2013
Ọdị mma
Ọgọọst 2013


Ozi nke Nkuzi ndị Nleta, Ọnwa Asatọ 2013

Ọdị mmaJiri ekpere mụọ ịhe ngwa-ọrụ a ma, dịka ọkwesịrị, kparịta nkata ya gị na ndị ụmụnne nwanyị ndị ị na eleta.

Jiri ajụjụ nile maka ị nyere onwe gị aka ị gba ndị ụmụnne gị nwanyi nile ume na ime ka Otu Enyem-aka bụrụ ịhe nke dị nko na ndụ nke onwe gị. Maka ị nweta nkọwa ndị-ọzọ, gaa na reliefsociety.lds.org

Okwukwe, Ezi-na-ụlọ, Enyem-aka

Ebumn’obi nile nke Atụmatụ-Ọdị-mma nke Nzukọ-nsọ bụ ị nyere ndị-otu aka ịdaberezi n’onwe ha, ị lekọta ndị ogbenye na ndị nọ na mkpa, na ije ozi. Ọdị-mma dị n’etiti ọrụ nke Otu Enyem-aka. Onye-isi-nduzi B. Eyring, Onye-Ndụmọdụ Mbụ n’otu Ndi Isi nduzi Mbụ, akụziwo:

“(Onye-nwe-anyị) site na mmalite nke oge enyewo ụzọ nile maka ndị-n’eso ụzọ Ya iji na-enye-aka. Ọ kpọwo ụmụ Ya oku ị nyefecha oge ha, ịhe mnweta ha, na onwe ha nile ka Ya na ha jikọta aka n’ijere ndị ọzọ ozi. …

“Ọ kpọwo oku ma nye anyị iwu itinye-aka n’ọrụ Ya ikulite ndị nọ na mkpa elu. Anyị na-eme ọgbụgba-ndụ ime nke ahụ n’ime mmiri nile nke baptism na n’ime temple nsọ nile nke Chineke. Anyị na-emegharị ọgbụgba-ndụ ahụ ọhụrụ n’ụbọchị Sọnde nile mgbe anyị na-anata oriri-nsọ.”1

N’okpuru ntụzi-aka nke bishọp ma ọbụ onye-isi nduzi ngalaba nta, ndi-ndu nke ebe ha nọ na-enye aka maka ọdị-mma nke mụọ na nke anụ ahụ. Ohere oma ije-ozi na-ebidokarị site na ndị nkuzi na-aga nleta ndị na-acho mkpalite nke mụọ ị mata otu ha ga-esi zaa oku maka mkpa nile nke nwanne nwanyị ọbụla ha gara leta.

Site na Akwukwọ-nsọ nile

Luke 10:25–37; James 1:27; Mosiah 4:26; 18:8–11; Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 104:18

Site na Akụkọ mgbe ochie anyị

Na Ọnwa Isii, 1842, Onye-amụma Josef Smith nyere ụmụnne nwanyị nọ n’otu Enyem-aka iwu ka ha “nyere ndị ogbenye aka” na ka ha “zopụta mkpụrụ-obi nile.”2 Ebumn’uche nile ndị a ka dị kwa n’obi nke Otu Enyem-aka, ma e depụtara ya n’ahịrị-okwu na-edu ndị-otu anyị “Ihun’anya adịghị mgbe ọ ga-ada.” (1 Ndị Korint 13:8).

Onye-isi-nduzi ozuruoha nke ise nke Otu Enyem-aka anyị, Emmeline B. Wells, na ndị ndụmọdụ ya wepụtara isi-okwu ahu na-edu ndị-otu n’afọ 1913 dịka ịhe ncheta nke ụkpụrụ nile nke ntọ-ala anyị. “Anyị na-ekwupụta ya n’ọbụ ebum n’uche anyị ị… [jide] sike na nkuzi nile ahụ si na mkpalite nke mụọ nke Onye-amuma Josef Smit, mgbe o kpughere atụmatụ ahụ nke a ga-esi nye ndinyom ike site n’ọkpụkpọ nke ndị ji ọkwa-nchụ-aja, ka akpọkọta ha n’otu nhazi nile dabara adaba maka ebumn’obi nke ileta ndị ọrịa, inyere ndị nwere mkpa aka, ị kasị ndị okenye obi, ị dọ ndị na-anaghị akpachapụ anya aka na ntị, na inyere ndị na-enweghị nne na nna aka.3

Taa, Otu Enyem-aka ahụ na-agaru ụwa nile dịka umunne nwanyị na-esetipu afọ-ọma, ịhụn’anya ahụ na-enweghị ntụpọ nke Kraịst, nye ndị agata-obi (lee Moroni 7:46–47).

Ịhe nhụba-ama nile

  1. Henry B. Eyring, “Ohere-ọma nile ị mee Ịhe-ọma,” Liahona na Ensign, Ọnwa Ise 2011, 22.

  2. Josef Smith, n’ime Daughters in My Kingdom: Akụkọ ochie na ọrụ nke otu-Enyem-aka (2011), 97.

  3. Daughters in My Kingdom, 63.

Gịnị ka m nwere ike ị mee?

  1. Olee otu m si na-akwado ị lekọta onwe m na ezi na ụlọ m na mụọ na n’anụ-ahụ?

  2. Olee otu m ga-esi nwe ike isoro ịhe nlere-anya nke Onye-nzọpụta ahụ dịka m na-enye aka izute mkpa nile nke ụmụnne nwanyị m na-elekọta?

Bipụta