2013
E nwere ike ịnye gị otu akwụkwọ nke mọmọn?
Disemba 2013


Ntorobia

Nwere ike ikesa akwụkwọ nke mọmọn?Nke si n’aka Josh Arnett

Onye dere ya bi na Washington na mba America.

N’afọ mbụ m n’ụlọ akwụkwọ nke sekọndịrị, onye nkuzi seminarị m kpọrọ ndi enyi m ka anyi nye ndi enyi anyi n’abụghị ndị otu nzukọ anyị akwụkwọ nke mọmọn. N’agbanyeghi na abụ m onye na-eme oke ihere, a nabatara m oku ahu.

O were m ọtụtụ ụbọchị inwe obisike, ma emechara m nye enyi m aha ya bu Britny akwụkwọ a n’oge ezumike nri ehihie ma gbaa nwa nke-nke ama.

Na mmechi afọ ulọ akwụkwọ ahụ, Britny hapuru ulọ akwụkwọ jewa ebe ọzọ, ma anyi nogidere n’ịkparịta ụka. BBritny kọsaara m banyere ụlọ akwụkwọ ọhụrụ ya,na otu ọtụtụ ndi enyi ọhụrụ ya si buru ndi otụ nzukọ a, ma onweghi mgbe ọ kọtụrụ m gbasara ihe ime mụọ.

Nke ahụ gbanwere tupu m gawa ọrụ mgbasa-oziọma m. A nataram ozi nke si n’aka Britny, nke na-ekwu na ya nwere ozi dị ukwuu inye m: ọ na-akwado ime baptizim, ma were ohere ahu n’ekele m n’ibu enyi ya nakwa ibi ezi ndu nlere anya ya.Chineke jiri nwata nwoke –ihere dị afọ iri na ise na-enwweghi nghọta nke mgbasa-ozi-ọma ,ma tuziere ya aka onye ọ ga-agbasara oziọma a bụ onye nke ga-anabata

. A maram, na ọ bụrụ na anyi e gee mụọ anyị ntị,anyị ga-enwe ịke ị chọputa ndị nọ gburu-gburu anyi, na-eche ịnwe mmụta banyere ozi-ọma a eweghachitere. A maram m na ọ bụrụ na anyi enye ike kpotara onye-nwe-anyi ọ buladị otu onye. “ka ọdị ukwuu ga bụ ońu [anyi] na ala-eze nke Nna [anyi]!” (D&C 18:15)

Bipụta