2015
Ị nọ na Aka Ebere Ya
Maachị 2015


Ozi nke Otu Ndị-Ịsi Ndụzi Mbụ, Onwa atọ 2015

Ị nọ naAka Ebere Ya

Dịka ọtụtụ ndị-ọzọ, akwalitela mụọ m ọtụtụ oge site n’ọrụ ọma nịịle nke nka na egwu. Otu oge dị otu a bụ mgbe m guzoro n’ihu ihe ọma Frans Schwarz onye nka Dane sere akpọrọ Igbu mgbu n’obi n’ime ubi1

Ihe a esere n’egbu mgbu n’obi gosiri Onye-nzọpụta ebe oburu ịkpere n’ala n’ime ubi nke Getsemane. Dika Ọ n’ekpe ekpere, otu mụọ-ozi guzoro n’akụkụ Ya, kpuchie Ya n’aka ebere nịịle, n’enye nkasị-obi, enyem aka na nkwado elu-igwe.

Ka m n’ele ihe a esere-ese, ka obi m na echiche m n’ejupụta na mmetụta nịịle nke dị nrọ na obi-ekele ekweghị ngosi. Enwere m ike ịmata, n’ụzọ nta, ihe okwesịrị ịdị ka ya ịnọ dịka Onye-nzọpụta bidoro ọrụ Ya dị ukwuu nke ịnwụ anwụ site n’ịburu n’onwe Ya mmehie nịịle nke ụwa. Ọ n’atụ m n’anya ịhụn’anya na ọmiko enweghị oke Nna nwere maka ụmụ Ya. Obi m n’ejupụta na ekele maka ihe Ọkpara n’enweghị mmehie mere ụmụ-mmadụ na maka m.

Aja mmehie nke Ọkpara Chineke.

Afọ ọbụla n’oge dị otu a anyị na echeta ma tụgharịa uche maka ịchụ-aja Jisọs Kraịst mere maka ụmụ-mmadụ nịịle.

Ihe Onye-nzọpụta ahụ mere site na Getsemane ruo Gọlgọta n’ịhị anyị bụ ihe karịrị nghọta m. O buru n’onwe Ya ịbu mmehie anyị nịịle ma kwụọ ụgwọ ebighị-ebi ọbụghị nanị maka njehie mbụ nke Adam kama maka kwa mmehie nịịle na njehie nịịle nke nnụ kwụrụ nnụ nke mkpụrụ-obi nịịle birila n’ụwa. Ịchụ-aja ebighị-ebi a, dị nsọ mere “ọbụna Chineke, onye kachasị elu, maa jijiji n’ihi mgbu, ma gbaa ọbara site na ntakịrị oghere ọbụla, ma taa ahụhụ ma arụ ma na mụọ.” (O&O 19:18).

Ọ tara ahụhụ maka m.

Ọ tara ahụhụ maka gị.

Mkpụrụ obi m n’ejupụta n’obi ekele mgbe m chere ihe ịchụ-aja nke a dị oke ọnụ pụtara. Ọ na enye m obi umeala ịmata na ndị nịịle nabatara onyinye a ma tụkwasị Ya obi nwere ike ịnweta mgbaghara ma sacha ha mmehie ha nịịle, n’agbanyeghị otu osi dị unyi ma -ọbụ ka ibu ha ji dị arụ.

Enwere ike ịme ka anyị dị ọcha na enweghị ntụpọ ọzọ. Enwere ike ịgbapụta anyị site na ịchụ-aja nke Onye-nzọpụta anyị hụrụ n’anya.

Onye g’akasi anyị obi?

N’agbanyeghị na onweghị onye n’ime ga-enwe ike ịmata ụdịrị ahụhụ Onye-nwe-anyị tara, anyị otu na otu g’enweta awa nịịle nke anyị gbara ọchịchịrị ma n’elu ilu—oge nịịle mgbe mkpasu iwe na iru uju anyị nwere ike ịdị ka ha karịrị ihe anyị ga edili. A g’enwe oge nịịle mgbe ịbu arụ na mwute na nchegharị nke mmehie anyị nịịle ga anyịgbu anyị.

Ọ dị otu a, ọbụrụ na anyị g’ebuli obi anyị nịịle nye Onye-nwe-anyị n’oge nịịle ndị ahụ, n’eziya Ọ g’ama ma ghọta. Onye ahụ tara ahụhụ maka anyị n’ime ubi na obe agaghị ahapụ anyị ugbu a n’akasighị anyị obi. Ọ ga agbaa anyị ume, kwado anyị ma gọzie anyị. Ọ ga eji aka ebere Ya nịịle kpuchie anyị.

Ọ g’abụ karịa mụọ-ozi n’ebe anyị nọ.

Ọ g’ewetara anyị nkasị obi, ọgwụgwọ, olile-anya, na mgbaghara agọziri agọzi.

Maka Ọ bụ Onye-mgbapụta anyị.

Onye-nnapụta anyị.

Onye-nzọpụta anyị nwere obi ebere na Chineke anyị dị ngọzi.

Lee anya

  1. Onye-nchụ-aja kwuru okwu n’olili nke Frans Schwarz sịrị “ọrụ nka ya dị nsọ ma dịka otozuru-oke karịa ọtụtụ oziọma” (Emmilie Buchanan-Whitlock, “History of Artists’ Lives Gives Greater Context for Exhibit,” Deseret News, Sept. 29, 2013, deseretnews.com).

Nkuzi si na ozi a.

Tupu ịkuzie ihe, chọọ odudu nke Mụọ-nsọ ka onyere gị aka ịghọta mkpa nịịle dị iche nke ndị ị n’akuziri. Dịka ị n’akọwa site n’ozi nke Onye-isi-nduzi Uchtdorf, gbaa ama nke Onye-nzọpụta na ịchu-aja mgbapụta Ya. Tụlee ịjụ ndị ị n’akuziri ihe Aja-mgbaghara-mmehie Ya pụtara ha na ka nkasị-obi nke Onye-nwe-anyị ji mmetụta ha mgbe “ihe siri ha ike.”

Bipụta