2016
Ngọzi niile nke Nrube-isi
Ọktoba 2016


Ozi nke ndị Nduzi Mbụ, Onwa Iri 2016

Ngọzi niile nke Nrube-isi

“Nkuzi nke kachasi dị mkpa anyị nwere ike imụta na ndụ anụ-arụ,” Onye isi-nduzi Thomas S. Monson akuziwo, bụ na mgbe Chineke na-ekwu ma anyị erube-isi, anyị ga na-emeri.”1

Anyị ga-enwetakwa ngọzi. Dịka Onye isi-nduzi Monson kwuru mgbe emere ogbakọ ozuru ọha na-oge nadighị anya: mgbe anyị na-edebe iwu-nsọ niile, ndụ anyị ga-enwe ańụrị, nwee njupụta karịa, na enweghi mgbanweju anya. Ihe iche-aka mgba anyị niile na nsogbu anyị ga-adi mfe ibu, ma anyị ga-anata ngọzi niile nke (Chineke) kwere na nkwa.”2

N’ime ndepụta ndị-a sitere na nkuzi niile nke Onye isi-nduzi Monson dịka Onye isi-nduzi nke Nzukọ-nsọ, ọ na echetara anyị na iwu-nsọ niile bụ ụzọ inweta ańụrị na udo.

Ntụzi-aka niile nke Njem ahụ

“Iwu-nsọ niile nke Chineke abụghị na-enyere ha iji taa anyị ahụhụ ma ọ bụ bụrụkwa ọdachi nye obi-ụtọ anyị. Kama ọ bụ na ntụghari bụ ezi-okwu. Ya onye nke kepụtara anyị na onye hụrụ anyị n’anya mazuru nnọọ otu anyị kwesiri iji ebi ndụ anyị iji nwee ike nata obi ụtọ kachasi elu anyị nwere ike inata. O nyewo anyị usoro nke, ọbụrụ na nayị soro ha, ga-edu anyị site n’ime njem anụ-arụ nke mgbe ụfọdu na-adi aghụghọ. Anyị necheta okwu niile nke abụ anyị maara amaara: ‘Dewe iwu-nsọ niile ahụ! N’ime nke-a enwere nchekwa; n’ime nkea enwere udo’(lee “Dewe iwu-nsọ niile ahụ” Abụ niile, no. 303).”3

Mgbasi-ike na Ọmụma-ihe

“Nrube-isi bụ ejiri mara nke ndi amụma; ọbụrụla ihe mgbasi-ike na ọmụma-ihe nye ha site rii na mgbe gboo. Ọ di oke mkpa ka anyi mata na anyi nwere ike I nata n’otu aka agbamume na ọmụma-ihe a nke onwe anyi. Ọ diri onye ọbụla n’ime anyi taa, ma ọbụrụ na anyi edebe iwu-nsọ niile nke Chineke. …

“Ọmụma-ihe nke anyi na achọ, aziza anyi na achọ, na ikike anyi chọrọ taa iji nagide ihe iche-aka mgba nke ụwa, nwere ike ibụ nke anyi, ma anyi were obi anyi debe iwu-nsọ nke Onye-nwe”.4

Họọrọ Irube-isi

Ndaghari nke oge anyị bụ nke akwadoro. Ihe nlere-anya nke magazin niile na onyonyo n’egosipụta ndị turu-ugo na ihe onyonyo, ndị mmeri nke egwuru-egwu—ndị ahụ ọtụtụ ndị n’etolite etolite na enwe mmasi idi ka ha—dịka ileghapụ iwu niile nke Chineke na egosighari agwa niile nke ajọ-ọmụme, igosi ya na enweghị ihe nwute ọbụla. Ọ bụ na-ikwenyeghị na ya! Enwere oge nke ngukọta—ọbụladi nhazi nke akwụkwọ-ndeba-niile. Cinderella ọbụla nwere etiti abali nke ya—ma ọbụghị n’ime ụwa nke-a, ọbụrụzie n’ime nke nesote. Ụbọchi ikpe ga abiara onye niile. … Ana m arịọ gị irube-ka ị họrọ isi.”5

