Ozi nke Nkuzi ndi nleta ụmụnwanyị, Onwa abụọ 2015
Agwa niile nke Jịsọs Karịs Nwere: Onweghi Mmehie
Were ekpere mụọ akwụkwọ ọziza, ma chọpụta ihe ị ga-akuzi Kedu ka nghọta ndụ na ọrụ nke Onye Nzọpụta ga-esi wulite okwukwe gi ebe ọnọ, ma gọzie-kwa ndị ị na-elekọta site na ozi nkuzi-nleta ụmụnwanyị? Maka inweta nkọwa ndi-ọzọ, gaa na reliefsociety.lds.org.
Onye Nzopụta anyị, Jịsọs Karịst, bụ nani onye nwere ike ịchụ aja mgbahara mmehie maka mmadụ niile. “Jịsọs Karịt, Nwa atụrụ n’enweghi ntụpọ, Onye nke ọmasiri ịtọgbọ ndị Ya nelu ebe ịchụ aja ma kwụọ ụgwọ maka mmehie anyị niile,” ka Onye Isi Nduzi Dieter F. Uchtdorf, Onye Ndụmọdụ nke Abụọ na Ndị Isi Nduzi Mbụ kwuru.1 UỊghọta na Jịsọs Karịst enweghi mmehie nwere ike inyere anyị aka ịwulite okwukwe anyị n’ebe ọnọ nag baa mbọ irube isi na ịwu Ya niile, chegharia na dịkwa-ọcha.
“Jịsọs bụ … onye nke ọnụ-ahụ na mụọ-nsọ, mana Ọ dabaghi na ọnwunwa ọbụla (lee Mosiah 15:5),” ka Okenye D. Todd Christofferson nke Otu ndị Ozi Iri na Abụọ kwuru. “Anyị nwere ike ichekwube na Ya … maka Ọ na aghọta. Ọ ghọtara ịgba-mbọ ahụ, Ọ ghọta-kwara otu anyị ga esi merie na ịgba-mbọ ahụ …
“ … Ikike nke Aja Mgbahara mmehie Ya nwere ike ịsachapụ nsonazu mmehie n’ime anyị niile. Anyị nwere ike ịgbanwe, amara ịkwụ ụgwọ mmehie na ewezuga ma na asacha anyị (lee 3 Nịfaị 27:16–20). Ọ dị ka aga si na anyị ekweghi, dika aga si na anyị adaba-beghi na ihe ọnwunwa.
“Dika anyị na agba mbọ ụbọchịkwa ụbọchị na ịzu kwa ịzu na iso ụzọ nke Karịst, mụọ anyị na ewere ọnọdụ, agha ahụ na achị n’ime anyị ga agbada, ihe ọnwunwa niile ahụ ga akwusi inye anyị nsogbu.”2
Akwụkwọ nsọ niile agbakwunyere
Site na Akwụkwọ-nsọ niile
Onye Nzọpụta kwuru ugwọ mmehie anyị niile site na ọnọdụ Okpara nke Chineke Ọ bụ, Enweghi Mmehie na ndụ Ya, ahụhụ Ọ tara na ọbara Ya ọkwafuru na ogige nke Gethsamane, Ọnwu nke Ọnwuru n’elu obe na Mbilite na ọnwu site na ịlị. Site na aja Mgbahara Mmehie nke Jịsọs Karịst, anyị nwere ike iịdị ọca ọzọ dika anyị na echeghari site na mmehie anyị niile.
Eze Benjamin kuziri ndị mmadụ obodo ya maka Aja mgbahara mmehie nke Jịsọs Karịst ma jụọ ha ma ha kwe nyere na okwu ya niile. “Ha niile wee tie n’otu olu, na asị … . Mụọ-nsọ ahụ … wetaworo nuukwu mgbanwe n’ime anyị niile, ma ọbụ nime obi anyị niile, nke mere na anyị enwekwaghi ọchịchọ ime ihe ọjọọ, kama ime ihe ọma esepụghi aka. …
“Ma anyị dị na njikere ịba nime ọgbụgba-ndụ anyị na Chineke anyị ime uche ya, na irube-isi nye iwu-nsọ ya niile nihe niile” (Mosiah 5:1–2, 5).
Anyị onwe anyị nwere ike inwe “oke mgbanwe” dika ndị obodo eze Benjamin, onye “nke nenweghi mmasi ọbụla ọzọ ime ihe ọjọọ, kama ime ihe na aga n’ihụ” (Mosaia 5:2).
© 2015 Site na Intellectual Reserve, Inc. Ikike niile e dokwara Ebipụtara na USA. Nkwado n’asụsụ Bekee: 6/14 Nkwado ntụgharị-asụsụ: 6/14 Ntụgharị asụsụ nke Visiting Teaching Message, February 2015. Igbo. 12582 593