2014
Ihe Njigide Ekpokotasiri-Ike
Eprel 2014


Ozi nke Otu Ndị-isi Nduzi Mbụ, Ọnwa anọ 2014

Ịhe Njigide Ekpokotasịrị-Ike

Foto, oyiyi
Onye Isi-Nduzi Dieter F. Uchtdorf

Oge na na etechabeghi aka, enwere m ohere iji ụgbọ-mmiri gaa na ogologo mmiri akụkụ obodo nke Alaska USA. Dịka onye ọkwọ-ugbọ-mmiri ahụ hazichara ụgbọ-mmiri ahụ ịnọbọ-chị na ala nọ n’etiti mmiri, ọ kpachapụrụ anya nyochaa ala nkea na ọnọdụ nile, dịka otu ịfufe-mmiri sị adị, ogologo ala-ime mmiri ahụ, na oghere dị n’etiti ha na ịhe ndị nile na enweta ọdachi. Mgbe afọ juru ya, ọ tụdara ịhe-njigide ụgbọ-mmiri ịme ka ụgbọ-mmiri nọgidesie-ike otu ebe, iji mee ka ndị na aga-njem na ụgbọ-mmiri nwe oghere legharịa anya na ọtụtụ ịhe mara-mma Chineke kegasịrị.

Dịka m na elegharị anya na akụkụ ogologo-mmiri, Amalitere m ịghọta na ụgbọ-mmiri ahụ ji nwayọ na agbada dịka ịhe ịkuku-mmiri na ebụ. N’agbanyeghi, ụgbọ-mmiri ahụ nọgidere na ogige ogologo eriri na ikike ịhe-njigide ụgbọ-mmiri.

Onye ọkwọ ụgbọ-mmiri ahụ edoteghi ịhe njigide ụgbọ-mmiri ahụ n’ime ụgbọ-mmiri, wee chere nanị ịdọtu ya mgbe ọbụla ebule-mmiri biara. Mba, o jigidere ụgbọ-mmiri ahụ dịka ịhe mgbochi ma chekwa ụgbọ-mmiri ahụ ịgabanye na elu mmiri dị egwu ma ọbụ jiri nwayọ kpafuwe mgbe ndị-njem na ndị enyemaka ya cheere na ha nọ na nchekwa.

Dịka m na atụle ọnọdụ a, ọ gbatara n’ụche na ọbụrụ na nke a abụghị akụkọ aji akọ akụkọ, ọpụtara na anyatụbeghim ụgbọ-elu ọbụla.

Ịhe kpatara anyị ji Chọsike Ịhe-Njigide-aka

Ebum n’uche ịnwe igwe-njigide ụgbọ-mmiri bụ iji chekwa ma dokwa ụgbọ-mmiri ebe achọrọ ka ọnọrọ ma ọbụ iji nye aka jikwata ụgbọ-mmiri oge ọnọdụ ọjọọ. Ma otu-osinadị, iji mejupụta ebum n’uche nile nke a, nanị na enwere ịhe njigide ụgbọ-mmiri abụghị ebe obiri. Ịhe njigide-ụgbọ-mmiri kwesịrị isi-ike, dị nma ịtụkwasị-obi ma ọbụ jiri ya rụọ ọrụ otu okwesịrị n’oge nakwa n’ebe dị nma.

Ọdị mkpa na onye ọbụla ma ezi-na-ụlọ nile nwekwara ịhe njigide-ụgbọ.

Ọnọdụ ọjọọ nwere ike ịbịa dịka nnukwuu mmiri-ozuzo iji bufuo anyị n’ezi ụzọ, ma ọbụ iyi anyị egwu ibibi anyị. Mgbe ụfọdụ anyị na anọ na egwu mgbe ọdịka ịhe nile ọdịchawo mma—ifufe dị nwa-jii, ma mmiri nile dị larịị. Na ezie, anyị nwere ike ịnọ na ọnọdụ oke-egwu mgbe anyị na agbada ma ọdịda anyị ji nwayọ nke na anyị enweghi ike ịmata ịhe n’emenụ.

Ozi-ọma a Bụ Ịhe-njigide Anyị

Ịhe-njigide nile kwesịrị ịdị-arọ, sie-ike,ma dịkwa na ọnọdụ ọma iji wee rụọ-ọrụ mgbe achọrọ ya. Na mgbakwunye, ha kwesịrị ịnọgide na ala siri-ike nke nwere-ike ịnagide ịhe ndọhachi azụ.

Na ezie, ozi-ọma nke Jisọs Kraịst bụ ụdị ịhe njigide a. Onye kwadoro ya bụ Chi kere ụwa nile maka ebum n’uche na ịchepụta ụzọ iji nye ụmụ Ya nchekwa na nduzi.

Gịnị bụ ozi-ọma ahụ, na ịhe nile, mọbụghị atụmatụ Chineke iji zọpụta ụmụ Ya ma kpọhachite ha azụ na ihu Ya?

