2021
Kraịst Ebilitewo; Okwukwe na Ya Ga-eme Ugwu Anọgharịa
Me 2021


Ozi Liahona Kwa Ọnwa, Me 2021

Kraịst Ebilitewo; Okwukwe na Ya Ga-eme Ugwu Anọgharịa

Okwukwe n’ime Jizọs Kraịst bụ ike kachasị dịịrị anyị nime ndụ nke a. Ihe nile ga-ekwe omume na-ebe ndị kwere ekwe nọ.

Ezi ụmụnne m ndị nwoke na ndị nwanyị, obi m juru na ekele maka ohere nke ikwuru unu okwu n’ụbọchị Sọnde Ista nke a.1 Aja mgbaghara mmehie ahụ na Mbilite n’ọnwụ nke Jizọs Kraist gbanwere ndụ ọnye ọbụla nime anyị ruo ebighi ebi. Anyị hụrụ Ya n’anya ma n’eji obi ekele n’efe Ya na Nna anyị nke Eluigwe ofufe.

N’ọnwa isii gara aga, anyị agawo nihu n’achọ otu esi emeri ọrịa mkpochapụ zuru ụwa niile. Ọ na-atụ m n’anya ụdị nnagide na ike nke mụọ nke unu ji ezute nrịanrịa, nfunarị, na ọnọdụ nkepụ. A na m ekpe ekpere mgbe nile na, noge ihe nile a, unu ga-enwe mmetụta ịhụnanya na-adaghị mba nke Onyenwe anyị nwere na-ebe unu nọ. Ọ bụrụ na unu kpara agwa ka ndị kara gbasie ike na-iso ụzọ ahụ n’oge mnwale unu, afọ nke a gara aga agaghị abụ ihe efu.

N’ụtụtụ a, anyị anụwo site n’ọnụ ndị ndu Nzukọ-nsọ ndị si nsọtụ ụwa nile ebe mmadụ jupụtara. N’ezie, ngọzị nile nke oziọma bụ maka agbụrụ, asụsụ ma mmadụ ọbụla. Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst bụ nzukọ nsọ ruru gburugburu ụwa. Jizọs Kraịst bụ onye ndu anyị.

Ekele dịrị chineke, ọbụna ọrịa mkpochapụ ụwa enwebeghi ike ibelata njem eziokwu Ya na-aganiihu ị ga. Oziọma nke Jizọs Kraist bụ kpọmkwem ịhe achọrọ n’oge mgbawojuanya, esemokwu na ụwa nke a ike gwụrụ.

Nwa nke Chineke ọbụla tozuru ịnwete ohere ị nụ ma nabata ozi mgbapụta nke Jizọs Kraịst, na-agwọ ọrịa. Enweghi ozi ọzọ ọbụla kacha dị mkpa na añụrị anyị—ugbua na mgbe ebighi ebi.2 Enweghi ozi ọzọ ọbụla kacha jupụta na olileanya. Enweghi ozi ọzọ ọbụla nwere ike wezuga esemokwu nime obodo anyị.

Okwukwe n’ime Jizọs Kraịst bụ ntọala nke nkwenye nile ma bụrụ ụzọ eji enwete ike dị nsọ. Dịka Pọl Onye ozi si kwuo, “Ma ọbụghi ma okwukwe ọ rara ahụ ịme [Chineke] obi ụtọ: nihi na onye n’abịakwute Chineke garịrị ekwere na ọ dị, nakwa ọ bụ onye n’akwụ ụgwọ nye ndị ahụ na-achọsi ya ike.”3

Ịhe ọma nile nọ na ndụ —ngọzị ọbụla nke bara uru ruo ebigho ebi—n’ebido n’okwukwe. Ikwe ka Chineke nwee mmeri na ndụ anyị n’ebido site n’okwukwe na Ọ dị na njikere i duzi anyị. Ezi nchegharị n’ebido n’okwukwe na Jizọs Kraist nwere ike ịsacha, ịgwọ na ịgba anyị ume.4

“Agọnarịna ike nke Chineke,” onye amụma Moroni mara ọkwa, “n’ihi na ọ na-arụ ọrụ site nʼike, dịka okwukwe nke ụmụ mmadụ siri dị.”5 Ọ bụ okwukwe anyị na-agbahe ike nke Chineke nime ndụ anyị.

