2016
Ọkụ niile na Ihe ọmụmụ niile nke Nrube-isi
Ọktoba 2016


Ntorobia

Ọkụ niile na Ihe ọmụmụ niile nke Nrube-isi

Onye-isi-nduzi Thomas S. Monson ekwuola otu mgbe gbasara oge mgbe ọ mụrụ mkpa dị nime nrube-isi. Mgbe ọ gbara afọ asatọ, ezi-na-ụlọ ya gara njem n’ebe ọnụ-ụlọ ntakịrị ha dị n’elu ugwu. Ya na enyị ya chọbuuru ịbọchasi otu akụkụ ruru ahihịa iji mụnye ọkụ. Ha nwara iji aka bọchasịa ahihịa ahụ, na mgbali na ndoli otu ha nwere ike, kama ihe niile ha nwetere bụụrụ ahịhịa juru aka. Onye-isi-nduzi Monson kọwara, “Mgbe ahụ ka ochere ụzọ kachasi nma dika m si chee ya mgbe ahụ m di afọ asatọ batara n’ime uche-m. A siri m Danny, ‘Ihe niile anyi ga-eme bụ itinye ahihia ndia ọkụ. Anyi ga akpọ-ọkụ ogige gburu-gburu n’etiti ahihia

Ọbụladị na ọ maara na anaghi-ekwe o were mgba-ọkụ , ọ gbabara n’ime ọnụ-ụlọ iwete obere, ma ya na Danny amụnye ntakiri ọkụ n’ime ahihia ahụ. Ha nwere nchekube na ọ ga anwu onwe ya, kama ọkụ ahụ nwuliri elu bụrụzie nnukwu na ajọọ ọkụ. Ya na Danny gbapụrụ ịchọta enyem-aka, ma na-oge nadighi anya, ndị toro-eto gbapụtara ikunyu ọkụ ahụ tutu ya eruo oke osisi.

Onye-isi-nduzi Monson gara n’ihu, “Mụ na Danny mụtara ọtụtụ ihe siri ike ma di oke mpka ụbọchi ahụ—nke kachasi bụ mkpa dị na nrube-isi.” (lee Nrube Na-ewete Ngọzi niile,” Liahona, Ọnwa Ise 2013, 89-90.)

Dịka Onye-isi-nduzi Monson, enwewo oge mgbe Ị mụrụ ihe ọmụmụ nke nrube-isi n’ụzọ siri-ike.? Olee olile-anya ndị I nwere ike inwe iji chekwaa onwe gị site na nrube-isi na-oge na-abia n’ihu?

Bipụta