Na nmata na ịhe nile ekere-eke na ụwa na ebi ndụ na enweghi ịhe njigide aka, anyị kwesịrị idobe ịhe njigide aka anyị na elu nkume ahụ bụ ozi-ọma nke ezi-okwu. Ha agaghị abụ ịhe aga eleli anya n’ihi mpako ma ọ bụ nakwere ịhe ndị a na ụzọ ọbụla.

Na ọnwa a anyị nwere ohere inụ site na olu-okwu onye ozi nke Chineke na ọgbakọ ozuruọha nke nzụkọ nsọ a. Okwu ha nile, tinyere akwụkwọ-nsọ nile na nmanye nke mụọ nsọ, ọ na-enye anyị uru ebighi-ebi na ukpuru nile nke ewuru n’elu ntọ-ala siri ike ma kwụrụkwa chim, bụ nke anyị nwere ike idobe ịhe njigide aka anyị nile ka anyị wee nọgidesie ike na nchekwa na etiti ịgba-mbọ na nwale nile nke ndụ.

Onye amuma ochie Helaman kuziri,” Ọ bụ n’elu nkume nke Onye mgbapụta anyi , onye bụ Karist, Okpara nke Chineke, ka unu ga-ewuriri ntọ-ala unu; ka ọ ga-abụ mgbe ekwensu ga-ezipụ ikuku ike ya, e, akụ ya nile n’ime ifufe-gburu-gburu, e, mgbe uzu mmiri elu-igwe ya na ebili mmiri ike ya ga-apiakwasi unu, ọgaghi enwe ike n’ahụ unu ịdọkpụta unu n’ọlụlụ nke nhuju-anya na ahụhụ agwụgh-agwụ, n’ihi nkume ahụ n’elu nke e wuru unu, nke bụ ezigbo ntọ-ala, ntọ-ala n’elu nke ọbụrụ na ndị mmadu wuo ụlọ, ha agaghị ada” (Hilaman 5:12).

Uru nke Ịhe Njigide Ekpokotasịrị-Ike

Ndụ nkea nwere ụzọ osi anwa ịhe nijigide nile anyị ọnwụnwa na otu osi anwale anyị ka anyị kpafuo. Ma otu-osinadị, ọbụrụ na ịhe njigide anyị dabere na Onye-mgbapụta anyị, ha ga anọgide—na agbanyeghi oke ikụkụ , ike nke ebili-mmiri, ma ọbụ ogoo nke ịfufe mmiri nile.

E, arụghi ụgbọ-mmiri ka ọnọrọ otu ebe na amaghi jiji n’elu mmiri, kama ọbụ ịdọlite ịhe njigide ya ma malite isee n’elu mmiri nke ndụ. Mana nke a bụ ilu na akuzi ịhe maka oge ọzọ.

Maka ugbu a, kam nwere nkasị-obi na imata na ịhe njigide nke ozi-ọma na nkume nke onye Mgbapụta anyị ga ejigide ma chebe anyị.

Ụdị ịhe njigide a ga ejigide anyị k’anyị hara ikpafu baa n’ịhe egwu na ọdachi. Ọ ga enye anyị ohere ọma ịnwe ọñụ ebe ndụ nke a dị-elu. mara-mma na enweghi atụ.

Ndụ mara mma ma kwesịkwa obibi. Ikuku, mmiri-ozizo, ya na ịhe ndị na emegasi, nwere ike ịnwa anyị ọnwụnwa ka anyị kpafuo n’ime ịhe egwu zuru-ezu na nke pụtara íhé , mama ozi nke ozi-ọma na ikike nke elu-igwe ga ejigide anyị na ezi ụzọ nke g’echekwa anyị ebe ezumike nke Nna anyị nke Elu-Igwe.

s ịgenti na okwu nile nke ọgbakọ ozuruọha nke Onwa anọ kama tinye ozi ha nile dika ihe njigide aka ekpokotasiri ike na obobi ndụ anyi ụbọchi nile

Ka Chineke gozie ma duo anyị na mbọ a pụtara ihé ma dị oke mkpa.

Nkuzi si na ozi a.

Tulee ikparita uka na mkpa ihe njigide aka di na nkọwa nke enyere gbasara ezi-na-ụlọ Lehi iga njem nelu mmiri na obodo ahụ ekwere na nkwa (lee 1 Nifai 18). Inwere ike gosipụta 1 Nifai 18:11–15 , ohe mgbe ekegidere nifai, igwe mgba-ama kwusiri ịrụ ọrụ, ụgbọ-mmiri malitere ifeghari site na oke ifufe mmiri. Gịnị bụ ịhe nsonazụ anyị na ahụta mgbe anyị na ejighi ozi-ọma mere ịhe nijigide? Inwere ike gosipụta kwa 1 Nifai 18:21–22 ma kpakorita uka otu anyi nwere ike iji chọta nchekwa site na igbanwe nye Onye nzọpụta.

Bipụta