2015
Ihe eji mara nịịle nke Jisọs Kraịst: Ogologo-ntachiobi na Ndidi
Maachị 2015


Ozi nke Nkuzi ndi nleta ụmụnwanyị,Ọnwa atọ 2015

Ihe eji mara nke Jisọs Kraịst: Ogologo-ntachiobi na Ndidi

Mụọ akwụkwọ ọziza a site n’ekpere ma chọpụta ihe ị ga-akuzi Olee otu ịghọta ndụ na ozi nke Onye-nzọpụta ahụ ga-esi mee ka okwukwe gị na Ya bawanye ma gọzie ndị Ị na-elekọta site na nkuzị nleta? Maka inweta nkọwa ndi-ọzọ, gaa na reliefsociety.lds.org

Foto, oyiyi
Njiri-mara Otu Enyem-aka

Okwukwe, Ezi-na-ụlọ, Enyem-aka

Ndidi bụ ihe a na eche mgbe ọbụla dịka omume dị jụụ kama dịka Onye-isi-nduzi Dieter F. Uchtdorf, Onye-ndụmọdụ nke Abụọ n’ime Otu Ndị-isi Nduzi Mbụ, sịrị, “Ndidi abụghị ịnọ nwayọ, ọbụghị emeghị ihe ọbụla maka ụjọ. Ndidi pụtara ichere na nnọgide. Ọ pụtara ịnọrọ na olile-anya…ma mgbe ihe ọchichọ nke obi anyị nịịle abiaghị n’oge. Ndidi abụghị nanị ịnọgide; ọbụ ịnọgide nke ọma!”

N’ime ndụ anyị tupu anyị bia n’ụwa, Nna anyị nke Elu-igwe kwadoro atụmatụ maka anyị—ụmụ mụọ Ya—ma anyị tiri mkpu ọńụ na anyị nwere ohere ịbia n’ụwa (lee Job 38:7). Dịka anyị họrọ ị n’eme uche Ya na ndụ anyị, Ọ “ga eji [anyị] mee ngwa-ọrụ n’aka Ya abụọ ruo n’ịgbapụta ọtụtụ mkpụrụ-obi” (Alma 17:11).

Onye-isi-nduzi Uchtdorf gara n’ihu, “Ndidi pụtara ịnabata ihe ịnweghị ike ịgbanwe ma were mgbam ume, amara na okwukwe so ya. Ọ pụtara ịdị ‘na njikere ịdanye n’ihe nịịle nke Onye-nwe-anyị hụworo na o kwesiri ịbịakwasị [anyị] ọbụna dịka nwantakịrị na adanyere nna ya’ [Mosaịa 3:19]. Na njedebe, ndidi pụtara ịdị ‘guzosie ike na agbanweghị agbanwe, na akwa-akwụrụ n’ịdebe iwu-nsọ nke Onye-nwe-anyị’ [1 Nịfaị 2:10] awa ọbụla nke ụbọchi ọbụla, ma mgbe osiri ike ime otu ahụ.”1

Akwụkwọ nsọ nile agbakwunyere

Abụ Ọma 40:1; Galeshia 5:22–23; 2 Pita 1:6; Alma 17:11

Site na Akwụkwọ-nsọ

Akwụkwọ-nsọ nịịle gwara anyị na n’ime ndụ anyị n’ụwa, anyị kwesịrị “nwee ndidi n’ime mkpagbu nịịle, n’ihi na [anyị] ga-enwe ha ọtụtụ.” Mgbe ahụ Chineke nyere anyị nkwa nkasi-obi nke a, “Ị ga-anagide ha, n’ihi lee, Mụ onwe m nọnyere gị, ọbụna ruo n’ọgwụgwụ ụbọchi gị nịịle” (O&O 24:8).

Akụkọ Bible nsọ n’eso bụ ihe ịma-atụ nke ndidi na okwukwe.

“Otu nwanyị nke nwere oruru ọbara afọ iri na abụọ….metụ ọnụ ọnụ nke uwe [Kraịst] aka ma ngwa ngwa oruru ọbara ya wee kwụsị [kwụsịrị].

“Ma Jisọs sịrị,…Mmadụ metụrụ m aka: n’ihi na Mụ onwe m mara na ike esiwo n’ahụ m pụọ.

“Ma mgbe nwanyị ahụ hụrụ na o zoghị ezo, o were ịma ahụ jijiji bịa, wee daa n’ihu Ya, ọ kọrọ n’ihu ndị mmadụ nịịle ihe mere o ji metụ Ya aka, na otu e si mee ka ahụ dị ya ike ngwa ngwa.

“Ma ọ sịrị ya, Nwa m nwanyị, nwere ezi nkasi obi: okwukwe gị azọpụtawo gị; laa n’udo” (Luk 8:43–48).

Dịka ya, anyị nwere ike ịchọta ngọzi nịịle na nkasi-obi, ma kwa ọgwụgwọ ọrịa dịka anyị n’eso Jisọs Kraịst—onye aja-mgbaghara-mmehie Ya nwere ike ịgwọ anyị.

Lee anya

  1. Dieter F.Uchtdorf “Ga n’ihu.n’ime Ndidi,” Liahona, Ọnwa ise 2015, 57, 59.

Tulee uche na Nke a

Site na ihe edere n’ime Luk 8, olee ka afọ nịịle nke ndidi nwanyị a na okwukwe ya n’ime Jisọs Kraịst ji nweta mmerị?

Bipụta