Isi 50
Moronaị wee wusie ala nile nke ndị Nifaị ike—Ha wee wuo ọtụtụ obodo-ukwu ọhụrụ—Ọtụtụ agha na mbibi wee dakwasị ndị Nifaị n’ụbọchị nile nke ajọọ-omume ha na ihe arụ nile—Moriantọn na ndị nghọtahịe ya nile Tiankọm meriri ha—Nifaịha wee nwụọ, ma nwa ya nwoke Pehoran wee nọchie oche-ikpe ahụ. Ihe dịka n’afọ 72 ruo 67 tutu amụọ Kraịst.
1 Ma ugbua o wee ruo na Moronaị akwụsịghị ime njikere nile maka agha, ma-ọbụ ichekwa ndị ya megide ndị Leman; n’ihi na o mere ka ndị-agha ya nile malite na mmalite nke iri afọ abụọ nke ọchịchị nke ndị-ikpe, ka ha wee malite igwulite mkpomkpo aja gburu-gburu obodo-ukwu ahụ nile, akụkụ nile nke ala ahụ nke ndị Nifaị nwere.
2 Ma n’elu mgba-aja nile ahụ o mere na e kwesịrị inwe osisi nile e ji ewu ụlọ, e, ọrụ nile nke osisi e ji ewu ụlọ e wulitere elu ruo ogologo nke mmadụ, gburu-gburu obodo-ukwu ndị ahụ nile.
3 Ma o mere ka n’elu ọrụ nile nke osisi e ji ewu ụlọ a ga-enwe okporo-osisi a pịrị ka ọ na-adụ ogwu e wukwasịrị n’osisi nile ahụ e ji ewu ụlọ ahụ gburu-gburu; ma ha siri ike ma dị elu.
4 Ma o mere ka e wulite ụlọ-elu tọwa ka ha na elefe ọrụ nke okporo-osisi ahụ a pịrị-ka-ha-na-adụ ogwu anya, ma o mere ka e wuo ebe nchekwa nile n’elu ụlọ-elu tọwa nile ahụ, nke mere na okwute nile na arọ nile nke ndị Leman enweghị ike imerụ ha arụ.
5 Ma a kwadoro ha nke mere na ha nwere ike ịtụ okwute nile site n’elu ebe ahụ, dịka o siri masị ha na ka ume ha ra, ma gbuo onye ọbụla nwara-anwa ịbịaru mgbidi nile nke obodo-ukwu ahụ nso.
6 Otu a Moronaị kwadoro ebe e wụsịrị-ike nile megide ọbịbịa nke ndị iro ha nile, gburu-gburu obodo-ukwu ọbụla n’ala ahụ nile.
7 Ma o wee ruo na Moronaị mere ka ndị-agha ya nile ga-agaba n’ime ọzara ọwụwa-anyanwụ ahụ; e, ma ha garuru ma chụba ndị Leman nile ndị nọ n’ọzara ọwụwa-anyanwụ ahụ n’ime ala nke ha nile, nke dị na ndịda-ndịda nke ala Zarahemla ahụ.
8 Ma ala nke Nifaị gara n’ụzọ guzoro kwem site n’osimiri ọwụwa-anyanwụ ruo n’ọdịda-anyanwụ.
9 Ma o wee ruo na mgbe Moronaị chụpụworo ndị Leman nile site n’ọwụwa-anyanwụ nke ọzara ahụ, nke dị n’elu-elu nke ala nile nke ha onwe ha nwere, o mere ka ndị bi n’ebe ahụ ndị nọ n’ala nke Zarahemla na n’ala ahụ gburu-gburu ga-agaru n’ime ọzara ọwụwa-anyanwụ, ọbụna ruo n’oke nile n’akụkụ osimiri, ma nwere ala ahụ.
10 Ma o debekwara ndị-agha nile na ndịda ndịda ahụ, n’oke nile nke ebe ha nwere, ma mee ha ka ha wulite ebe siri-ike nile ka ha wee nwee ike ichekwa ndị-agha ha nile na ndị ha site n’aka nile nke ndị iro ha.
