O Chineke, Nna nke Ebighi-ebi, anyị na-arịọ gị n’aha nke Ọkpara gị, Jisus Kraịst, Ka ị gọzie ma doo achịcha nke a nsọ nye mkpụrụ obi nile nke ndị nile ga-eketa oke na ya; ka ha wee rie na ncheta nke arụ nke Ọkpara gị, na gbaara gị aka-ebe, O Chineke, Nna nke Ebighi-ebi, na ha nọ na njikere iwekwasị onwe ha aha nke Ọkpara gị, ma na-echeta ya oge nile, ma na-edebe iwu-nsọ ya nile nke o nyeworo ha, ka ha wee na-enwe Mụọ ya oge nile ịnọnyere ha. Amen.