2017
Iji Ezi-omume Mere Ihe Ize-ndụ
March 2017


Ozi nke otu Ndị-Ịsi Ndụzi Mbụ Onwa atọ 2017

Iji Ezi-omume Mere Ihe Ize-ndụ

Onye amụma Chineke na ụwa, Onye Isi Nduzi Thomas S. Mọnson, ekwupụtawo, “Taa, anyị nọ na etiti ọtụtụ ihe ọjọọ, arụrụ-ala, ajọ-ihe nke na eche anyị na ihu oge niile.”1

Ọ ga abụrụ gị ihe itụna anya imata na Onye Isi Nduzi Mọnson kwuru okwu ndị-a Iri afọ ise gara-aga? Ọ bụrụ na anyị nọ na etịtị ihe ọjọọ niile ndị-a oge mgbe ahụ, kedu otu ihe ọjọọ esi ebuso anyị agha taa? Maka ezi uche, Onye nwee anyị ekwupụtawo gbasara ọgbọ nke anyị, “Lee, onye iro ahụ ezukọ-la” (D&C 38:12).

Agha ahụ “nke anyị so na ime”2 malitere tupu amụọ anyị na ụwa-a. Ọ malitere-rị tupu ekee ụwa nke-a. Ọ malitere ọtụtụ pụkụ afọ na ụwa anyị mbụ, ebe ekwensu nupụrụ-isi ma “chọkwa imebi echi-che nhọrọ nke mmadụ” (Mosịs 4:3).

Emeriri ekwensu na agha ahụ ma, zidata ya n’ime ụwa” (Revelation 12:9), eb ọnọkwa na alụ-kwa agha ahụ na aga n’ihu taa Ebe-a n’ime ụwa “ọ na alụso ndị nsọ nke Chineke agha, ma jiri asị, aghụghọ, na ọnwụnwa na erikpodo ha ebe niile” (D&C 76:29).

Ọ na ebuso ndị amụma na ndị ozi agha. Ọ na ebuso iwu nke ịdị-ọcha mmekọrịta nwoke na nwanyị, na ịdị-nsọ nke dị na nwanyị agha. Ọ na ebuso ezi-na-ụlọ na tempụl agha. Ọ na ebuso ihe niile dị nma,dị-nsọ agha.

Kedu otu anyị ga esi ebuso ụdị onye-iro dị otua agha? Kedu otu anyị ga esị ebuso ụdị ihe ọjọọ nke-a dika ọna erikpodo ụwa anyị? Gịnị bụ ihe ize-ndụ anyị? Olee ndị nkwado anyị?

Ike nke nwa-atụrụ ahụ

Onye amụma Josef Smit kuziri na ekwensu nwere ike karia anyị nani na oke anyị hapụrụ ya.3

Ma o wee ruo na mụ, Nifaị, hụrụ ike nke Nwa-atụrụ nke Chineke, na ọ dakwasịrị n’elu ndị nsọ nke nzukọ-nsọ nke Nwa-atụrụ ahụ, na n’elu ndị ọgbụgba-ndụ nke Onye-nwe, ndị gbasasịrị ebe niile na elue ụwa; ma ngwa-ọgụ ha ji bụ ezi-omume na ike nke Chineke n’ime nnukwu otuto” (1 Nịfaị 14:14; ekwuru ugboro-ugboro).

Kedu otu anyị ga esi jiri ezi-omume na ikike chekwaa onwe anyị? Anyị ga edebe ụbọchị ezumike nsọ ma kwanyere ọkwa-nchụ-aja ugwu. Anyị na eme ma na edebe iwu ọgbụgba-ndụ dị-nsọ, rụọ-ọrụ akwụkwọ-akụkọ ezi-na-ụlọ anyị na gakwa tempụl. Anyị na agbali ichegharị oge niile ma na arịọ Onye-nwee ka “ọ were ọbara aja Kraịst ahụ, mee ka anyị nweta mgbaghara mmehie anyị niile (Mosaia 4:2). Anyị na ekpe-ekpere na eje-ozi na agba-ama na egosipụta okwukwe anyị na Jịsọs Kraịst.

Anyị na ewere ezi-omume na ikike mere ihe ize-ndụ dika anyị na akpakodo n’echiche unu niile mgbe niile okwu niile nke ndụ” (D&C 84:85). Anyị na akpakodo okwu niile ahụ site na ime ihe akwụkwọ-nsọ kwuru na kwa okwu nke onye-ozi nke Onye nwee anyị, onye nke ga ekwuru anyị echiche, ebum nuche na okwu-ọnụ Ya (lee D&C 68:4) na oge ọgbakọ ozuru-ọha na ọnwa na abia nụ.

Na agha ahụ anyị na alụso ajọọ-ihe, anyị kwesiri icheta na anyị nwere enwe-m aka site na akụkụ abụọ nke akwa-mgbochị. Ndị nkwado anyị gụnyere Chineke nke Nna Ebigh-ebi, Onye nwee Jịsọs Kraịst, na Mụọ-Nsọ.

Ndị nkwado anyị gunye-kwara ndị agha nke elu-igwe anaghi ahụ anya. “Atụla egwu,” Elaịsha gwara nwa okorobia ahụ egwu na atụ dika ha na ezute igwe ndị agha-ọjọọ, “maka ndị nke nọnyere anyị kariri ndị nke nọnyere ha (lee 2 Ndị-eze 6:15–16).

Anyị ekwesighi ịtụ egwu. Chineke hụrụ Ndị Nsọ Ya na emeri anya. Ọ gaghi ahapụ anyị.

Ama-m na Chineke, na aziza nye ekpere-m, emezuwo arịrịọ-m izọpụta site na aka ihe ọjọọ. A nam agba-ama na site na enye-m aka Chineke Nna, Onye nzọpụta nke ụwa, na Mụọ-Nsọ, anyị nwere obi-sike inweta ikike ịnagịde ihe ọjọọ ọbụla nke ga abiakwute anyị.

Ka anyị were ezi-omume dika ihe ize-ndụ, ka anyị were nwee mmerị.

Huba ama

  1. Thomas S. Monson, “Correlation Brings Blessings,” Relief Society Magazine, Ọnwa anọ. 1967, 247.

  2. “Anyị Niile Ka Edebanyere,” Abụ niile nke 250.

  3. Lee Teachings of Presidents of the Church: Josef Smit (2007), 214.

Bipụta