Ma na, itinye okwukwe n’ọrụ nwere ike ịdịka ihe siri ike. Mgbe ụfọdụ anyị nwere ike na-eche ma anyị o nwere ike nwee okwukwe otu o kwesịrị iji nata ngọzị ndị anyị chọsiri ike. Kosiladị, Ọnyenwe anyị azawo ajụjụ ahụ site n’okwu ndị nke onye amụma Alma nọ na Akwụkwọ nke Mọmọn.

Foto, oyiyi
Mkpụrụ nke mustard

Alma gwara anyị nanị k’anyị mee ihe nchọpụta n’elu okwu ahụ ma “tinye obere okwukwe nọrụ, ee, ọbụna ọbụrụ na [anyị] enweghị ike ime ihe ọzọ karịa ikwere.”6 Nkebi okwu ahụ “obere okwukwe” n’echetara m maka nkwa nke Onyenwe anyị kwere na baịbụlụ na ọ bụrụ na anyị “nwee okwukwe dịka otu mkpụrụ mustard,” anyị g’enwe ike “ị sị ugwu nke a, si ebe a pụọ ebe ahụ; ma ọ ga-apụ; ma enweghi ihe na-agaghị ekwe omume nye [anyị].”7

Foto, oyiyi
Nnụnnụ n’etiti mkpụrụ mustard

Ọnyenwe anyị ghọtara adịghị ike nke ndụ anụ ahụ anyị. Anyị niile na-ada mba mgbe ụfọdụ. Mana Ọ mazukwara maka nnukwu ike anyị. Mkpụrụ mustard ahụ na-ebido ntakịrị ma too ị bụ nnukwu osisi ga-ezu ọtụtụ nnụnnụ ịrụ akwụ ha na alaka ya nile. Mkpụrụ mustard ahụ nọchitere anya obere okwukwe ma n’eto eto .8

Onyenweanyị achọghị okwụkwe zuru-oke nke anyị ga-eji enwete ohere ịnata ike Ya zuru oke . Mana Ọ na-agwa anyị ikwere.

Ezi Ụmụnne m ndi nwoke na ndi nwanyị, oku m na-akpọ unu n’ụtụtụ Ista nkea bụ i bido taa ịbawanye okwukwe unu. Site n’okwukwe unu, Jizọs Kraist ga-abawanye ike unu nwere iji mee ka ugwu nile nọ na ndụ unu nọgharịa,9 ọbụlaghị aka mgba niile nke onwe gị nwere ike dịka ọ buru oke ibu dịka Ugwu nke Everest.

Ugwu gị nile nwere ike bụrụ nke ahụ owu, obi abụọ, nrịanrịa, mọbụ nsogbu nke onwe gị ndị ọzọ. Ugwu gị nile nwere ike ịdị iche, mana aziza nyere aka mgba ọbụla i nwere bụ ịbawanye okwukwe gị. Nke ahụ g’ewe ọrụ. Ndị ọmụmụ ihe ume ngwụ ma ndị n’eso ụzọ na-adịghị ike gana agba mbọ mgbe niile, iji chịkọta ọbụna obere okwukwe.

Ime ihe ọbụla nke ọma chọrọ ka a gbaa mbọ. Ị bụ ezi onye n’eso ụzọ nke Jizọs Kraist adịghị iche. Ị bawanye okwukwe gị na ntụkwasị obi na Ya na-ewe ịgba mbọ. Ka m nye ntụpụta ise nke ga-enyere unu aka wulite okwukwe na ntụkwasị obi ahụ.

Nke mbụ, mụọ ihe. Bụrụ onye n’achọsike ị mụta ịhe. Mụsie akwụkwọ nsọ ike ịghọta nke ọma karịa ije ozi na njem nlekọta nke Kraịst. Mata ozizi nke Kraịst ka i nwee ike ịghọta ike ya maka ndụ gị. Tinye eziokwu nkea nime gị nke Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst wetaara gị. O wekwasịrị onwe Ya nhusi anya gị, njehie gị nile, adịghị ike gị nile, na mmehie gị nile. Ọ kwụchitere ụgwọ ahụ ma rọpụtara gị ike ahụ iji mee ka ugwu nile nke ị ga-ezuta nọgharịa. Ị n’eweta ike ahụ site n’okwukwe gị, ntụkwasị obi, na ịdị njikere i soro Ya.

