2016
Ezi-na-ụlọ bụ ihe Chineke hiwere
Ọktoba 2016


Ozi nke ndị Nkuzi Nleta Ọnwa Iri 2016

Ezi-na-ụlọ bụ ihe Chineke hiwere

Were ekpere mụọ akwụkwọ ọziza ma chọpụta ịhe mmetụta imata ihe ịga-akuzi Kedụ otu ịghọta “Ezi n’ụlọ: Ọkwa-amara nye Ụwa niile” ga-esi amụba okwukwe gị n’ime Chineke ma gọzie ndị ahụ ị na-elekọta site na nkuzi nleta? Maka imata ihe ndị ọzọ, ga na reliefsociety.lds.org.

Okwukwe, Ezi-na-ụlọ, Enye m aka

“N’ime okwu niile nke (Ukwe Praịmarị), Ezi-na-ụlọ ahụ Sitere na Chineke,’… a na echetara anyị maka ozizi n’enweghị ntụpọ,” ka Carole M. Stephens kwuru, Onye-ndumodu nke Mbụ na Otu Ndị-isi Nduzi zuru-ọha nke Otu-enyemaka. Anyị na-amụta ọbụghị nanị na ezi-na-ụlọ sitere na Chineke mana anyị bụkwa n’otu-n’otu onye otu ezi-na-ụlọ nke Chineke. …

“… Atụmatụ nke Nna maka ụmụ Ya bụ atụmatụ nke ịhụnanya. Ọ bụ atụmatụ iji jikọta ụmụ Ya—ezi-na-ụlọ Ya—Ya na ha.”1

Okenye L. Tom Perry (1922–2015) nke Otu Ndị-Ozi Iri-na-abụọ kwuru: “Anyị kwe-kwara na ezi-na-ụlọ siri ike maara ntọala abụghị nanị ihe mmejụ nke obodo kwụrụ chịm, mkpata na mmefu di-nma nke obodo, na Omenala bara-uru dabesiri-ike—kama na ha bụkwa mmeju dị oke mkpa nke eighi-ebi na kwa ala-eze na ọchichi govment nke Chineke.

“Anyị kwere na ndị otu ọchichi na govment nke elu-igwe ka aga arụ gburu-gburu ezi-na-ụ lọ niile.”2

“Onye ọbụla na-agbanye-ghi otu ọbụla ọlụlụ dị na nwunye ya siri dị ma ọbụ ụmụ ọle ọ nwere, nwere-ike ị bụ ndị na echekwa atụmatụ nke Onye-nwe dika akọwara na okwa amara maka ezi-na-ụlọ,” ka Bonnie L. Oscarson, Onye-isi-Nduzi zuru-ọha nke Ụmụagbọghọ. “Ọ bụrụ atụmatụ nke Onye-new, o kwesiri ị bụkwa atụmatụ nke anyị!”3

Akwụkwọ nsọ niile agbakwunyere

Ozizi na Ọgbụgba ndụ nile 2:1–3; 132:19

Ozizi nke Ezi-na-ụlọ ahụ

Nwanne nwanyị Julie B. Beck, onye bubuuru Onye-isi-nduzi zuru-ọha nke Otu-enyem-aka, kuziri na ezi nkuzi nke ezi-na-ụlọ bụ nke sitere na Okike, Ọdịda nke mmadụ, na Aja-mgbaghara-mmehie nke Jisọs Kraịst:

“Okike nke elu-ụwa wetere ebe ezi-na-ụlọ nwere ike ibi. Chineke kere otu nwoke na otu nwanyị ndị bụụrụ mmadụ abụọ karichara mkpa nke ezi-na-ụlọ. Ọ bụụrụ otu akụkụ n’ime atụmatụ nke Nna nke Elu-igwe na Adam na Iv ga-arachikọta ma bụrụ ezi-na-ụlọ ebigh-ebi.

“… Ọdịda nke mmadụ mere ka ha nwee ike ịmụta ụmụ ndị nwoke na ụmụ ndị nwanyị.

“Aja-mgbaghara-mmehie (nke Kraịst) n’ekwe ka ezi-na-ụlọ rachikọta ọnụ ruo ebigh-ebi. Ọ na-ekwe ka ezi-na-ụlọ niile inweta uto nke ebigh-ebi na izu-oke. Atụmatụ ahụ nke ańụrị, nke ana akpọkwa atụmatụ nke nzọpụta, bụụrụ atụmatụ nke ekepụtara n’ihi ezi-na-ụlọ niile. …

“… Nkea bụụrụ ozizi nke Kraịst. … Ewezuga ezi-na-ụlọ, enweghị atụmatụ ọbụla; enweghị akọ-na-uche ọbụla dị n’ime ndụ.”4

Huba ama

  1. Carole M. Stephens, “Ezi-na-ụlọ Sitere na Chineke” Liahona, May 2015,11,13.

  2. L. Tom Perry, “Gini na akpata okwu Alụlụ di na nwanyị na Ezi-na-ụlọ—Ihe nille nọ na ụwa,” Liahona, Ọnwa Ise 2015, 41.

  3. Bonnie L. Oscarson, “Ima-okwa nke Onye-nchekwa nke Ezi-na-ụlọ,” Liahona, May 2015, 15.

  4. Julie B. Beck, “Ikuzi Ozizi nke Ezi-na-ụlọ ahụ,” Liahona, Ọnwa nke Atọ. 2011, 32, 34.

Tulee Nkea

Gịnị mere ezi-na-ụlọ jiri bụrụ otu ihe dị mkpa karịa n’ime oge na mgbe ebigh-ebi?

Bipụta