2017
Ikpe ekpere maka Udo
Febrụwarị 2017


Ntorobia

Ikpe ekpere maka Udo

Onye odee ya bi na Arizona USA

Ndi nne na nna m mgbe na mgbe gara nzukọ mgbe nzukọ-nsọ gachara, ma a ga m elekọta ụmụ nnem ndi nwoke ntakịrị ma nyere ha aka mee nri ehihie—agbanyeghi ha mgbe ụfọdụ n’ewe iwe ọkụ ma nwee agụụ nri. Mgbe niile ọ bụrụ na ha bido ịlụ-ọgụ, enwere m ike gboo mkpa pụtara dị nwa-ntakịrị ọsịịsọ. Kama mgbe ụfọdụ ọ tara m akpụ ime udo n’otu aka ịlụ-ọgụ bidoro n’ihi ọ na-agbakasi m ahụ.

Otu ehihie, ụmụnne m nwoke nọọrọ n’enwe ezigbo nsogbu ịnọkọrịtara onwe ha. A matara m na mbọ niile m gbara ime udo nani mere ka ihe niile karichaa njọ n’ihi iwe na ọnụma juru m n’obi. Ya mere a gara m mee nri ehihie nke nani m ma kwụsi ikwu-okwu. Emesia, a mara m ọkwa, “A na m aga ikpe ekpere. Anyị nwere ike ịnọtụ nwayọ?” Otu aka ahụ ha nọọrọ ọdụ, agwara ha ka m gọzie nri ahụ. Tupu m mechie ekpere, agbakwunyere m, “Ma biko nyere anyị aka I bụ ndi omee udo.”

Na mbụ, ọ dịrị ka ha anụghị ma bido kwa ịlụ ọgụ ọzọ. Iwe biara m kama a maara m na m kwesiri I dị ịhụnaanya ma diri kwa nwayọ otu m kwesiri ịdị n’ihi ekpewo m maka udo ugbua. Mgbe ọ gara otu ọkara e nwetere m mmetụta I dị nwayọ. E riri m nri n’ekwughi ihe ọbụla, ma ụmụntakiri nwoke ahụ mechara kwụsi ịlụ-ọgụ. Amatara m na udo ahụ m nwetere bụ aziza nye ekpere m dị nro. Ekpewo m ekpere I bụ omee udo, ma Nna m nke Eluigwe enyeworo m aka I nọ nwayọ mgbe ọnwụnwa iti-mkpu bịara. A maara m na Ọ nwere ike n’ezia inye anyị udo.

Bipụta