2017
Ka M Si Hụ Gị N’anya
Febrụwarị 2017


Ọzi nke Otu Ndi-isi Ndụzi Mbu Ọnwa abụọ 2017

“Ka M Si Hụ Gị N’anya”

Afọ ole na ole gara aga otu enyi m akpọrọ Louis kọwaara m otu akụkọ dị nrọ gbasara nne ya dị nwayọ, n’ekwu nwa obere nwa-obere. Mgbe ọ nwụrụ, ọ hapụrụghị ụmụ ya akụ na ụba nke ego kama oke ihe nrite nke ọmụmaatụ, na ichụ-aja, na nrube-isi.

Mgbe agụchara agụmagụ nke mkwam-ozu na iga-ije nke mwute ruo na-ebe ala ili ka emechara ya, ezị-na-ụlo topụtara chọrọ la onwunwe nke nne hapụworo. N’etiti ha, Louis chọpụtara ihe ederede na ọtụgwa. Ihe ederede ahụ nyere iwu: “N’akụkụ ọnụ-ụlọ, nime igbe dị n’okpuru okpokoro, ka enwere igbe ntakịrị. Nime ya ka enwere akụ-oke-ọnụ-ahia nke mkpụrụ-obi m. Ọtụgwa nke-a ga-emepe igbe ahụ”

Onye niile tụrụ anya ihe nne ha nwere ebe obụrụ ibụ nke di mkpa ka ha wee ike igbachi ya.

Igbe ahụ ka ewepụrụ site n’ebe ọ naara anọ ma kpachapụ-anya jiri ọtụgwa ahụ mepee ya. Ka Louis na ndi nke ọzọ na-ele ihe ndi dị nime igbe ahụ, ha hụtara foto onye ọbụla n’otu n’otu, nke edere aha onye ọbụla na ụbọchi amụrụ ya. Louis mgbe ahụ dọpụtara otu valentine emere n’ụlọ. N’ụdịdị ya, otu nwatakịrị si ede ihe, nke ọ kọtara dịka nke ya, ọ gụpụtara okwu ndi o deworo afọ 60 gara aga: “Ezi Nne, A hụrụ m gị n’anya.”

Obi nke dị nro, olu dị nwayọ, na anya nke mmiri juru. Akụ oke ọnụ ahia nke Nne bụ ezi-na-ụlọ ebigh-ebi ya. Ike nke ya tụkwasịrị n’elu ntọ-ala nke “A hụrụ m gị n’anya.”

N’ime ụwa taa, enweghi ebe enwere mkpa ntọala nke ịhụnaanya karịa nime ebe obibi. Ma enweghi ebe ụwa kwesiri ichọta ọmụma-atụ nke ntọala ahụ karia n’ime ebe obibi nke Ndi Nsọ Ụbọchi Ikpeazu ndi meworo ịhụnaanya ihe njikọta etiti nke ndụ ezi-na-ụlọ ha.

Maka ndi ahụ ndi n’ekwupụta na ha bụ ndi n’eso ụzọ nke Onye-nzọpụta Jisọs Kraịst, Ọ nyere iwu nke n’erute ihe dị anya:

“Iwu nsọ ọhụụ ka M n’enye unu, Na unu hụkọritara onwe unu n’anya; dịka m sịrị hụ unu n’anya, na unu hụkwa onwe unu n’anya onye ọbụla n’ime unu.

“Site otua ka mmadụ niile si amata na unu bụ ndi na eso ụzọ m, ọbụrụ na unu nwee ịhụnaanya onye ọbụla n’ime unu.”1

Ọbụrụ n’anyị ga-edobe iwu ịhụ onwe anyị n’anya, anyị kwesịrịrị iji obi ọma na nkwanye-ugwu kpasịwa onwe anyị agwa, n’egosi ịhụnaanya anyị site na mmekọrita anyị kwa ụbọchi. Ịhụnaanya n’ewete okwu dị nwayọ, aziza nwere ndidi, agwa ojuju onwe, nti nwere nghọta, obi nwere mgbaghara. Na mmekọrịta niile dị n’etiti anyị na ndị mmadụ, ịhe ndị a na agwa ndị ọzọ dịka ha ga-enye aka gosipụta ịhụnanya nọ n’ime obi anyị niile