11 Ma otu a o kewapụrụ ebe nile siri ike nke ndị Leman n’ọzara ọwụwa-anyanwụ ahụ, e, na kwa n’ọdịda anyanwụ, na-ewusike oke ahụ dị n’etiti ndị Nifaị na ndị Leman, n’etiti ala nke Zarahemla na ala nke Nifaị, site n’oke osimiri ọdịda-anyanwụ, na-agba n’akụkụ isi osimiri Saịdọn ahụ—ndị Nifaị nwere ala nile dị n’elu-elu, e, ọbụna ala nile nke dị n’elu-elu nke ala Uju ahụ, dịka mmasị ha siri dị.
12 Otu a Moronaị, ya na ndị-agha ya nile, ndị na-abawanye kwa ụbọchị n’ihi nkwa nke nchekwa nke ọrụ ya nile wetaara ha, ma chọọ ibepụ ume na ike nke ndị Leman pụọ site n’ala nile nke onwunwe ha, ka ha ghara inwe ike n’ala ahụ nile nke onwunwe ha.
13 Ma o wee ruo na ndị Nifaị malitere ntọ-ala nke otu obodo-ukwu, ma ha kpọrọ aha obodo-ukwu ahụ Moronaị; ma ọ dị n’akụkụ oke osimiri ọwụwa-anyanwụ; ma ọ dị na ndịda n’akụkụ oke-ala nke ihe ọnwụnwe nile nke ndị Leman.
14 Ma ha malitekwara ntọ-ala maka obodo-ukwu dị n’etiti obodo-ukwu nke Moronaị na obodo-ukwu nke Erọn, na-ejikọ oke-ala nile nke Erọn na Moronaị; ma ha kpọrọ aha nke obodo-ukwu ahụ, ma-ọbụ ala ahụ, Nifaịha.
15 Ma ha malitekwara n’otu afọ ahụ iwu ọtụtụ obodo-ukwu n’ebe elu-elu, otu n’ụdị dị iche nke ha kpọrọ Lihaị, nke dị n’ebe elu-elu n’akụkụ oke-ala nile nke akụkụ oke-osimiri ahụ.
16 Ma otu a ka iri afọ abụọ siri gwụchaa.
17 Ma n’ọnọdụ ime nke ọma nile ndị a ka ndị Nifaị nọ na mmalite nke iri afọ abụọ na otu nke ọchịchị nke ndị-ikpe na-achị ndị nke Nifaị.
18 Ma ha mere nke ọma karịa, ma ha bara ụba karịa; e, ma ha mụbara ma gbasie ike n’ala ahụ.
19 Ma otu a anyị hụrụ otu obi ebere na ikpe ziri-ezi nke mmekọ nile nke Onye-nwe siri dị, ruo na mmezu nke okwu ya nile nye ụmụ nke mmadụ; e, anyị nwere ike ịhụ na okwu ya nile a chọpụtawo na ha bụ ezi-okwu, ọbụna n’oge ugbua, nke ọ gwara Lihaị, na-asị:
20 Ngọzi na-adịrị gị na ụmụ gị; ma a ga-agọzi ha, ma ọbụrụra na ha ga-edebe iwu-nsọ m nile ha ga-eme nke ọma n’ala ahụ. Mana cheta, ọbụrụra na ha agaghị edebe iwu-nsọ m nile a ga-ebepụ ha site n’ebe Onye-nwe nọ.
21 Ma anyị hụrụ na nkwa nile a achọpụtawo na ha bụ ezi-okwu gosị ndị nke Nifaị; n’ihi na ọbụrụwọrịị esem-okwu ha nile na ndọrọ-ndọrọ ha nile, e, igbu mmadụ ha nile, na mpụnarị ihe ha nile, ife-arụsị ha, ịgba akwụna ha nile, na ihe arụ ha nile, ndị dị n’etiti ha n’onwe ha, nke wekwasịrị ha agha ha nile na mbibi ha nile.
