2013
Mata, Cheta, ma Nye Ekele
Ọgọọst 2013


Ozi nke Otu Ndị-Ịsi Ndụzi Mbụ, ọnwa ogọst, 2013

Mata, Cheta, ma Nye Ekele

Onye isi nduzi Henry B. Eyring

Chineke na-achọ ka anyị na-enye Ya ekele maka ngọzi nile ọbụla anyị natara n’aka Ya. Ọ dịrị anyị mfe ịdị na-ekwuzi n’etinyeghị uche n’ekpere anyị nile nke obi-ekele, ọtụtụ mgbe n’ekwugharị otu okwu nile ndị ahụ mana n’ejighị ebụm n’obi nke ịnye ekele dịka onyinye nke obi nye Chineke. Anyị ga “na-enye ekele … n’ime Mụọ” (Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 46:32) nke ga-eme ka anyị nwe ezigbo obi-ekele maka ịhe Chineke nyeworo anyị.

Olee otu anyị ga-esi nwe ike ịcheta ọbụna otu n’ime ịhe nile Chineke meworo anyị? Onye-ozi Jọn dekọtara ịhe Onye-Nzọpụta kuzịrị anyị gbasara onyinye nke ncheta nke na-abịa site n’onyinye nke Mụọ Nsọ: “Mana Onye-nkasị-obi ahụ, nke bụ Mụọ Nsọ, onye nke Nna ga-ezita n’aha m, ọ ga-akuziri unu ịhe nile, ma weta ịhe nile na ncheta nye unu, ịhe nile ọbụla m gwaworo unu” (Jọn 14:26).

Mụọ Nsọ na-eweghachi uche nile nke ịhe Chineke kuziworo anyị. Ma otu n’ụzọ nile Chineke si n’akuiri anyị ịhe bụ site na ngọzi Ya nile, ma nihi nkea, ọbụrụ na anyị họrọ ịgosipụta okwukwe, Mụọ Nsọ ahụ ga-echetara anyị obi-ọma nile nke Chineke.

Unu nwere ike ịnwale nke ahụ n’ekpere taa. Umu nwere ike isoro iwu ahụ “Ị ga-ekele Onye-nwe-anyị Chineke gị n’ịhe nile” (Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 59:7).

Onye-isi-nduzi Ezra Taft Benson (1899–1994) tụnyere aro na ekpere na-ewepụta oge ịme nke ahụ. Ọ sịrị: “Onye-amụma Josef kwuru n’otu oge na otu n’ime mmehie nile nke kachasị ukwuu nke ndị Nsọ ụbọchị Ikpe-azụ a ga-enwe ikpe-ọmụma bụ mmehie nke enweghị obi-ekele. Ewere m ya dịka n’ezi-okwu na ọtụtụ n’ime anyị echebeghị maka nke ahụ dịka nnukwu mmehie. Ọ na-adịkarịrị anyị mfe nime ekpere anyị nile, na n’ime arịọrịọ anyị nile n’ebe Onye-nwe-anyị nọ, ịrịọ ya maka ngọzị kwa mgbe. Mana oge ụfọdụ echerem na ọdị mkpa n’anyị kwesịrị ịme ka ekpere anyị nile bụrụ ngọsịpụta nile nke obi-ekele na ịnye-ekele maka ngọzi nile a nataworo rịị. Anyị na-enwe ọnụ nke ukwuu.”1Ị nwere ike ịnweta ụdị ahụmịhe nke a site n’onyinye nke Mụọ Nsọ taa

