2017
Aja mgbaghara mmehie nke Kraịst bụ ihe pụtara ihe nke ọma maka Ịhụnaanya nke Chineke
Febrụwarị 2017


Ozi nke Nkuzi ndi nleta ụmụnwanyị Onwa abụọ 2017

Aja mgbaghara mmehie nke Kraịst bụ ihe pụtara ihe nke ọma maka Ịhụnaanya nke Chineke

Mụọ akwụkwọ ọzizi a site n’ekpere ma chọpụta ihe ị ga-akuzi.

Foto, oyiyi
Njiri-mara Otu Enye m aka

Okwukwe, Ezi-na-ụlọ, Enye m aka

Ịghọta na Nna anyị nke Eluigwe nyere anyị Ọkpara Ya Ọ mụrụ naani Ya ka anyị nwee ike inwete ndụ anwụghi-anwụ na inwe ike rite ndụ ebigh-ebi na-enyere anyị aka inwe mmetụta nke ịhụnaanya Chineke n’enweghị nsọtụ na ịhụnaanya n’ebe anyị nọ n’enweghi nkọwa. Onye-nzọpụta anyị hụrụ anyị n’anya.

Onye ga-ekewapụ anyị site na ịhụnaanya nke Kraịst? …

“N’ihi na emewo ka m kwenye, na ọnwụ, ma ọ bụ na ndụ, ma ọ bụ ndi mụọ-ozi, ma ọ bụ ibu-isi dị iche iche, ma ọ bụ ike niile, ma ọ bụ ihe dị ugbua, ma ọ bụ ihe na-abia n’ihu,

“Ma ọ bụ ihe dị elu, ma ọ bụ ihe dị omimi, ma ọ bụ ihe ọzọ ekere eke, ga-enwe ike ikewapụ anyị site na ịhụnaanya nke Chineke, nke dị nime Kraịst bụ Jisọs Onye-nwe-anyị” (Ndi Rom 8:35, 38–39).

Maka Aja-mgbaghara-mmehie nke Jisọs Kraịst, Okenye D. Todd Christofferson nke Kworum nke Ndi Ozi Iri na Abụọ kwuru: “Ahụhụ nke Onye-nzọpụta nime Getsemani na oke nhuju anya Ya n’elu obe ahụ gbapụtara anyị site n’ọnwụ site na imetazu ihe niile nke ikpe ziri ezi na-achọ n’ebe anyị nọ. Ọ na-esetipu ebere ma nye ndi chegharịrị amara. Aja-mgbaghara-mmehie nke Jisọs Kraịst na kwa emetazu ụgwọ nke ikpe ziri ezi ji anyị site na-igwọ ọrịa na ikwụ anyị ụgwọ maka ahụhụ ọbụla anyị na anagide n’enweghi ụta. ‘N’ihi na lee, ọ na-ata ahụhụ mgbu nke mmadụ niile, e, mgbu nke ihe niile ekere eke dị ndụ, ma ndị nwoke, ndị nwanyị, na ụmụ-ntakịrị, bụ ndị ezi-na-ụlọ Adam’(2 Nifaị 9:21; lee kwa Alma 7:11–12).”1

Kraịst ebikwasiwo anyị n’elu obo-aka Ya” (Aisaia 49:16). Linda K. Burton, Onye-isi-nduzi Zuru-ọha Otu Enyem-aka, kwuru si, “Omume nke ịhụnaanya ahụ kachasi-elu kwesiri idubanye onye ọbụla n’ime anyị n’ikpere anyị na ekpere dị umeala ikele Nna anyị nke Bi N’eluigwe maka ịhụ anyị n’anya ruo nke mere na Ọ zigara Ọkpara Ya Ọ mụrụ nani Ya na Ọkpara zuru oke ịta ahụhụ n’ihi njọ anyị, obi mgbu anyị, na ihe niile nke n’adichaghi mma nime ndụ anyị n’otu n’otu.”2

Akwụkwọ nsọ niile agbakwunyere na Ozi

Jọn 3:16; 2 Nifaị 2:6-7, 9; reliefsociety.lds.org

Huba-ama

  1. D. Todd Christofferson, “Mgbapụta,” Liahona Onwa ise 2013, 110.

  2. Linda K. Burton, “Okwukwe n’ime Aja-mgbaghara-mmehie nke Jisus Kraịst Edewo ya n’ime Obi anyị nile?” Liahona Ọnwa iri na otu. 2012, 114.

Tulee uche na Nkea

Kedụ otu anyị ga-esi egosipụta obi ekele anyị na ịhụnaanya anyị na Chineke na Jisọs Kraịst maka onyinye nke Aja-mgbaghara-mmehie Onye-nzọpụta?

Bipụta