22 Ma ndị ahụ kwesịrị-ntụkwasị-obi n’idebe iwu-nsọ nile nke Onye-nwe a napụtara ha mgbe nile, ebe ọtụtụ puku nke ụmụnne ha ndị ajọọ-omume e nyefewo ha na ịbụ-oru, ma-ọbụ ịla n’iyi site na mma-agha, ma-ọbụ ịla-azụ n’ekweghị-ekwe, ma gwakọrịta ha na ndị Leman.
23 Mana lee ọdịghị mgbe e nwere an̄ụrị n’etiti ndị nke Nifaị karịa oge a, site n’ụbọchị nile nke Nifaị, karịa n’ụbọchị nile nke Moronaị, e, ọbụna n’oge nke a, n’iri afọ abụọ na otu nke ọchịchị nke ndị-ikpe.
24 Ma o wee ruo na n’iri afọ abụọ na abụọ nke ọchịchị nke ndị-ikpe gwụkwara n’udo; e, na kwa afọ nke iri abụọ na atọ.
25 Ma o wee ruo na na mmalite nke iri afọ abụọ na anọ nke ọchịchị nke ndị-ikpe, a gaara enwe kwa udo n’etiti ndị nke Nifaị ma asị na ọbụghị ndọrọ-ndọrọ nke weere ọnọdụ n’etiti ha gbasara ala nke Lihaị, na ala nke Moriantọn, nke ya na oke ala nile nke Lihaị jikọtara; ndị nke ha abụọ dịcha n’oke ala nile n’ikpere mmiri ahụ.
26 N’ihi na lee, ndị nwe ala nke Moriantọn ahụ weere otu akụkụ ala nke Lihaị ahụ dịka nke ha; ya mere a malitere inwe ndọrọ-ndọrọ dị ọkụ n’etiti ha, nke mere na ndị nke Moriantọn welitere ngwa-agha nile megide ụmụnne ha, ma ha mere mkpebi site na mma-agha ahụ igbu ha.
27 Mana lee, ndị nke nwere ala nke Lihaị ahụ gbagara ebe izu-ike nke ndị Moronaị, ma rịọ ya maka enyem-aka; n’ihi na lee ha anọghị n’ezighị-ezi.
28 Ma o wee ruo na mgbe ndị nke Moriantọn, ndị a na-edu site na nwoke aha ya bụ Moriantọn, chọpụtara na ndị nke Lihaị agbabawo n’ebe izu ike nke Moronaị, ha tụrụ egwu karịrị akarị eleghị-anya ndị-agha nke Moronaị ga-abịakwasị ha ma bibie ha.
29 Ya mere, Moriantọn tinyere ya n’ime obi ha nile ka ha gbaga n’ala nke dị n’elu-elu, nke e kpuchịrị jiri ọtụtụ nnukwu mmiri, ma were onwunwe nke ala ahụ nke dị n’elu-elu.
30 Ma lee, ha gaara eburuworịị atụmatụ nke a n’ihe e mezuworo, (nke gaara abụ ihe a gaara akwa arịrị) mana lee, Moriantọn ebe ọ bụ nwoke nwere nnukwu mmetụta, ya mere o weere otu nwa-ozi ya nwa-agbọghọbịa iwe, ma ọ dakwasịrị ya ma tie ya nnukwu ihe.
31 Ma o wee ruo na ọ gbafuru, ma bịafeta n’ebe izu-ike nke Moronaị, ma gwa Moronaị ihe nile gbasara ihe ahụ, na kwa gbasara ebum-n’obi ha nile ịgbaba n’ala ahụ dị n’elu-elu.