Ị me ka ugwu gị nile nọgharịa n’ewe ọrụ ebube. Mụta maka ọrụ ebube nile. Ọrụ ebube n’abịa dịka otu okwukwe ị nwere na Onyenwe anyị sịrị dị. Isi ihe dị n’okwukwe ahụ bụ ịtụkwasị obi n’uche na n’oge Ya—otu na mgbe Ọ ga-agọzi gị site na enyemaka dị ebube ị chọrọ. Nanị ekweghịekwe gị ga-egbochi Chineke igọzi gị site n’ọrụ ebube nke ị mee ka ugwu nile nke ndụ gị nọgharịa.10

Dịka ị n’amụ maka Onye nzọpụta karịa, mgbe ahụ ka ọ ga-adị mfe ịtụkwasị obi n’ebere Ya, n’ịhụnanya Ya nadịghị agwụ agwụ, na mgbam ume Ya, ọgwụgwọ Ya, na ike nke mgbapụta Ya. Onye Nzọpụta anaghị aka anọrọ gị nso karịa mgbe ijiri okwukwena-ezute ma ọbụ na-arịgo ugwu.

Nke abụọ, họrọ ikwere na Jizọs Kraist. Ọ bụrụ na ịnwere obi abụọ banyere Chineke Nna na Ọkpara Ya Ọ Hụrụ Nanya, mọbụ banyere ịdị ire nke Mweghachite mọbụ eziokwu nke ọkpụkpọ oku si na chi nke Josef Smit dịka onye amụma, họrọ i kwere11 ma kwụdesie ike n’ọkwukwe. Wegara Onyenwe anyị ajụjụ gị niile na ụzọ ndị ọzọ esi enwe okwukwe. Mụọ ịhe site ninwe ọchịchọ i kwere karịa na olileanya na ị gị-ahụta ntụkpọ nime ndụ nke onye amụma mọbụ ihe dị iche dị nime akwụkwọ nsọ. Kwụsị ịmụba obi abụọ gị site na gị na ndị obi abụọ ọzọ i kwugharị ịhe ndịa. Hapụ ka Onyenwe anyị duo gị na njem gị nke nchọpụta nke ime mụọ.

Nke atọ, mee ihe n’okwukwe. Gịnị ka ị g’eme mọbụrụ na inweburu okwukwe karịrị akarị? Chegodi echiche maka ya. Dee ihe banyere ya. Mgbe ahụ natakwuo okwukwe site nịme ihe nke ga-achọkwa okwukwe karịrị akarị.

Nke anọ, nata emume nsọ ndị dị nsọ na ntozu oke. Emume nsọ niile na-agbaghe ike nke Chineke maka ndụ gị.12

Ma nke ise, rịọ Nna gị Nke Eluigwe maka enyemaka n’aha Jizọs Kraist.

Okwukwe n’esite n’ọrụ. Ị nata mkpughe n’esite n’ọrụ. Mana “onye ọbụla nke na-arịọ na-anata; ma onye na-achọ na-achọta; ma onye nke na-akụ aka a ga-emeghere ya.”13 Chineke mazuru ịhe g’enyere okwukwe gị aka ito eto. Rịọ, ma rịọkwa ọzọ.

Ọnye n’ekweghi ekwe nwere ike kwuo na okwukwe bụ maka ndị nadịghị ike. Mana ụdị okwu a n’eleghara ike dị n’okwukwe anya. Ndị ozi Onye Nzọpụta ha gaara aganiihu n’akụzi ihe ozizi Ya mgbe ọ nwụsịrị, n’oge achọrọ iwezuga ndụ ha, mọbụrụ na ha nwere obi abụọ na Ya?14 Josef na Hyrum smit ha gaara ata ahụhụ ọnwụ ndị egburu maka okwukwe na-ekwusike maka Mweghachite nke Nzukọ nsọ nke Onyenwe anyị ewezuga ma ha nwererịị ezi akaebe na ịhe ahụ bụ eziokwu? Ihe ruru ndị nsọ 2,000 ha gaara anwụ nokporo ndị ọsụ ụzọ15 mọbụrụ na ha enweghi okwukwe na eweghachitewo oziọma nke Jizọs Kraist? N’ezie, okwukwe bụ ike ahụ n’eme onye na-echeghị ka o mezuo ịhe ndị ahụ echere na ọ gaghị ekwe omume.