Ọńụ na Udo

O nwere ike diri gị oge ụfọdụ na ndị ahụ nọ n’ime ụwa na-enwe ihe ụtọ karịa gị onwe gị. Ụfọdụ n’ime unu nwere ike chee na ama-chibidoro ha site na usoro-iwu nke omume nke anyị niile nọ na nzukọ -nsọ-a na edote. Ụmụnne m ndị nwoke na ụmụnnem ndị nwanyị, ana m ama ọkwa nye unu, otu-o-sila dị, na enweghi ihe ọbụla nke nwere ike iweta ọńụ karịa n’ime ndụ anyị niile ma ọ bụ udo nye mkpụrụ obi anyị niile karịa Mmụọ ahụ nke nwere ike ịbịakute anyị dịka anyị n’eso Onye-nzọpụta ma dewe iwu-nsọ niile.”6

Mee Ihe Ziri-ezi

A na m agba ama nye gị na ngozi niile nke ekwere anyị na nkwa bụ ihe karịrị atụ. Ebule-mmiri nwere ike bia, mmiri ozizo nwere ike makwasi anyị, ọmụma ihe nke ozi-ọma-a na ịhụnanya anyị n’ebe Nna anyị nke Elu-igwe na Onye-nzọpụta anyị nọ ga-akasi anyị obi ma kwado anyị ma weta ańụrị na-obi anyị niile dịka anyị na-eme ihe ziri-ezi ma na-edebe iwu-nsọ niile ahụ. Agaghị enwe ihe dị n’ime ụwa nke-a nke ga-enwe ike imeri anyị.”7

Soro Onye-nzọpụta ahụ

Onye bụ Nwoke ahu nke-a nwere ọtụtụ ihe mgbu, onye maara ọria nke ọma? Onye bụ Onye-eze nke otito, Onye-nwe-anyị nke na elekọtaonye niile? Ọ bụ Onye-isi anyị. Ọ bụ Onye-Nzọpụta anyị. Ọ bụ Ọkpara nke Chineke. Ọ bụ Onye-mmalite nke Nzọpụta anyị. Ọ na-akpọ oku, Bịa soro-m.’ Ọ na-enye iwu, ‘Gaa, ma mee ya otu ahụ.’ Ọ na-arịọ, ‘Rube-isi nye iwu-nsọ m niile.’

“Ka anyị soro Ya. Ka anyị soro ihe ọmụma-atụ Ya. Ka anyị rube-isi na-okwu Ya. “Site na-ime otu ahụ, anyị n’enye Ya onyinye si na Chi nke abọ-ekele.”8

Hụba-ama

  1. “Ha Akawo Ụzọ nke Aga-Eso,” Liahona, Ọnwa Iri. 2007,5.

  2. “Rube isi nye iwu-nsọ niile,” Liahona, Ọnwa Iri na out. 2015, 83.

  3. “Rube-ịsị nye Ịwu niile,” 83

  4. “Nrube-isi N’eweta Ngọzi niile,” Liahona, Ọnwa Ise. 2013, 90, 92.

  5. Kwere, Rube-isi, ma Nogide,” Liahona Ọnwa ise 2012 129.

  6. “Noro ebe niile Nsọ,” Liahona, Ọnwa Iri-na-otu. 2011, 83.

  7. “Nwee Obi dị sara sara,” Liahona, Ọnwa Ise 2009, 92.

  8. “Ịchọta Ọńụ nime Njem ahụ,” Liahona, Ọnwa Iri-na-otu. 2008, 88.

Ịkuzi ihe site n’Ozia

Onye-isi-nduzi Monson na-akuziri anyị gbasara ọtụtụ ngọzi anyị nwere ike ịnata site n’inwe nrube-isi, tinyekwara agba-ume, ọmụma-ihe, ọńụ, na udo. Tulee ịjụ ndị Ị na-akuziri ajụjụ otu ha siri nata ngọzi site na-irube-isi nye iwu-nsọ niile. Inwere ike gbaa ha ume ịga n’ihu na ntụgharị uche maka ngọzi ha niile ma depụta echiche ha na uche ha nwetara n’onwe ha n’ime akwụkwọ jonalụ. I nwekwara ike gbaa ha ume igosipụta obi-ekele nye Chineke n’ihi ngọzi niile, site na-iga n’ihu n’enwe nrube-isi.

Bipụta