2021
Aha nke Nzukọ nsọ Ya
Ọktoba 2021


“Aha nke Nzukọ nsọ Ya,” Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa, Oct. 2021.

Kwa Ọnwa Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa Ozi, Ọktoba 2021

Aha nke Nzukọ nsọ Ya

Enwere nkọwa dị nime aha ahụ Jizọs Kraist gụrụ Nzukọ nsọ Ya.

Foto, oyiyi
Jizọs Kraịst dịka Ọnye ọzụzụ atụrụ Ọma

nzukọ nsọ m

Nzukọ nsọ—otú ndị mmadụ kwenyere n’otu ihe niile ma na-efekọọ ofufe ọnụ. Nzukọ nsọ nke a bụ nke Jizọs Kraịst. Ọ bụ Ya bidoro ya. Ọ bụ Ya na-edu ya. Ọ bụ nke Ya.

ga-akpọ

Jịzọs Kraịst agwawo anyị ihe Ọ chọrọ ka ndị mmadụ kpọọ Nzukọ nsọ Ya. N’ihi nke a, ọ bụ ihe anyị kwesịrị ịkpọ ya—ma ọ bụ ihe anyị kwesịrị ị jiri obi ebere gwa ndị ọzọ ka ha kpọọ ya. Aha nke a si n’aka Jizọs Kraịst.

ụbọchị ikpeazụ niile

Ụbọchị ikpeazụ niile—ụbọchị ndị anyị bi nime ya; oge tupu Ọbịbịa nke Abụọ nke Jizọs Kraist. Jizọs Kraist akpọghachiwo Nzukọ nsọ Ya n’ụwa maka ugboro nke ikpe azu a. Ọ ga-enye aka ịkwado ụwa maka Ọbịbịa nke Abụọ Ya.

Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst

(Lee “nzukọ nsọ m.”) Nke a bụ akụkụ nke mbụ banyere aha ahụ Onye nzọpụta gụrụ Nzukọ nsọ Ya. Ọ na-akpọ ya “Nzukọ nsọ ahụ” nihi ọ bụ Ya haziri ya. Ma ọ tinyewo aha Ya nime ya.

Ụbọchị ikpeazụ

(Lee “ụbọchi ikpeazu niile.”) Nke a bụ akụkụ ọzọ n’esochi nke dị nime aha Nzukọ nsọ ahụ. Nke a na-egosipụta na nke a bụ Nzukọ nsọ Ọ weghachiri azụ nime ụbọchi nile nke oge a, n’abụghị nke ahụ Ọ bidoro n’oge ndị gara aga.

Ndị nsọ

Ndị nsọ—mkpụrụ okwu nke nkọwa ya bụ “ndị mmadụ dị nsọ.” Nke a bụ akụkụ ikpeazu nke dị nime aha Nzukọ nsọ ahụ. Ọ na-ekwu maka ndị otú ndị Nzukọ nsọ ahụ. Jizọs Kraist nwere ike ị mee ka anyị dịrị ọcha ma n’enweghi unyi. Ma O na-enye anyi Mmụọ Nsọ maka ị gba anyị ume dịka anyị na-agba mbọ ị mee ihe Ọ nyere anyị n’iwu. Ọ bụrụ n’anyị nwee okwukwe na Ya ma gaa nihu n’ịgba mbọ, Ọ na-eme k’anyị dịrị nsọ. Ọ n’eme anyị Ndị nsọ.

Bipụta