2014
Ịchọ Ịmata Nne-nne m
Julaị 2014


Ntorobia

Ịchọ Ịmata Nne-nne m

Odee ahụ bịzị na Virginia, USA

Na ihe arụmarụ nke otu onye ụmụagbọ-ghọ m, E kwenyere inyere nne-nne m aka ịchọpụta ndị-ịchie ya site na ịchọ na ọtụtụ akwụkwọ microfilm dị na ụlọ ebe akụkọ ezi-n’ụlọ na Mesa, Arizona, USA. Dika anyị nọ ọdụ na achọ ndị ezi-na-ụlọ anyị, E bidoro m ịtụ-uche; “Amaara m nke ọma nne-nne m onye nke nọ-ọdụ na akụkụ?”

Anyị chọpụtara ọtụtụ ndị ezi-na-ụlọ, ma kwado-kwa ihe ozi ha, ma gaa Tempụl Mesa Arizona ịji meere ha Baptizim na ime ha ndị otu nzukọ. Otechaghị aka, nne-nne m nyere otu akwụkwọ edekọtara nke akụkọ agbụgụ ezi-n’ụlọ ya.

Maka na ọriara ọria ikpere, ọ na abụ ihe ụfụ nye nne-nne m iji igwe na-ebi akwụkwọ depụta ihe n’akwụkwọ. Ọ na enye m ọńụ inyere ya aka na computam. Mụ na ya, anyị edee akụkọ gbasara ndị ya maka ihe nrite nke ime-mụọ nke ezi-na-ụlọ anyị. Ọ na amasi m ịnwe oke na ndụ ya na ịmata ọtụtụ ihe gbasara Akụkọ-ochie nke nzukọ a dika anyị na arụkọta na arụmarụ nile a.

Bipụta