Onye-isi-nduzi Gordon B. Hinckley (1910–2008) kwupụtara: “Ịhụnaanya … bụ ite nke ola-edo nọ na ngwucha eke na ogwurugwu. Emesia ọ karịrị ngwụcha nke eke na ogwurugwu. Ịhụnaanya nọkwa na mbido, ma site na ya ka ịmamma nke n’ejigide ihe niile n’esi etopụta n’ụbọchi oke ikuku. Ịhụnaanya bụ nchekwa nke ụmụntakịrị na-ebe akwa, ntoroọbia nwere ọchichọ, ihe nńyakọta nke n’ejikọta alum di na nwunye, na mmanụ nke n’egbochi mmeru-ahụ n’ime ebe obibi; ọ bụ udo nke mgbe-ochie, anyanwụ nke olile-anya nke na-amuke site n’ọnwụ. Kedu oke ụba ndi nke n’erite uru ya na mmekọrịta niile ha na ezi-na-ụlọ, ndi enyi, nzukọ-nsọ, na ndi agbata-obi.”2

Ịhụnaanya bụ ihe kachasi ụtọ nke ozi-ọma, ezi-omume ka mma nke mkpuru obi mmadụ. Ịhụnaanya bụ ọgwọm n’ọrịa maka ezi-na-ụlọ na arịa arịa, obodo n’ejighi ahụ, na mba na-arịa ọrịa. Ịhụnaanya bụ ihụ ọchi, ufefe, okwu dị obi ebere, na okwu ija mma. Ịhụnaanya bụ ichu-aja, ije-ozi, na omumu ijụ onwe.

Ndi Di, hụ ndi nwunye unu n’anya. Jiri nkwanye-ugwu na inye ekele ji kpasiri ha agwa. Ụmụnne ndi nwanyị, hụ nụ ndi di unu n’anya. Jiri nnukwu ugwu na mgbam-ume ji kpasiri ha agwa.

Ndi nne na nna, hụ nụ ụmụ unu n’anya. Kpeere ha ekpere, kuziere ha, ma gbaara ha ama. Ụmụaka, hụ nụ ndi nne na nna unu n’anya. Gosi nkwanye ugwu, obi ekele, na nrube-isi.

Ewezuga ịhụnaanya nke Kraịst n’enweghi ntupo, Mọmọn nyere ndụmọdụ, “enweghi ihe [anyị] bụ.”3 Ekpere m bụ ka anyị n’esogide ndụmọdụ nke Mọmọn ị “na-eji ume niile nke obi anyị n’ekpere Nna, ka [anyị] nwee ike juputa n’ịhụnaanya nkea, nke enyeworo ndi niile bụ ndi n’eso ụzọ nke Ọkpara ya Jisọs Kraịst, n’eziokwu; ka [anyị] nwee ike bụrụ ụmụ nke Chineke; na mgbe ọ ga-abia anyị ga-enwe ike idi ka ya.”4

Nkuzi nke sitere Na Ozi-a

Onye-isi-nduzi Monson na-akuziri anyị maka mkpa ọ dị igosipụta ezigbo ịhụnaanya dị ka Kraịst, kacha nke nime ebe obibi. Tulee ijụ ndi ị na-elete ajụjụ igbakọta dịka ezi-na-ụlọ ma kparita ụka ụzọ ndi ha nwere ike isi gosi ịhụnaanya karịa n’ebe onye ọbụla nọ. I nwere ike gbaa ha ume ihọrọ otu nime uche ndi ahụ ma tụpụta ụzọ ndi aga eji enwete ya dịka ezi-na-ụlọ. Na-imatụ, ndi otu ezi-na-ụlọ nwere ike chọta otu esi ejere onye ọzọ nime ezi-na-ụlọ ozi na-agwaghi ya n’izu-ụka ọbụla. I nwere ike gwa ha itulee ma emesia otu igba-mbọ irute ebumnobi ha si bawanye ịhụnaanya nime ebe obibi ha.

Bipụta