asụ na ngalaba ukwu ma ọ bụ ngalaba nta.

  • Ndị otù nọ na otù ndị agha ka a na-akachasị ejere ozi site na ha ịnọ niime otù.

Otù ọbụla ga-enwerịrị opekampe ndị otù abụọ. Otu ga-abụrịrị onye nchụaja tozuru oke niime Ọkwa nchụ aja nke Erọn ma ọ bụ onye ji Ọkwa nchụaja Melkizedek tozuru oke.

niime stek niile, onyeisi stek na-enye bishọp ma ọ bụ onyeisi ngalaba nta ọrụ ịhazi ma lekọta otu ahụ. niime mishọn niile, onyeisi mishọn na-enye onyeisi ngalaba nta ọrụ ịhazi ma lekọta otu ahụ.

Onyeisi stek, onyeisi mishọn, bishọp, ma ọ bụ onyeisi ngalaba nta na-akpọ onye ndu otu ma dopụ ya iche. Onye ndu otu ahụ na-ahazi ma na-edu nzukọ otu ahụ niile, nke gụnyere nchịkwa nke oriri nsọ.

Onye ndu otu anaghị eji ọtụghe niile nke ọkwa nchụaja, ma enyeghị ya ikike:

  • Ịnata otu ụzọ n’ụzọ iri niile na onyinye niile.

  • Ịdụ ndị otù ndụmọdụ banyere ajọọ mmehie.

  • Inye mgbochi ịbụ onye otù n’okpụrụ iwu ma ọ bụ nke na-anọghị n’okpuru iwu.

  • Ịrụ ọrụ ndị ọzọ nke na-achọ ọtụghe ọkwa nchụaja niile.

Nezie, otu ndị a na-eji Isi Atụmatụ Ngalaba eme ihe.

Ndekọihe niile nke ịbụ onye otù nke ndị otù otu ka a na-edebe na ngalaba ukwu ma ọ bụ ngalaba nta nke na-elekọta otù ahụ.

Isi ụlọ ọrụ Nzukọ nsọ anaghị enye otu ndị ahụ ọnụọgụgụ nke ngalaba.

Bipụta