2015
Mmeri site n’aka Jisọs Kraịst
Maachị 2015


Ntoro

Mmeri site n’aka Jisọs Kraịst

Enwere m nsogbu site n’iri oke nri. Oke nri mụ riri ọtụtụ mgbe butere m ntaram-ahụhụ nke ikpe-ọmụma nke mụọ, enweghị isi, na ewetaghị ihe ebu n’obi.

Mgbe dị anya eleghara m anya ezi-okwu na Aja mgbaghara mmehie nke Onye-nwe-anyị abụghị nanị ịzọpụta anyị kama na kwa agbapụta anyị ma n’emezuo anyị oke, ma na nke a rukwara na usoro ikpa agwa m n’ezughị oke nke irikarị ihe.

Ekpebiri m ịnye Onye-nzọpụta m onwem. Eji m obi ọma nabata adịghị ike m na mkpa m nwere maka amara, ma mgbe ahụ agwara m Nna nke Elu-igwe ka owere enyem aka Ya dị nsọ gozie m n’ụbọchụ n’abia nihu. Na’balị ahụ enwere m mmetụta nkwado nke Nna ịhụn’anya na Onwere nmasị dị ukwuu ịnyere nwa Ya nwoke aka na ike zuru oke ịmezu ọchịchọ Ya.

Ka mgbe abalị ahụ, nri anaghị kwa amaja m. Ama m na Jisọs Kraịst bụ ihe mere m nji nwe mmeri. Dịka Pọl, A nam amụta na “Enwere m ike ime ihe nịịle site na Kraịst nke na agbaa m ume” (Ndị Filipaị 4:13). Ma ana m agbalị ka m hara ịchefu ihe mmụta ọzọ n’aka Pọl: “Ekele nịịle dịrị Chineke, onye n’enye anyị mmeri site n’aka Onye-nwe-anyị Jisọs Kraịst” (1 Ndị kọrịnt 15:57).

Bipụta