2021
Kedụ Ihe Onye Nzọpụta Anyị Mewooro Anyị?
Me 2021


“Kedụ ihe Onye Nzọpụta Anyị Mewooro Anyị?,” Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa, Me 2021.

Nzukọ nke Ọkwa nchụaja

Kedụ Ihe Onye Nzọpụta Anyị Mewooro Anyị?

Ụfọdụ ihe ndị ekwuru

Foto, oyiyi
Ili nke Kraịst tọgbọrọ nefu

Kedu ihe Jizọs Kraịst mewooro onye ọbụla n’ime anyị? O mewo ihe niile dị oke mkpa maka njem anyị site na ndụ anụ ahụ gaa na akara aka edepụtaworo nime atụmatụ nke Nna anyị nke Eluigwe. A ga m ekwu maka isi njirimara anọ nke atụmatụ ahụ. …

Mbilite n’ọnwụ ahụ na-enye anyị ucheobi na ume iji nagide aka mgba niile nke ndụ anụ ahụ onye ọbụla n’ime anyị na ndị anyị hụrụ n’anya na-ezute. Ọ na-enye anyị ụzọ ọhụrụ eji ahụta ezughị oké niile nke anụ ahụ, uche, ma ọ bụ nke na-emetụ n’obi anyị nwere n’oge a mụrụ anyị ma ọbụ enwetere noge ndụ anụ ahụ. Ọ na-enye anyị ike iji nagide iru uju niile, ọdịda niile, na nkụda mmụọ niile.

Mbilite n’ọnwụ ahụ nakwa enye anyị oke ihe mgbam ume iji debe iwu nsọ niile nke Chineke n’oge ndụ anụ ahụ anyị. …

Onye Nzọpụta na Onye Mgbapụta anyị nagidere ntaram ahụhụ a na-apụghị ịghọta iji bụrụ aja maka njọ nke mmadụ anụ ahụ niile ga-echegharị. Aja mgbaghara mmehie nke a wetere ihe ọma kachasị, nwa atụrụ ahụ dị ọcha na-enweghị ntukpọ, maka ntụnyere kachasị nke njọ, mmehie nke ụwa niile. …

… Jizọs kuziiri anyị atụmatụ nke nzọpụta. Atụmatụ nke a gụnyere Okike ahụ, ebumnobi nke ndụ, ịdị mkpa nke mmegide, na onyinye nke ohere nhọrọ. Ọ kuzikwaara anyị iwu nsọ niile na ọgbụgba ndụ niile anyị garịrị erube isi na emume nsọ ndị anyị garịrị enweta iji kpọghachị anyị n’ebe nne na nna anyị nke eluigwe nọ. …

Onye Nzọpụta anyị na-enwe mmetụta ma mara ọnwụnwa anyị niile, ndọli anyị niile, obi mgbu anyị niile, na ntaram ahụhụ anyị niile, n’ihi na Ọ gabigara ha niile n’onwe ya dị ka otu akụkụ nke Aja mgbaghara mmehie Ya. … Ndị niile na ata ahụhụ ụdị nkwarụ nke anụ ahụ ọbụla kwesịrị ịcheta na Onye Nzọpụta anyị gabigakwara ụdị mgbu ahụ, ma na site na Aja mgbaghara mmehie Ya, Ọ na-enye onye ọbụla nime anyị ume iji die ya.

Bipụta