2014
Ije Ozi-Chi nke Jisọs Kraist: Onye-Nzọpụta na Onye-Mgbapụta
Eprel 2014


Ozi Nkuzi nke ndị-nleta ụmụnwanyị, Ọnwa anọ 2014

Ije Ozi-Chi nke Jisọs Kraịst: Onye-Nzọpụta na Onye-Mgbapụta

Jiri obi-ekpere gụọ akwụkwọ nkea, ma chọọ ka ịmata ịhe ị ga-akuzi ị ga-akuzi. Kedụ ka nghọta ndụ na ọrụ nke Onye Nzọpụta ga-esi wulite okwukwe gị ebe Ọ nọ, ma gọzie-kwa ndị ị na-elekọta site na ozi nkuzi-nleta ụmụnwanyị? Maka ịnweta nkọwa ndị-ọzọ, gaa na reliefsociety.lds.org.

Okwukwe, Ezi-na-ụlọ, Enyem-aka

Otu n’ime ọtụtụ echichi nke eji akọwa Jisọs Kraist bụ Onye mgbapụta,” ka Okenye D. Todd Christofferson nke ndi ozi iri na abụọ kwuru. Mgbapụta pụtara imejupụta nkwa ma ọ bụ ịkwụ ụgwọ eji. Mgbapụta nwere ike ịpụta ịzọpụta ma ọ bụ ịgbahapụ dika ịkwụ ụgwọ nwere-onwe. … Ngosipụta ndịa nile na akọwa mpaghara dị ịche-iche nke ọrụ mgbapụta ahụ nke Jisọs Kraist mere site na Aja-mmehie Ya, nke sonyere, dịka akwụkwọ nke ọkọwa okwu kwuru, ‘ịzọpụta site na njọọ na ntamahụhụ ya nile, dịka site na ịchụ-aja maka onye-ome-njọọ.1

Linda K. Burton,Onye isi nduzi nke ndi otuu enyem aka, siri, Nna anyi nke elu-igwe … zitere Ọkpara Ya ọmụrụ nani ya, ezigbo Nwa ka ọbịa taa ahụhụ maka njọọ anyi nile, ịsị-ọwụwa anyi nile, ya ihe nile na adighi mma na ndụ anyi nile.

“ … Otu nwanyi onye nke gabị-garala ọtụtụ ihe nwale na nwute ọtụtụ afọ, ji akwa-anya-mmiri kwuo, Ámatawom na adizim ka akwụkwọ-ego 20-dollar — fukọrọ-afukọ,dọkara-adọka, ruru-iyi, metọọ, ma nwe apa. Mana … Akam bara-uru nke 20 dollars bara.’ Nwanyị a maara na ọ … bakwara uru nke bụ nye [Chineke] mere ịzịpụ nwa Ya ka ọbịa kwụọ-ụgwọ maka ya, na-otu-na-otu. Nwanyị ọbụla na Nzụkọ-nsọ a kwesịrị ịma ịhe nwanyị a maara.”2

Site na Akwukwọ-nsọ nile

2 Nifai 2:6; Hilaman 5:11–12; Moses 1:39

Site na Akụkọ ochie anyị

Testament nke Ọhụrụ kọrọ akụkọ maka ụmụnwanyị ndị nke gosipụtara ọkwụkwe ha na Jisọs Kraịst, mụọ ma biekwa nkụzi Ya nile, ma gbaa-kwa ama gbasara ịje-ozi, ọrụ-ebube nile, na ebube Ya.

Jisọs gwara nwanyị ahụ n’akụkụ olulu-mmiri.

“Ọnye ọbụla ga nke ga ańụ mmiri nke mụ onwem ga-enye ya, akpịrị-mmiri agaghị akpọ ya; kama mmiri ahụ nke mụ onwem ga enye ya ga-aghọ n’ime ya isi-iyi na asọpụta ruo ndụ ebigh-ebi.

“Nwanyi ahụ siri ya, Onye-nwem, nyem mmiri a ka akpiri-mmiri wee ghara ịkpọm nku . …

“Amataram na Mesaịa na-abịa, … : mgbe ọbụla onye ahụ ga-abịa ọ ga-akọrọ anyị ịhe nile.

“Jisọs sịrị ya, Mụ onwem nke na-agwa gị okwu bụ ya.”

Nwanyị ahụ “mgbe ahụ hapụrụ ite-mmiri” ma gaa n’ime obodo gbaa ama gbasara Ya (Lee Jọn 4:6–30.)

Lee-anya

  1. D. Todd Christofferson, “Mgbapụta,” Ensign or Liahona, Onwa ise 2013,

  2. Linda K. Burton, “Is Faith in the Atonement of Jesus Christ Written in Our Hearts?” Ensign or Liahona, Nov. 2012, 114.

Gịnị ka m nwere ike ịme?

  1. Kedụ ka anyị ga esi gosipụta afọ ojuju ebe Onye-nzọpụta,Onye Mgbapụta, Jisọs Kraịst?

  2. Kedụ ka anyị ga esi rite ngọzị nile nke aja mgbapụta nke Onye nzọpụta anyị na ndụ anyị?

Bipụta