2017
Enye-m aka dị na Ikike nke Jịsọs Kraịst Aja-mgbaghara-mmehie Ya
March 2017


Ozi nke Nkuzi ndi nleta ụmụnwanyị,Ọnwa atọ 2017

Enye-m aka dị na Ikike nke Jịsọs Kraịst Aja-mgbaghara-mmehie Ya

Were ekpere mụọ akwụkwọ ọziza ma chọpụta ịhe mmetụta imata ihe ịga-akuzi Kedu otu ịghọta ebum n’uche nke ndị Otu Enye-m aka ga esi kwadoo ụmụ-ada nke Chineke maka ngozi nke ndụ ebigh-ebi.

Foto, oyiyi
Relief Society seal

Okwukwe, Ezi-na-ụlọ, Enye m aka

“Enwere-m ike ime ihe niile site na Kraịst nke na agbam ume” (Ndị Filip 4:13). “Na agbanyeghi na anyị niile nwere adịgh-ike, anyị nwere ike imeri ha,” ka Onye Isi Nduzi Dieter F. Uchtdorf Onye Ndụmọdụ nke Abụọ na Ndị Isi Nduzi mbụ kwuru. “N’ezie, ọ bụ site na amara Chineke ka, ọ bụrụ n’anyị nwe umeala ma nwe okwukwe, ịhe adịghị-ike nile ga-adịzi ike.”1

Onye Nzọpụta anyị kwuru na Ozizi na Ọgbụgba-ndụ niile, “A ga m aga n’ihu gị” Aga m anọ n’aka nri gị ma n’aka ekpe gị, ma Mụọ nke m ga-anọ n’obi unu niile, ma ndị mụọ-ozi m ga-anọ gburu-gburu unu ikwalite unu” (OO 84:88).

“Nịfaị bụ onye eji amatụ gbasara, onye maara, ma ghọtara, ma dabere na enye-m aka dị na Ikike nke onye-nzọpụta,” ka Okenye David A. Bednar nke onye Otu Ndị ozi Iri na Abụọ kwuru. “Ụmụnne Nịfaị kere ya eriri ma kpaa-nkata imebi ndụ ya. Biko huba ekpere Nịfaị ama: ‘O Onye-nwe, dịka okwukwe nke m nwere n’ebe ị nọ, biko napụta m n’aka ụmụnne m; e, ọbụna inye m ume ka m wee dọbisịa agbụ ndị a e jiri kee m (1 Nifaị 7:17).

“… Nịfaị ekpeghi ekpere ka ọnọdụ ya gbanwee. Kama, O kpere ekpere maka inweta ike iji gbanwe ọnọdụ ya niile. Ekere-m na o kpere ekpere otua, maka na o matara ma ghọta, ma nwee-kwa ahụmihe nke enye-m aka dị na Ikike nke Jịsọs Kraịst na aja-mgbaghara-mmehie Ya.

Echeghim na eriri ahụ ejiri khee Nịfaị, nọkatara gbabie site na aka ya. Kama, E cherem na eji ntachi-obi na ume kariri nke ya ji gozie ya, nke na , site na ike nke Onye nwee anyị’ (Mosaia 9:17) rụọ-ọrụ ma gbagharia, matọtuo eriri ahụ,nke mere na omechara tọtuo eriri ahụ ekere ya.2

Akwụkwọ-nsọ niile na Ọkwa ndị Agbakwunwere na

Izaia 41:10; Eta 12:27; reliefsociety.lds.org

Huba ama

  1. Dieter F. Uchdorf, “Onyinye nke Amara,” Liahona, Ọnwa ise 2015, 108,

  2. David A. Bednar, “Strength beyond Our Own,” New Era, Ọnwa atọ. 2015, 4.

Bipụta