2014
Nkwa ahụ ekwere nke Ịtụgharị Obi nile
Julaị 2014


Ozi nke Otu Ndị-Ịsi Ndụzi Mbụ, onwa asaa 2014

Nkwa ahụ ekwere nke Ịtụgharị Obi nile

Onye Ịsi nduzi Henry B. Eyring

Nne m, Mildred Bennion Eying, toro na obodo eji ịkọ-ugbo mara nke Granger, Utah, USA. Otuu nime ndị nwanne ya nwoke, Roy, sorole ụzọ mkpaya-akụ ezi-na-ụlọ nke bụ ịzụ atụrụ. Dika nwa-okorobia ọnọrọ ọtụtụ ịzu na ụzọ-ije Oge ruru mgbe ọna enweghị mmasi na nzukọ-nsọ. Emechaa ọ gaa biri na Idahọ, USA, lụọ nwanyị ma mụta ụmụ atọ. Ọnwụrụ mgbe ọgbara afọ 34, mgbe nwanyị ya dị afọ 28 ma ụmụ ha dịcha ntakịrị.

Na agbanyeghị na ọbere ezi-na-ụlọ Roy nọ na Idahọ, nne m gapụrụ ihe dika 2,500 maịl ebe New Jersey, USA, ma ọna ederem leta ịgosi ihụnanya na agba-m ume. Ndị ezi-na-ụlọ nwanne nna-m na akpọ nne-m “Nwanne nna Mid.”

Ọtụtụ afọ gachara, otu ụbọchị anatara-m oku-ekwe-ntị sitere na otu ndị nwa nwanne nna-m Agwaram na nwanyị isikpe Roy anwụọ-la. Nwa-nwanne nna-m siri, “Nwanne nna-m Mid ga achọ ka ịmata,” Nwanne nna anwụọ-lari, mana ndị ezi-na-ụlọ ya na echeta ihunanya ya ma garute gwam.

Ọ tụrụ m na anya otuu nne-m siri rụọ ọrụ atụrụ anya na aka ya na ezi-na-ụlọ dika ndị amụma ndị Nafaị siri mee na ezi-na-ụlọ ha nile site na ịnọ-nyere ndị-ya ọchọrọ ịkpọbata na ozi-ọma nke Jịsọs Karist. Nafaị dere akụkọ-ndekọta nke ebum n’uche ya bụ iji nyere ndị ụmụ-nne nwanne ya nwoke aka ịlaghachite na okwụkwe nke onye-isi-ezi-na-ụlọ ha Lehị. Ụmụ ndị nwoke nke Mosaị gosipụta-kwara ụdị ihunanya nke-a dika ha akuziri ndị ụmụ si na agbụrụ Lehị ozi-ọma.

Onye-nwe ewetawo ụzọ nke dị ebighi-ebi anyị ga eji egosipụta ihunanya na ezi-na-ụlọ anyị nile. Ndị ntorobia na nzụkọ-nsọ a taa na ahụta na echiche obi ha na aga ebe ndị ezi-na-ụlọ ha nile. Ha na achọsi-ike aha ndị otu ezi-na-ụlọ ha ndị na enweghi ohere ịnabata emume-nsọ nile nke ịzọpụta na ndụ. Ha wegara aha ndị-a nile na tempụl. Mgbe ha bara n’ime mmiri nke baptizim, ha nwere ohere ịchọpụta ihunanya nke Onye-nwe na nke ndị otu ezi-na-ụlọ ndị nke ha na emechitere emume-nsọ nile a.

A-nam echeta ọnọdụ ọma nwa nwanne nna-m onye nke kpọrọ ma sị, “Nne anyị anwụọla, na Nwanne nna-m Mid ga achọ ka ịmata.”

Ụfọdụ n’ime anyị ndị na emechitere ndị otu ezi-na-ụlọ ha emume-nsọ nile na egosipụta ihunanya ha dika ụmụ ndị nwoke nke Mosaih na onye amụma Nafaị. Dika ha, unu na enwe ọńụ nye ndị nile nabatara onyinye unu ndịa. Anyị ga enwe afọ ojuju dika Ammon, onye nke kwuru otua banyere ọrụ mgbasa ozi-ọma ya nye ndị otu ezi-na-ụlọ ya.

Ya bụ, ka anyị tonụ, ee, anyị ga eto Onye-nwee, ee, nyị ga ańụrị, maka na ańụrị anyi bara-ụba; ee, anyị ga eto Nna anyị ruo mgbe ebịghị-ebi. Ma-lee, onye ga eto Onye-nwe karichaa? Ee, onye ga ekwu karia ike ya, na ebere ya, na ntachị-obi ya ebe ụmụ nke mmadụ nọ. Lee, agwa m unu, agaghị m ekwule otu osi metutam” (Alma 26:16).

A nam agba ama na mmetuta ihunanya ịna enwe ebe ndị otu ezi-na-ụlọ— ebe ọbụla ha nọ— bụ mejupụta nkwa ekwere na Elaịja ga abia. Ọ biara. Ndị ụmụ-ntakiri na echeta ndị nna ha, ma ndị nna na echeta ndị ụmụ Malachi 4:5–6; Josef Smit—Akụkọ ochie 1:38–39). Mgbe ọ na akpali unu ịchọpụga aha ndị-ịchie gị ma ziga ha na tempụl, unu na emejụpụta amụma ahụ eburu.

Ọ bụ ihe ngozi nye m ịnọ na oge emejụpụtara nkwa ahụ ekwere nke ntụhari obi. Mildred Bennion Eyring nwetara mkpalite a na obi ya. Ọ hụrụ ndị ezi-na-ụlọ nwanne ya nwoke na anya, ma gakwuru ha. Ha hụtara obi ha chetara Nwanne nna ha Mid maka na ha matara na ọhụrụ ha na anya.

Nkuzi si na ozi a.

Ịnwere ike chọọ ịgụ amụma ndị a eburu gbasara mụọ nke Elaija nye ndị ịna eleta (lee Malachi 4:5–6; Josef Smit—History 1:38–39). Kparita-uka ụzọ inwere ike dee ihe akụkọ ezi-na-ụlọ, tinyere ihe omume dika ịgosi-egosi,ịse-onyonyo na ịde ihe web-site. Ọ bụrụ na ịmachaghị ndị ịna eleta FamilySearch.org tulee ịwere ohere ntakiri ịgosi ha ihe ndị a.