2013
Ezi na ụlọ na ndi enyi mgbe ebighi ebi.
Disemba 2013


Ozi nke Ndị- Isi Nduzi Mbụ, Ọnwa iri na abụọ 2013

Ezi na ụlọ na ndị enyi Mgbe ebighiebi

Onye-Isi-nduzi Henry B. Eyring

Ebe ọbụla unu bi, unu nwere ndị enyi, ndị n’achọsike banyere obi aṅụrị kacha, nke ị chọtaworo n’ibi ndụ na ụzọ ozi-ọma nke Jịsọs Kraịst eweha-chitereworo. Ikekwe, ha agaghi enwe ike ịkọwaputa obi ańụri ahụ na mkpụrụ okwu nile, kama ha ga-achọpụta ya ma ha hụ ya n;ime ndụ gị. Ha ga-enwe ọnụnụ ọkụ na obi ịchọpụta ebe obi aṅụrị ahụ si, kachasi mgbe ha hụrụ na ị na-agabigakwa ọtụtụ nmwale di ka ha.

I nwetawo obi aṅụri dika ị na-erube isi nye iwu nile nke Chineke. Nke ahụ bụ nkwa, mkpụrụ nke ịbị ndu ozi ọma. (see Mosiah 2:41) I naghị erube ịsị nye iwu nile nke Onye Nwe ka ndi ozo hụ gi, kama ndị ahụ hụtara obi aṅụri gị ka akwadoro site n’aka Onye-nwe ị nụ banyere ozi oma ahụ di-mma nke eweghachịteworo.

Ngozi nile ahụ enyeworo gị, ewetawo ọtutu ọhere ọrụ na nnukwu ọnodụ dị iche nye gị. Dika ndị kwere nkwa iso ụzo nke Jịsọs Kraịst, Ọ bu oke na orụ dịịrị gi, ime ka ndi ọzọ nwee ohere ị chọpụta ọbi anụri di ukwuu, nke ka nke, nye ndị enyi gị nile na ndị otu ezi na ụlọ gi.

Ọnye nwe hụrụ ohere ọma gị a, ma were iwu kọwaa oke ọrụ: “Ma O kwesịrị ka onye ọbụla adọworo aka na ntị dọkwaa onye agbata-obi ya” (D&C 88:81).

Onye nwe mere ka irube isi nye iwu ahụ dị mfe, site na mgbanwe nke na eme n’ime obi gi ka ị na anakwere ma na-ebi ndụ n’usoro ozi-ọma nke Jịsọs Kraịst. N’ihi nke a, ịhunaaya gị nye ndị ọzọ ga-abawanye, ya na mmasi gị ka ha nwetakwa ụdi obi aṅụrị a nke ị nwetaworo.

Otu ọmụma atụ nke mgbanwe ahụ bụ otu ịsị anabata ohere inye aka n’ọru mgbaba ozioma nke Onye-nwe anyị. Ndi otu mgbasa oziọma mụtara n’oge, otu ha ga-esi, nweta nnabata site na onye nwere ezi nchegharị I nweta onye a ga-enye nkuzi banyere ozi-ọma a. Onye a chigharịrịnụ nwere oke mmasi ka ndị enyi na ndị otu ezi-na-ụlo ya keta oke n’obi aṅuri ha.

Mgbe onye isi nhazi mgbasa ozi-ọma gi ma ọbụ ndi mgbasa ozi rịọrọ banyere inye ha aha onye ha ga-enye nkuzi, Ọ bụ ihe oke ugwu nye unu. Ha ma na ndị enyi unu ahụwo ọṅụ unu, ya mere, ndi enyị ahụ ka akwadoworo I nụ na ị horo ị nakwere ozi-ọma a. Ma ha nwere obisike na unu ga-abụ ndị enyi ha ga- acho inwe dika ha batara n’ime nzụkọ a.

Unu ekwesighị ịtụ egwu na ndị enyi unu ga-agbanarị unu, ma unu kpọọ ndị mgbasa ozi-ọma ka ha zute ha. Enwere m ndị enyi jụrụ ndị mgbasa ozi-ọma ma ha kelere m ka ọtụtụ afọ gasịrị maka inye ha ihe nke ha matara dị oke onu ahịa nye m. Unu ga-enwe ndi enyi ebighi-ebi, site n’inye ha ozi-ọma a, nke ha hụrụ wetawiro unu ọnụ. Unu ekwela ka ohere ghara unu, ị ji kpọọ enyi ma nke ka nke otu onye ezi-na-ụlọ unu ime nhọrọ ịsorọ ụkpurụ nke obi aṅurị.

Onweghi Ohere ka ọkpụkpọ oku ahụ karịa n’ime Tempụl nile nke nzukọ a. N’ebe ahu ka onye-nwe-anyi, ga-enye ndi, nna-ochie anyị ihe emume nile nke nzọpụta ndị ha na-anataghi mgbe ha dị ndụ. Ha nwere ihunanya na olile anya na unu ga-emere ha. Onye-nwe kwere nkwa na ha ga-enwe ohere ịbata na ala-eze Ya (see D&C 137:7–8), ma o mewo ka ịhunanya ha dịrị n’obi unu.

Ọtụtụ n’ime unu ahụwo oṅụ dị n’ime Ihe emume nke Tempụl nye ndị ọzọ, dịka unu na-enye ndị mgbasa oziọma aha ndị ha ga-enye oziọma. Unu enwewokwa ọṅụ di ukwuu, n’ime emume ndịa nye ndị nna-ochie unu nwụru-anwu. Ọ bụ ihe ekpughere nye onye amụma Joseph Smith na ọṅụ ebighi ebi anyị dị ịre ma ọ bụrụ anyị enwee ike zi ndị anyi nwụru-anwu ụzọ nke ngozi ahụ site n’imechita emume na Tempụl n’aha ha (see D&C 128:18).

Oge emume ncheta ekeresimesi na-atughari obi anyi ebe Onye nzọpụta ya na ọṅụ nke ozi-ọma Ya wetara anyi. Anyị n’egosịpụta obi ekele anyị nye Ya, dika anyị na-enye ndị ọzọ ọṅụ ahụ. Obi ekele a ga-abụ ọṅụ , dika anyị na-enye ndị mgbasa ozi-oma aha ndị ha ga-ezi ozi-ọma, ya na mgbe anyị wegara aha ndị nne na nna-ochie na Tempụl. Ngosi obi ekele anyị ahụ ga-ehiwe ndị enyi na ezi-na-ụlọ ga-anadịgide ebighiebi.

Nkuzi si na ozi a.

Onye-isi-nduzi Eyring kọwara na anyị nwere ike I gosi obi ekele anyị nye Onye nzọpụta, site n’ịgbasa ozi-ọma nye ndị ọzọ. Unu nwere ike ị jupụta ndị unu na-akụziri otu onyinye nke ozi-ọma a, sirila gọzie ndụ ha. Tụlee ị kpọ ha, ka ha kpee ekpere chọpụta ndị ha ga-achọ ikenye onyinye nke ozi-ọma a, na ụzọ ha ga-esi eme ya.