2013
Mee ndekọta nke ihe e mere
Ọgọọst 2013


Ndị Ntorobia

Mee nddekọta nke ịhe e mere

Onye Ιsi-nduzi Eyring nomiri Onye Isi-nduzi Spencer W. Kimball (1895– 1985) dịka ikwu na “akwụkwọ-ndekọta nile bụ otu ụzọ nke ịgụkọ ngọzi anyị nile, makwa bụrụ ụzọ ị hapụrụ ụmụ ụmụ anyị ndekọta nke ịhe e mere nke ngọzi nile ndị a.” Na Ọgbakọ zụrụọha nke Ọnwa Irị 2012, Onye Isị-nduzi Thomas S. Monson nyere ọgbugba-ama ya maka ị dee akwụkwọ-ndekọta. O kekọrịtara ụfọdụ ahụmịhe nile sitere na ndụ ya, na-agbakwunye, “Akwụkwọ-ndekọta nke ụbọchị m nile, e debere ke mgbe afọ nile ndị a, enyewo aka ị kọwazi ụfọdụ akụkọ nke m na-agaraghị enwe ike ị cheta ọfụma.” O nyere ndụmọdụ, “Mee ndekọta nke ịhe nile mere na ndụ gị, ma chọọ nanị maka ngọzi nile, ndị nnukwu na ndị ntakịrị; ị nataworo (“Tulee Ngọzi nile ahụ,” Liahona and Ensign, Ọnwa Ịri-na-otu 2012, 86). Jisi ike ka i soro ndụmọdụ nke ndị-amụma ndịa ma kpebie n’obi, ma bido deebawa n’ime akwụkwọ-ndekọta gị.

Bipụta