2013
Ịrụ Ọrụ Chi ahụ nke Jisọs Kraịst : Otu Ọkpara Ọmụrụ nanị Ya
Disemba 2013


Ozi nkuzi ndị nleta umunwanyi. Onwa Ịrị na abụọ 2013

Ọrụ Sitere-na-Chi Jisọs Kraịst: Otu Ọkpara Amụrụ nanị Ya

Mụọ akwụkwọ ọzizi a, site n’ekpere ma chọpụta ihe ị ga-akuzi. Kedu ka ighọta ndụ na ozi nke Onye nzọpụta ga-esi wulie okwukwe gi na ya, ma gọzie ndị ị na-elekọta anya site n’ozi nkuzi-nleta ụmụnwanyị? Maka inweta nkọwa ndi-ọzọ, gaa na reliefsociety.lds.org relie

Foto, oyiyi
Sil Otu Enyem-aka

Okwukwe, Ezi-na-ụlọ, Enyem-aka

Onye nzọpụta anyi Jisọs Kraịst ka a kpọrọ Otu Ọkpara Amuru nanị ya n’ihi nani Ya bu onye a mụrụ n’ụwa nke nwere nne pụrụ ịnwu-anwụ na Nna na-apụghị ịnwu-anwụ. Ikịke osị-na-chi sitere n’aka Chineke bu Nna Ya. N’aka Nne Ya bụ Mary, ka o butere ịnwụ ọnwụ ma bụrụ onye agụrụ ga-agụ, akpịrị ịkpọ nkụ, ihe-mgbu na ọnwụ.1

N’ịhị na Jịsọs Kraịst bụ Otu Ọkpara Amụrụ nani Ya nke Nna Ya, Onwere ike inwụ anwu ma bilitekwa n’ọnwụ. Akwụkwọ nsọ kụzịrị na “site ịchụ-aja mmehie nke Kraịst” anyị “na-erita mbilite n’ọnwu” ( Jacob 4:11). Anyi mụtakwara na mmadụ nile “nwere-ike ikulite na ọnọdụ anwụ-anwụ ruo na ndụ ebighi-ebi” ma ọ bụrụ “na-anyị ekwere” (D&C 29:43).

Dika anyị na aghọta nke ọma,ihe ọpụtara na, Jịsọs ị bụ Otu Ọkpara Amụrụ nani ya nke Nna Ya,okwukwe anyị na Jịsọs Kraịst ga-amuba. Okenye D Todd Christofferson nke ngalaba ndị apostụl ịrị na abuọ kwụrụ.”okwụkwe n’ime Jịsọs Kraịst bụ ya bụ nkwenye sịrị ịke na obịsịke nke (1) N’ọnọdụ Ya dika Otụ Ọkpara Amụrụ nanị ya nke Chịneke,(2) Aja mmehịe nke ebịghịebi ya, nke (3) Ezi mbilite n’ọnwụ Ya.2 Ndi amuma ugbua agbawo ama sị “[Jịsọs Kraịst] bu nanị Otu Ọkpara Amụrụ n’uwa, onye Mgbapụta nke ụwa.”3

Site na Akwukwọ-nsọ nile

Jọn 3:16; Ozịzị na Ọgbụgba Ndu nile 20:21–24; Moses 5:6–9

Site na Akụkọ ochie anyi

N’ime Testamenti Ọhụrụ anyi gutara banyere ụmụ nwanyi ndị akpọrọ na ndị a kpọghị aha ha,ndị gosịrị okwụkwe na Jịsọs Kraist, ha mụtara ma bịe ndụ na ṅkụzị ya nịle, ma gbaa ama banyere ozịzị ya, ịhe ndị ịrịba ama na ebube ya. Ụmụnwanyị ndi a mechara bụrụ ezi ndị na-eso ụzọ na ndi aka-ebe dị mkpa n’ọru nke nzọpụta.

N’ịma atụ Martha gbara ama di egwụ banyere ọkụkpọ ọkụ sịnachi nke Onye nzọpụta, mgbe ọ sịrị Ya “ E kwerewo m na ị bụ kraịst,Ọkpara Chineke, bu onye ahụ ga-abia n’uwa” (John 11:27).

Ọtụtụ n’ime ndị mbu gbara ama oku nke Onye nzọputa bụ nne Ya mary, na nwa nne ya Elisabeth. Ngwa-ngwa onye muọ-ozi gabriel bakwutere Mary ọ gakwara leta Elisabeth Ngwa-ngwa Elisabeth nụrụ ekele Mary,ọ “jupụtara na mụọ nsọ” (Luke1:41) ma gbaa ama na Mary ga-abu nne nke Ọkpara Chineke.

Lee-anya

  1. Lee ozizi niile nke ozịọma(2009),52– 53

  2. D. Todd Christofferson, “Iwulite okwụkwe n’ime kraịst” Liahona, Onwa ịtolị.2012.13

  3. “Kraịst nke dị Ndụ: Ama nke ndị Apọstụl liahona Apr.2000,2–3.

Gịnị ka m nwere ike ime?

  1. Gini mere o ji dị mkpa nye m, ị ghọta ọrụ ndị a nile nke Jịsọs Kraịst?

  2. Kedu ka ọgbụgba ndụ nile si ewulite okwụkwe anyi n’ebe onye nzọputa nọ?

Bipụta