Ozi nke Otu Ndị-Isi Nduzi Mbụ, Onwa abụọ 2015
Ịgba-ama na Mgbanwe
Enwere ihe dị iche na inweta ọgba-ama nke eziokwu na inwe ezi mgbanwe Na iji ma-atụ, nnukwu onye ozi pịta gbara ama nye Onye nzọpụta na ọ maara na Jịsọs bụ Ọkpara Chineke
“[Jịsọs] siri ha, Mana onye ka unu onwe unu si na M bụ?
“Ma Sịmọn Pịta zara si, Gị onwe-gị bụ Karist ahụ, Ọkpara Chineke dị ndụ
“Ma Jịsọs zara ma sị ha, Ngozi diri gị Sịmọn Bar-jona: ahụ na ọbara emeghi ka ịmara nke a, kama Nna m nke bị n’elu igwe” (Matiu 16:15–17).
Mana mgbe emechara, na okwu ọgwakwuru pịta, Onye nwe nyere anyị na ya ihe ndu ime ka anyị nye mgbanwe n’ezie ma mepụtakwa ya na ndụ anyi niile. Jịsọs kwuru ya otu a: “Mgbe gị onwe gị gbanweworo, mee-kwa ka ụmụ-nna gị guzosie ike” (Luk 22:32).
Jịsọs kuziri Pịta na enwere mgbanwe nke kariri nani inwe ọgbụgba-ama iji chee, nwe-metụta na ime ka onye mgbanwere n’ezie n’ịso Jịsọs Karịst. Nke a bụ nnukwu mgbanwe ahụ anyị na achọsike. Ozigbo anyị nwetara nke a, anyị chọsiri nke a ike iji gaa n’ihu ruo mgbe anyị ga anwu (Alma 5:13–14)
Anyị maara site na ahụmihe anyị na site na ịle ndị ọzọ anya, na inwe ụfọdụ nnukwu oge ihe mmetụta nke ime-mụọ agaghi abụ nani ihe anyị chọrọ. Pịta gọrọ-agọ na ya amaghi Onye-nzọpụta ọbụladị mgbe onwetara ọgbụgba-ama site na mụọ na Jịsọs bụ Karist ahụ. Ndị aka-ebe atọ ahụ nk Akwụkwọ nke Mọmọn nwtara ọgbụgba-ama nye ha na Akwụkwọ nke mọmọn bụ okwu nke Chineke, mana ha mechakwara tagherie-ọnụ n’okwu ha n’ikwado Josef Smit dika Onye-amụma nke Nzukọ-nsọ Onye-nwee.
Ọdị mkpa na anyị ga enwe mgbanwe na obi anyị niile dika akọwara na akwụkwọ nke Alma: “Ma ha niile kwupụtara ndị ahụ otu ihe ahụ—na obi ha niile ka agbanweworo; na ha enwekwaghi ọchịchọ im ihe-ọjọọ. (Alma 19:33 lee kwa Mosiah 5:2)
Onye nwe kuzịịrị anyị na mgbe anyị gbanwere n’ezie na ozi-ọma Ya, obi anyị ga ahapụ iche nani nke onwe ma neche otu aga esi wulite ndị ọzọ dika anyị na agbali ịgọnweta ndụ ebighi-ebi. Na ịnweta mgbanwe ahụ,anyị ga eji okwukwe kpee-ekpere ma rụọ-ọrụ iji bụrụ ndị amụrụ-ohụụ site na aja mgbaghara mmehie nke Jịsọs Karịst.
Anyị nwere ike imalite n’ikpe-ekpere maka okwukwe ncheghari site na ihe anya-ukwu na inweta onyinye ichere maka ndị ọzọ karia onwe anyị. Anyị nwere ike ikpe-ekpere inweta ikike iji wezuga mpako na ntaji-anya.
PEkpere ga abụ ihe ga eme nke-a ya iji nata onyinye nke ihụ okwu Chineke na Karịst n’anya (lee Moroni 7:47–48) Ha abụọ na agakọta ọnụ. Dika anyị na agụ, atụghari-uche, n’ekpe-ekpere gbasara okwu Chineke, anyị ga ahụkwa ya n’anya. Onye nwee ga etinye ya n’obi anyị niile. Dika anyị na enweta ihụnanya ahụ, anyị ga amalite na ahụ Onye nwee n’anya karịa. Site na nke-a, ga abịa ihụnanya nye ndị ọzọ, nke anyị ga eji kwalite ndị Chineke mere ka anyị zute na ndụ anyị.
Na iji ma-atụ, anyị nwere ike ikp-ekpere iji matakwa ndị ahụ Onye-nwee chọrọ ka ndị mgbasa ozi-ọma kuziere. Ndị otu mgbasa ozi-ọma n’oge nwere ike iji okwukwe kpee-ekpere ka ha mata site na ike nke mụọ-nsọ, ihe ha nwere ike ikuzi na gbaakwa ama ya. Ha nwere ike kpee-ekpere ka Onye nwee mee ka ha nwee ihụnanya ebe onye ọbụla ha zutere. Ndị mgbasa ozi-ọma agaghi eme onye ọbụla ha zutere baptizim na nyekwa ha onyinye nke Mụọ-nsọ. Mana ha nwere ike ịnata Mụọ-nsọ dika onye ndu. Site na ije-ozi ha na enye m aka nke Mụọ-nsọ, ndị mgbasa ozi-ọma ga abịa nweta mgbanwe na obi ha niile.
Mgbanwe ahụ ka aga n’eme ọhụụ oge niile dika anyị na ha site na okwukwe na agba ndị ọzọ ume site na ozi-ọma nke Jịsọs Karịst. Mgbanwe ahụ abughi ihe aga eme otu ugboro ma ọbụ ihe aga eme n’otu oge na ndụ kama ọga abụ ihe ga adigide. Ndụ anyị ga achawa dika ụbọchị anwu owuwa, mgbe anyị ga ahụta Onye nwe ma hụta na ndụ anyị adịwo ka nke Ya TOnye nwee kọwara njem ahụ otua: “Nke ahụ bụ nke Chineke bụ ihé; ma onye natara ihé ma nọjide nime Chineke ga-anata ihé karịa; ma ihé ahụ ga na-amuke karịa ma na-amuke karịa tutu ruo ụbọchị ahụ zuru oke” (O&O 50:24).
Anam ekwe gị nkwa na nke-a dịịrị anyị mfe.
© 2014 Site na Intellectual Reserve, Inc. Ikike niile e dokwara Ebipụtara na USA. Nkwado n’asụsụ Bekee: 6/13. Nkwado ntụgharị-asụsụ: 6/13. Ntụgharị asụsụ nke First Presidency Message, February 2015. Igbo. 12582 593