. Ị nwere ike iji ekele malite ekpere nzuzo. Ị nwere ike bido ịgụkọ ngọzi gị nile ma kwụsịgodi nwa mgbe nta, ka ịchee ha n’obi gi. Ọbụrụ na i gosịpụta okwukwe, site n’onyinye nke Mụọ Nsọ, ị ga-achọpụta na ngọzi nile ndị ọzọ echefuru-echefu ga-awụbata n’ime echiche gị. Ọbụrụ na gị malite igosịpụta obi-ekele maka nke ọbụla n’ime ha, ekpere gị nwere ike iwere ntakịrị ogologo oge karịa ka o si na-adị. Ncheta ga-abịa, obi-ekele ga-esochi ya azụ kwa.Ị nwere ike ịnwale otu ịhe ahụ dịka ị na-edebanye ịhe n’ime akwụkwọ ndekọta akụkọ gị

. Mụọ Nsọ enyeworo ndị mmadụ aka na nke ahụ kamgbe mmalite oge. Ị chetara na akwukwọ nke Mosis na-asị, “Ma akwụkwọ nke ncheta ka e debere, n’ime nke e dekọtara, n’asụsụ nke Adam, nihi na e nyere ya mmadụ ole ahụ kpọkuru Chineke ka ha dee site na mụọ nke mkpalite nke mụọ” (Moses 6:5 ).

Onye isi nduzi Spencer W. Kimball (1895–1985) kọwara usoro nke ịde-ịhe site na nkpalite nke mụọ: “Ndị nke na-edebe akwụkwọ nke ncheta ga-aka na edebe Onye-nwe-anyị na ncheta na ndụ ha nile kwa ụbọchị. Akwụkwọ ndekọta akụkọ nile bụ otu ụzọ nke ịgụkọ ngọzi anyị nile na nke ịhapụrụ ụmụ-ụmụ anyị ịhe ndekota nke ngọzi nile ndị a.”2

Dịka ị na-amalite ịde, ị nwere ike ijụ onwe gị, “Olee otu Chineke siri gozie mụ na ndị m hụrụ n’anya taa?” Ọbụrụ na ị mee nke ahụ ugboro ugboro otu zuru-ezu ma jiri okwukwe, ị ga-ahụ onwe gị ka ị na-echeta ngozi nile. Ma mgbe ụfọdụ ị ga-enwe onyinye nile e webatara n’echiche gị nke ị na-ahụtaghị n’oge mbụ mana nke ị ga-amata mgbe ahụ na ha bụụrụ mbitụ-aka nke Chineke na ndụ gị.

Ana m ekpe ekpere ka anyị nwe ike mee mgbalị esepụghị-aka n’okwukwe ịmata, icheta, na inye ekele maka ịhe Nna anyị nke Elu-igwe na Onye-nzọpụta anyị meworo ma na-eme iji meghe ụzọ ịlakwuga Ha n’ebe-obibi.Ịhe

nhụba ama nile

  1. Ezra Taft Benson, Chineke, Ezi na ụlọ, obodo: Ịhe Atọ nke Nnukwu Ikwesi-ntụkwasị-obi Anyị (1974), 199.

  2. Spencer W. Kimball, “Gee ndị Amụma ntị,” Ensign, May 1978, 77.Nkuzi si n’ozi a

N’ozi ya, Onye-isi nduzi Eyring na-akpọ anyị oku ịcheta obi-ọma nile Nna nke Elu-Igwe n’ekpere anyị nile. Kparịta-ụka gị na ndị ị na-akuziri ịhe, otu iji obi-ekele kpee ekpere g’esi enyere anyị aka ịmata aka nke Chineke n’ime ndụ anyị nile. Tulee isekpu-ala na-ekpe ekpere gị na ndị ị na-akuziri ịhe, ma tụnyere onye ọbụla ga-ekpe ekpere aro ka o gosịpụta nanị ekele.

Unu nwekwara ike ịmụ mkpa nke obi-ekele dị site n’ịgụ ama-okwu nile ndịa na mgbakwunyere ama-okwu nile nke Onye-isi nduzi Eyring kpọrọ: Abụ-Ọma 100; Mosiah 2:19–22; Alma 26:8; 34:38; Ozizi na Ọgbụgba-ndụ 59:21; 78:19; 136:28