2017
Ịnụ iyi na Ịgbandụ nke Ọkwa nchụ-aja
April 2017


Ozi nke Nkuzi Nleta Ọnwa anọ 2017

Ịńụ iyi na Ịgbandụ nke Ọkwa nchụ-aja

Mụọ akwụkwọ ọziza nke-a site n’ekpere ma chọpụta ihe ịga-akuzi Kedụ otu ịghọta nzube nke Otu enyem-aka ga-esi akwado ụmụ ndi nwanyị nke Chineke maka ngọzi nke ndụ ebigh-ebi?

Foto, oyiyi
Relief Society seal

Okwukwe, Ezi-na-ụlọ, Enye m aka

Mgbe anyị dịka ụmụnne ndi nwanyị na-enwe nghọta karịa n’ịńụ iyi na ịgba-ndụ nke ọkwa nchụ-aja gbasara anyị n’onwe, mgbe ahụ ka anyị ga-anabata ngọzi niile na nkwa niile nke ọkwa nchụ-aja karịa.

Okenye M. Russell Ballard nke Kworum ndi Ozi Iri na abụọ kwuru, “Ndị niile ha na Onye-nwe-anyị gbara-ndụ dị-nsọ ma n’edobe ọgbụgba-ndụ ndị ahụ tozuru inweta mkpughe nke-onwe, ịnata ngọzi site n’aka ije-ozi nke ndị-mụọ-ozi, ha na Chineke ịkparịta ụka, ịnata uju nke ozi-ọma, ma emecha, ga-esoro Jisọs Kraịst bụrụ ndị-nketa-ala-eze nke ihe niile Nna anyị nwere.”1

Ngọzi niile na nkwa niile nke ịnụ iyi na ịgba-ndụ nke ọkwa nchụ-aja gbasara ma ndi nwoke ma ndi nwanyị. Nwanne nwanyị Sheri L. Dew, onye bubuuru onye ndụmodụ nime Otu Nduzi Zuru-ọha Otu Enyem aka, kwuru, “Uju nke ọkwa nchụ aja enwere nime ọgbụgba-ndụ niile kacha elu nke ụlọ nke Onye-nwe-anyị ka enwere ike ịnata nani site na-aka otu nwoke na nwanyị etinyekọtara.”2

Nwanne nwanyị Linda K. Burton, Onye-isi-nduzi zuru-ọha Otu Enyem-aka, enyewo ọkpụkpọ oku a, “A na m akpọkụ unu imụta ma buru n’obi ịńụ iyi na ịgba-ndụ nke ọkwa nchụ aja, nke a ga-achọta n’ime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 84:33-44. Site na-ime otu a, a na m ekwe gị nkwa na Mmụọ Nsọ ahụ ga-amụba nghọta gị nke ọkwa nchụ aja ma mmetụta ma bulie gị n’ụzọ niile nke juru anya.”3

Ntụzi-aka niile nke Josef Smit nyere ndi Otu Enyem aka ka atụpụtara ikwado ụmụnwanyị ịbanye nwete ohere ọma niile & ngọzi niile & onyinye niile nke ọkwa nchụ aja.” Nke a ka aga emepụta site na-emume nsọ niile nke temple.

Emume nsọ niile nke temple [bụ] emume nsọ nke ọkwa nchụ aja, mana ha [a] naghị enye ndi nwoke ma ọ bụ ndi nwanyị ọkwa ọrụ nsọ. [Emume nsọ ndi a na-emejụpụta] nkwa nke Onye-nwe-anyị na ndi ya — ndi nwanyị na ndi nwoke — ka aga ‘enye ike site n’igwe’ [D&C 38:32].”4

Akwụkwọ nsọ niile na Ozi agbakwunyere

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 84:19-40; 121:45-46; reliefsociety.lds.org

Huba ama

  1. M. Russell Ballard, “Ndi nwoke na Ndi nwanyị na Ike Ọkwa nchụ aja,” Liahona, Sept. 2014, 36.

  2. Sheri L. Dew, n’ime Daughters in My Kingdom: Akụkọ mgbe ochie na Ọrụ nke Otu Enyem-aka (2011), 128.

  3. Linda K. Burton, “Ike Ọkwa nchụ aja— Nọ na nrute nye Onye niile,” Ensign, Ọnwa isii 2014, 39–40.

  4. Isi okwu niile nke oziọma, “Nkuzi niile nke Josef Smit gbasara Ọkwa nchụ aja, Temple, na Ụmụ nwanyị,” topics.lds.org.

Bipụta