2021
Ọrụ Tempụl
Ọktoba 2021


“Ọrụ Tempụl” Liahona, Ọktoba 2021

Kwa Ọnwa Liahona Ozi, Ọktoba 2021

Ọrụ Tempụl

Tempụl niile bụ ụlọ nke Onyenwe anyị. Anyị nwere ike ị nata emume nsọ niile ma gbaa ndụ anyị na Ya nime tempụl niile. Anyị nwekwara ike mee emume nsọ niile maka ndị nna nna anyị ha.

Foto, oyiyi
tempụl

Foto nke Barranquilla Colombia Temple site n’aka Bruno Lima

Kemgbe agụgụ ala niile, Onyenwe anyị enyewo ndị Ya iwu maka iwu tempụl. Tempụl niile bụ ebe dị nsọ anyị nwere ike ịnwete mmetụta ịhụnanya nke Chineke, nata emume nsọ niile, ma kwekọrịta nkwa anyị na Ya. Nzukọ nsọ na-ewu ọtụtụ tempụl gburugburu ụwa ka ọtụtụ ndị mmadụ nwee ike nwete ngọzị ndị ahụ.

Foto, oyiyi
nwanyị nọ n’ihu tempụl

Foto otu nwanyị nọ n’ihu Oquirrh Mountain Utah Temple site n’aka Nexeo na Matthew Reier

Onyinye dị nsọ ahụ

Ndị otú Nzukọ nsọ ndị na-ebi ndụ eziomume na-aga na tempụl maka ị nata emume nsọ niile ma gbaa ndụ, maọbụ kwee nkwa, ha na Chineke. Otu emume nsọ anyị na anata nime tempụl bụ onyinye dị nsọ. Nkọwa mkpụrụ okwu onyinye dị nsọ pụtara “onyinye.” Onyinye dị nsọ nke tempụl bụ onyinye sitere na Chineke. N’ime emume dị nsọ nke a anyị na-amụta banyere atụmatụ Nna nke Igwe banyere nzọpụta anyị, ma anyị na-agba ndụ i dobe iwu nsọ niile nke Chineke. Ọ bụrụ n’anyị kwesị ntụkwasị obi maka ọgbụgba ndụ niile anyị mere, Chineke ga-agọzi anyị.

Foto, oyiyi
nwoke na nwanyị nọ n’ihu tempụl

Foto nke otu nwoke na nwanyi n’eje ije n’akụkụ Manila Philippines Temple site n’aka Cristina Smith

Irachịkọta Ezi na ụlọ niile Ọnụ

Ọlụlụ emere nime tempụl ka a na-akpọkwa nrachi. Mgbe arachiri otu nwoke na nwanyị nime tempụl, ma ha edobe ọgbụgba ndụ ha, ha ga alụ ka di na nwanyị ebighi ebi. Ọ bụrụ na ha nwe ụmụaka, ụmụaka ndị ahụ ka a ga-arachikọtara ha. Ndị nne na nna arachiri mgbe ha mụsịworo ụmụ, bụ ndị enwere ike ị rachikọta ụmụ ha nye ha. Ọ bụrụ na ha bie ndụ eziomume, ha ga-abụ otu ezi na ụlọ ruo ebighi ebi.

Foto, oyiyi
Ebe baptizim nke Lisbon Portugal Tempụl

Foto nke ebe baptizim nke Lisbon Portugal Temple site n’aka Leslie Nilsson

Ọrụ Tempụl maka Ụmụ niile nke Chineke

Anyị na-arụ ọrụ nke agụgụala nke ezi na ụlọ ka anyị nwee ike chọta ndi nna-nna anyị. Emesịa anyị eme ọrụ nke tempụl maka ha. Anyị n’arụrụ ha ọrụ emume nsọ niile nke dịkwara ndị dị ndụ mkpa: baptizim, ịmee onye otú, ị nata ọkwa nchụaja (maka ndị nwoke), onyinye dị nsọ, na nrachi. Emesịa ha ejiri aka ha họrọ ma ha chọrọ ị nabata emume nsọ ndịa. Site n’ụzọ nke a, ụmụ niile nke Chineke nwere ike irite ngọzi niile nke oziọma.

Foto, oyiyi
otu ezi na ụlọ nọ n’ihu tempụl

Foto otu ezi na ụlọ nọ n’ihu Philadelphia Pennsylvania Temple site n’aka Cody Bell

Ngọzi niile nke Ọrụ Tempụl

Ọ bụrụ n’anyị dobe ọgbụgba ndụ anyị mere nime tempụl, anyị ga-abụ ndị agọziri, chekwaa ma gbaa ume. Anyị ga-enwe ike nke ọkwa nchụaja n’etiti onwe anyị. Ezi na ụlọ anyị niile ga-anọkọ ọnụ ruo ebighi ebi.

Tempụl bụkwa ebe udo na ebe mkpughe. Dịka anyị na-eme ọrụ tempụl, anyị ga-enwe ike nata odudu nke ime mmụọ ma nata mmetụta nke ịhụnaanya Chineke.

Bipụta