2017
Ndị Ezi-omume Ga Ebi site n’Okwukwe
April 2017


Ozi nke otu Ndị-Isi-Nduzi Mbụ Ọnwa Anọ 2017

Ndị Ezi-omume Ga Ebi site n’Okwukwe

Onye Rabaị na Onye na-eme ncha

Enwere akụkọ mgbe ochie nke ndi juu gbasara onye na-eme ncha onye nke n’ekwenyeghi n’ime Chineke. Otu ụbọchi dịka ọ na-aga ije ya na onye rabaị, o kwuru, E nwere otu ihe m na enweghị ike ighọtaghị. Anyị enweworịị okpukpe-chi n’ime ọtụtụ puku afọ. Mana n’ebe ọbụla ị lere anya enwere ihe ọjọọ, ire ure, akwụwaghị aka ọtọ, ikpe n’ezigh-ezi, ihe ụfụ, agụụ, na mmebisi ihe. Ọ na-egosi na okpukpe chi emezibeghi ụwa ma ọlị. Ya mere m na-ajụ gị, kedụ ihe ọma dị na ya?”

Onye rabaị ahụ azaghị n’oge kama gaa niihu iga ije ya na onye n’eme ncha. Ma emesia ha garuru n’ebe ụmụaka.

“Enwere ihe m na aghọtaghị,” ka onye rabaị kwuru. “Lee ụmụaka ndị ahụ. Anyị enweworịị ncha nime ọtụtụ puku afọ, ma emesia ụmụaka ndị ahụ ururu inyi. Kedụ ihe ọma dị na ncha?”

Onye n’eme ncha zaghachiri, “Mana rabaị, ọ bụghị ihe dị mma na aga ata ncha ụta maka ụmụaka ndị a ruru inyi. Ncha ka aga ejiriri mee ihe tutu ya enwee ike rụpụta nzube ya.”

Rabaị ahụ mere ihu ọchị ma kwuo, “Otu o kwesiri.”

Olee otu Anyị Ga-esi Biri?

Onye Ozi Pọl, n’ikwupụta okwu onye amụma testament ochie, kwuru na nké nké ihe ọ pụtara ị bụ onye kwere ekwe mgbe o dere, “Ndi ezi-omume ga-ebi ndụ site n’okwukwe” (Ndi Rom 1:17).

Elemanya nime okwu a dị mfe anyị ghọtara ihe dị iche n’etiti okpukpere chi nke n’adighị ike ma n’enweghi kwa ike rụpụta ọrụ na nke nwere ike igbanwe ndụ.

Mana n’ighọta ihe ọ pụtara ibi site na okwukwe, anyị kwesiri ịghọta ihe okwukwe bụ.

Okwukwe kariri nkwenye. Ọ bụ ntụkwasị obi kpam kpam nime Chineke tinyekwara akparama agwa.

Ọ karịrị nanị ibu n’obi.

Ọ karịrị nanị inọdụ ala, ikwe n’isi, na ikwu na anyị kwere ekwe. Mgbe anyị kwuru “ndi ezi omume ga ebi ndụ site na okwukwe,” ihe anyị na-ekwu bụ na site n’okwukwe ka esi edu ma tụziere anyị aka. Anyị n’akpa agwa n’ụzọ nke sogidere okwukwe anyị — n’abụgbị n’uche nke nrube-isi n’enweghị mmetụta kama site n’ịhụnaanya siri obi ike ma dị ụcha maka Chineke anyị na akọnuche n’enweghị atụ Ọ kpugheworo nye ụmụ Ya.

Okwukwe ga agarịrị ụkwụ na ụkwụ ya na akparama agwa; ma ọ bụghị onweghị ndụ nime ya (lee Jemes 2:17). Ọbụghị okwukwe ma ọlị. O nweghị ike ịgbanwe otu onye nani, tụmadi ụwa.

Ndi nwoke na ndi nwanyị nke okwukwe tụkwasiri obi na Nna ha nke Eluigwe dị ebere — ọbụladi n’oge niile nke ana amaghị ihe ga-apụta, ọbụladi n’oge nke obi abụọ na mkpagbu mgbe ha na-enweghi ike ịhụta nke ọma ma ọ bụ ghọta n’eziokwu.

Ndi nwoke na ndi nwanyị nke okwukwe n’aga n’ike n’ụzọ nke ndi n’eso ụzọ Kraịst ma na-agblisike isoro ọmụmatụ nke Onye-nzọpụta ha hụrụ n’anya, Jisọs Kraịst. Okwukwe na-akwalite ma, n’ezie, na akwalite mmụọ anyị itinye obi anyị n’eluigwe nakwa iji si ike n’ọrụ setipụ aka, bulie elu, ma gọzie mmadụ ibe anyị.

Okpukpe chi n’enweghị ọrụ dịka ncha nke fọrọ nime igbe. Ọ nwere ike inwe akaraka dị itụnaanya, mana n’eziokwu ọ nwere obere ike imepụta ihe dị iche tutu ruo mgbe ọ rụchara ebumnobi ya. Oziọma nke Jisọs Kraịst eweghachitere bụ oziọma nke iru ọrụ. Nzukọ-nsọ nke Jisọs Kraịst na-akuzi ezigbo oziọma dịka ozi nke olile-anya, okwukwe, na afọ-ọma, tinyekwara inyere ndi ọzọ aka n’ụzọ niile nke ime mmụọ na n’ụzọ niile nke anụ ahụ.

Ọnwa ole na ole gara aga, nwunye m, Harriet, na m naara aga njem nke ezi-na-ụlọ anyị na ụfọdu ụmụ anyị n’ebe Mediterenan. Anyị gara nleta ụfọdu kamp ndi refugee ma zute ezi na ụlọ ndi sitere na mba nke agha mebiworo. Ndị mmadụ ndia abụghị ndi otu okwukwe anyị, mana ha bụụrụ ụmụ nne anyị ndi nwoke na ndị nwanyị ma ha nwere ezigbo mkpa enyemaka. Ọ metụrụ anyị n’obi nke ukwuu mgbe anyị nwetere uche nke onwe otu okwukwe dị n’ọrụ nke ndi otu nke Nzukọ nsọ na-ewete enyem aka, ikwụsi mgbu, na olile-anya nye mmadụ ibe anyị nime mkpa, n’agbanyeghi okpukpe chi ha, mba ha si, ma ọ bụ agụm-akwụkwọ.

Okwukwe etinyere nime ọrụ na-eme ka obi jupụta na ebere, akọ n’uche na nghọta nye uche anyị, na udo na ịhụnaanya nye mkpụrụ obi anyị.

Okwukwe anyị nwere ike igọzi anyị ma were eziomume mmetụta ma ndi nọ anyị n’akụkụ na anyị.

Okwukwe anyị nwere ike were ima mma na udo jupụta ụwa.

Okwukwe anyị nwere ike were ịhụnaanya gbanwee enweghi mmasi na ndi enyi gbanwee ndi iro.

Ndi eziomume, mgbe ahụ, n’ebi site n’iru ọrụ nime okwukwe; ha n’ebi site na-itụkasi obi n’ime Chineke na iga ije n’ụzọ Ya.

Ma nke ahụ bụ ụdịrị okwukwe nwere ike igbanwe mmadụ, ezi na ụlọ, mba, na ụwa.

Bipụta