32 Ugbua lee, ndị ahụ nọọrọ n’ala Uju ahụ, ma-ọbụ n’ụdị ọzọ Moronaị, tụrụ egwu na ha ga-an̄a-ntị n’okwu nile nke Moriantọn ma jikọta-ọnụ ya na ndị ya, ma otu a ọ ga-enweta onwunwe nke akụkụ ala ndị ahụ nile, nke ga-atọ ntọ-ala maka ihe ndị dị mkpa ga-eso ya n’etiti ndị nke Nifaị, e, ihe ndị na-eso ya nke ga-eduga na nkwatu nke ntọhapụ ha.
33 Ya mere Moronaị zigara ndị-agha, jiri ihe izu-ike ha, ịgbabichi ndị nke Moriantọn, ka ha kwụsị mgbaba ha n’ala dị n’elu-elu.
34 Ma o wee ruo na ha agbabichighị ha ruo mgbe ha bịaruworo oke-ala nile nke ala Ọtọgbọrọ n’efu; ma n’ebe ahụ ha gbabichịrị ha, n’akụkụ ụzọ mkpafa nke na-aga n’akụkụ osimiri ahụ baa n’ala dị n’elu-elu, e, n’akụkụ osimiri ahụ, na ọdịda-anyanwụ na n’ọwụwa-anyanwụ.
35 Ma o wee ruo na ndị-agha ahụ nke Moronaị zipụrụ, nke onye na-edu ha bụ otu nwoke aha ya bụ Tiankọm, gakwuru ndị nke Moriantọn; ma oke ekwe-ekwe ka ndị nke Moriantọn bụ, (ebe a na-akwalite mụọ ha site na ajọọ-omume ya na okwu otuto-esighị n’obi ya nile) na agha malitere n’etiti ha, n’ime nke Tiankọm gburu Moriantọn ma merie ndị-agha ya, ma kpọrọ ha ndị-mkpọrọ, ma laghachị n’ebe izu-ike nke Moronaị. Ma otu a ka iri afọ abụọ na anọ nke ọchịchị nke ndị-ikpe na-achị ndị nke Nifaị sirị gwụchaa.
36 Ma otu a ka e siri kpọghachị ndị nke Moriantọn azụ. Ma mgbe ha gbaworo-ndụ idebe udo ahụ a kpọghachịrị ha n’ala nke Moriantọn, ma njikọta-ọnụ weere ọnọdụ n’etiti ha na ndị nke Lihaị ahụ; ma a kpọghachịkwara ha n’ala ha nile.
37 Ma o wee ruo na n’otu afọ ahụ nke e weghachiri udo nye ndị nke Nifaị, ka Nifaịha, onye-isi-ikpe nke abụọ, nwụrụ, ebe ọ nọchịworo oche-ikpe ahụ jiri ezi-okwu zuru oke n’iru Chineke.
38 Otu o sila dị, o jụworịị Alma iwere onwunwe nke akụko-ndekọta ndị ahụ enwere, ha na ihe ndị ahụ Alma na ndị nna ya ha chere na ha kachasịrị dị nsọ; ya mere Alma enyefewo ha rị nwa ya nwoke, Hilaman.
39 Lee, o wee ruo na nwa nwoke nke Nifaịha ka a họpụtara ịnọchị oche-ikpe ahụ, n’ọnọdụ nna ya; e, a họpụtara ya onye-isi-ikpe na onye-ọchịchị nye ndị ahụ, jiri ịn̄ụ-iyi na emume dị nsọ ikpe-ikpe zịrị-ezi, na idebe udo ahụ na inwere-onwe nke ndị ahụ, na ikwenyere ha n’ohere ha nile dị nsọ ife Onye-nwe Chineke ha, e, ịkwado na ichekwa ụzọ nke Chineke ụbọchị ya nile, na iweta ndị ajọọ-omume n’ikpe-ziri-ezi dịka imebi-iwu ha siri dị.
40 Ugbua lee, aha ya bụ Pehoran. Ma Pehoran nọchịrị oche nke nna ya, ma malite ọchịchị ya na ngwụcha nke iri-afọ abụọ na anọ, nye ndị nke Nifaị.