2017
Igara Ndi-ọzọ ozi site n’Okwukwe
April 2017


Ntorobia

Igara Ndi-ọzọ ozi site n’Okwukwe

Onye-isi-nduzi Uchtdorf na-agwa anyị na okwukwe anyị nime Chineke gariri aga “ụkwụ na ụkwụ ya na ọrụ.” Mgbe “etinyekọtara okwukwe anyị nime ọrụ,” ọ kọwara, ọ na-eji udo na ịhụnaanya ejupụta mkpụrụ obi.” Site na nkwa nke ngọzi a, anyị nwere ike ime ihe dị iche, ma anyị nwere ike ihu nke a n’ime ndụ anyị ma ọbụrụ na anyị ewere oge ahụ iji gaa ozi jupụtara n’okwukwe. I nwere ike kpee ekpere ụtụtụ ọbụla ijụ Onye-nwe-anyị ajụjụ maka enyem aka nime igara ndi ọzọ ozi. Na ima atụ, jụọ Ya ka o gosi gị mgbe otu nwanne gị nwere mkpa enyem aka maka ozi ụlọ ma ọ bụ mgbe ekwesiri ikelezi otu enyi. Emesia, mgbe I nwetara mmetụta, mee ihe maka ya! Ọ bụrụ na imee ekpere ndịa na iga ozi a akparama agwa, mgbe ahụ okwukwe gị, ime ihe oge niile ga agọzi ndụ gị na ndụ niile nke ndi ọzọ. Onye-isi-nduzi Uchtdorf n’ekwe nkwa na I “nwere ike gbanwee ndi mmadụ, ezi na ụlọ, mba, na ụwa.”

Bipụta