2014
Ozi ahụ si na chi nke Jisọs Kraịst: Onye mkwuchite
Julaị 2014


Ozi nke Nkụzi ndị nleta ụmụ-nwanyị, onwa asaa 2014

Ozi ahụ si na chi nke Jisus Kraịst: Onye mkwuchite

Mụọ akwụkwọ ọziza, site n’ekpere ma chọpụta ihe ị ga-akuzi Kedu ka nghọta ndụ na ọrụ nke Onye Nzọpụta ga-esi wulite okwukwe gi ebe ọnọ, ma gọzie-kwa ndị ị na-elekọta site na ozi nkuzi-nleta ụmụnwanyị? Maka inweta nkọwa ndị-ọzọ, gaa na reliefsociety.lds.org.

Okwukwe, Ezi-na-ụlọ, Enyem-aka

Jịsọs kraist bụ onye na ekwuchitere anyị ebe Nna nọ. Okwu a mkpechite nwere mmalite ebe Latin nke pụtara “onye na ekpechitere ịbe ya.”1 Onye Nzọpụta na arịọ anyị ka anyị, nwere nghọta, ụzọ ịkwụ ọtọ, na obi ebere. Ma mee ka anyị nwe ihunanya na obi-ekele maka Aja-mmehie Ya.

Gee ya ntị (Jịsọs Kraist) onye nke bụ onye mkpechite ebe Nna nọ, onye nke na arịọchitere gị n’ihu ya—

Na asi: Nna, lee ahụhụ nile na onwu nke onye ahụ na emeghị ihe ọjọọ, onye nke ihe ya na amasi; lee obara nwa gị nke awusara, obara nke onye ahụ ị mere ka eji nye gị otịto;

“Ya mere, Nna, mere ụmụ-nne m ndị ebere, ndị nke kwere na aha m, ka ha were biakwutem ma nweta ndụ ebighị-ebị” O & O 45:3–5

Maka Kraist onye na ekwu-chitere anyị, Elder D. Todd Christofferson nke ndị Otu Ozi Iri na abụọ siri; “ọ bụ ihe dim oke mkpa, na enwere ike enwee ọnọdụ mgbe mụ ga ekpere ya, na Nna m bị na Elu-igwe ga anụ mkpa m, na onye mkpechite, onye na-enweghị njọọ, onye wusara ọbara ya, ga arịọtara m arịrịọ.’2

Site na Akwụkwọ-nsọ nile

Mosiah 15:8–9; Moroni 7:28; Ozizi na Ọgbụgba ndụ nile 29:5110:4

Site na Akụkọ ochie anyị

N’ime akụkọ nile nke Nzukọ-nsọ nke Onye-nwe, ndị na eso ụzọ Jịsọs kraist ndị nwanyị nara eso ụkpụrụ Ya. Esta bụ onye mkpechite maara onwe ya na adịghị atụ-egwu Nwa nwanne nna ya Mordecai zigara ya akwụkwọ-iwu eze nyere na aga ebịbị ndị juu, ma manye ya “ka ọgaa rịọ-arịrịọ nihu eze banyere ikwu ya,” Ọ sikwa; “Onye makwa-nụ ma ịbatara na n’ala-eze a na oge dị otua Esta 4:8, 14

Na agbanyeghị ihe egwu dị na ịkpenyere ndị obodo, Esta kwenyere: “E mesia m ga agakwuru eze, nke bụ ihe iwu na-akwadoghị: ọ bụrụ na m ga-anwu, ka m nwụọ” Esta 4:16

Esta kwukwara okwu ọzọ n’ihu eze ma daa n’ala nihu ya kwaa akwa, … ka o wezuga … hara ịbịbị ndị juu nile. Ọ si-kwa, “kedu kam ga esi agbachị nkịtị nọrọ na ekiri mbịbị a ga abiakwute ndị ịkwu m?” (lee Esta 8:3, 5–6) Obi onye eze biara dị-nro, ma ọ nabatara-kwara mkpesa ya.3

Lee-anya

  1. Lee Russell M. Nelson, “Jịsọs Kraist—Nna anyị-Ukwu ma Karia” (Brigham Young University fireside, Feb. 2, 1992), 4; speeches.byu.edu.

  2. D. Todd Christofferson, “Amam na Onye Ntukwasara Obi,” Ensign,Onwa ise 1993, 83.

  3. Hụta Ụmụada Ala-eze M,: Akụkọ na Ọrụ nke Ndị Otu Enye m aka

Tukee nke a

Kedu ka emume nkwado nke Jịsọs Karist ga esi kpalite anyị ịmere ndị ọzọ ebere ma gbahara ndị ọzọ?

Bipụta