Ebeletakwala okwukwe nke i nwewororịị. Ọ n’ewe okwukwe iji bata Nzukọ nsọ ma kwụdesie ike n’okwukwe. Ọ n’ewe okwukwe iji soro ndị amụma karịa isoro ndị ọkacha mara na echiche ndị ụwa. Ọ n’ewe okwukwe iji jee ozi mgbasa oziọma n’oge ọrịa mkpochapụ ụwa. Ọ n’ewe okwukwe iji bie ndụ ịdị ọcha mmekọrịta n’oge ụwa n’eti mkpu na iwu nke ịdị ọcha mmekọrịta bụzi ihe mgbeochie. Ọ n’ewe okwukwe iji kuziere ụmụaka oziọma nime ụwa nke a nọọrọ onwe ya. Ọ n’ewe okwukwe iji rịọ arịrịọ maka ndụ nke onye ahụrụ nanya ma ọbụla okwukwe karịrị akari iji nabata aziza nke ị na-achọghị.

Afọ abụọ gara aga, Nwanne nwwanyị Nelson na Mụ onwe m jere leta obodo Samoa, Tonga, Fiji, na Tahiti. Nke ọbụla niime mba agwaetiti ndị ahụ enwewo oke mmiri ozizo ọtụtụ ụbọchị. Ndị otu ebuwo ọnụ ma kpee ekpere ka nzukọ ndị ha na-eme nezi nwee nchekwa site na mmiri ozizo.

Na Samoa, Fiji, na Tahiti, naanị dị ka nzukọ ndị ahụ malitere, mmiri ozizo ahụ kwụsịrị. Mana na Tonga, mmiri ahụ akwụsịghị izo. Mana, Ndị nsọ nwere okwukwe ruru 13,000 bịara ọsịsọ ọtụtụ awa maka inweta oche, jiri ndidi nọgide noge mmiri ozizo ahụ na-esepụghị aka, ma nọrọkwa ala na mmiri ahụnoge niile nke nzukọ ahụ were awa abụọ.

Foto, oyiyi
Ndị nsọ nke Tonga nime mmiri ozizo

Anyị hụrụ okwukwe siri ike nọ n’ọrụ n’etiti nke ọbụla niime ndị agwaetiti ndị ahụ—okwukwe zuru ịkwụsị mmiri ozizo ahụ na okwukwe nke ịnagide mgbe mmiri ozizo ahụ na-akwụsịghị izo.

Ugwu ndị nke dị nandụ anyị anaghị anọgharị mgbe niile otu ma ọbụ mgbe anyị chọrọ ya. Mana okwukwe anyị mgbe nile ga-akpali anyị ịganiihu. Okwukwe mgbe niile na-abawanye ohere anyị ji anata ike si na chi.

Biko mara nkea: ọ bụrụ na ịhe nile na onye ọbụla ọbụ nọ nime ụwa nke ịtukwasịrị obi gharịpụ, Jizọs Kraist na Nzukọ nsọ Ya enweghị ike agharịpụ gị. Onyenwe anyị anaghị ada mba ma ọbụ ka O ji arahụ ụra.16 Ọ “otu ihe ahụ unyahụ, taa, na [echi].”17 Ọ gaghị echefu ọgbụgba ndụ Ya niile,18 nkwa Ya nile, ma ọbụ ịhụnanya O nwere maka ndị Ya. Ọ n’arụ ọrụ ebube taa, ma Ọ ga-arụ ọrụ ebube echi.19

Okwukwe n’ime Jizọs Kraịst bụ ike kachasị dịịrị anyị nime ndụ nke a. Ịhe nile g’ekwe omume maka ndị ahụ kwere ekwe.20

Okwukwe gị n’eto eto na Ya g’eme ka ugwu nile nọgharịa—ọ bụghị ugwu ndị nke okwute na-achọ elu ụwa mma kama ugwu ndị nke nhuju anya nọ na ndụ unu. Okwukwe gị nke n’amụba amụba g’enyere gị aka gbanwe aka mgba niile ị bụrụ otito na ohere n’enweghi atụ.

Na Sọnde Ista nke a, na mmetụta nke ịhụnanya na obi ekele m dị omimi, a na m ama ọkwa aka ebe m na Jizọs Kraịst ebilitewo na-ezie. Ọ bilitewo idu Nzukọ nsọ Ya. Ọ bilitewo ị gozi ndụ nke ụmụ Chineke niile, ebe ọbụla ha bi. Site n’okwukwe e nwere na Ya, anyị nwere ike ime ka ugwu ndị nọ na ndụ anyị nọgharịa. A na m agba ama n’aha nsọ nke Jizọs Kraịst, amen.

Placeholder Image Credit

Bipụta