2017
E mewom-rịị mkpebị
March 2017


Ntorobia

E mewom-rịị mkpebị

Onye odee ya bi na Utah, USA.

Otu mgbe amụtara-m ihe ozizi na klass ụmụ-agbọghọ gbasara ịdị-ọcha nke mmekọrịta nwoke na nwanyị—isi-okwu nke mere ọtụtụ ndị ntorobia na anọgharị na oche ha. Agaghim echeta-cha ihe niile m mụrụ ụbọchị ahụ, kama agam echeta na onye ndu anyị kwuru gbasara ukpuru ịdị ọcha nke onwe ya—ịdị ọcha nke mmekọrịta oge ọbụla. Okwu ya niile kam na echeta, ma mgbe ahụ, enwere-m mkpebi na onwe-m ime ka nke-a bụrụ otu uru nkem na erite.

Otu ụbọchị, ejim ụgbọ-ala bọs na-ala site na ebe anyị mere ihe egwuru-egwu, otu onye malite-kwara ihe egwure-egwu nke na ịga ekwu ezi-okwu ma ọbụ ihụ ihe ga eme gị. Na agbanyeghi, mụ na ọtụtụ ụmụntakịrị ndị ọzọ sonyere, mgbe oruru oge nkem, ha chọrọ kam mee ihe na adighi nma. Nke-a gaara abụ ihe rara-ahụ ime, kama okwu nke onye ndu Ụmụ-agbọghọ bataram na isi, ma ihe ga eme araghi-kwa ahụ. Ọsọsọ njụrụ nke-a Ekpebi-worịị-m ihe-m ga eme na obi na ọnọdụ dị otua.

A maaram na mgbe anyị na aga nzukọ-nsọ na anabata ihe niile ana akuziri anyị ebe ahu, aga agozi anyị ma nyekwa anyị ikike anyị ga eji emery ihe onwụnwa nke ụwa.

Bipụta