Liahona
Nsoro maka Ịdị n’otu niime Jizọs Kraịst
Ọktoba 2024


“Nsoro maka Ịdị n’otu niime Jizọs Kraịst,” Liahona, Ọkt. 2024.

Ozi Liahona Kwa Ọnwa, Ọktoba 2024

Ihe Nsoro maka Ịdị n’otu niime Jizọs Kraịst

Dị ka anyị na-ejikọta ọnụ niime Jizọs Kraịst dị ka ndị nọ na 4 Nifaị, ọchịchọ anyị ịbụ otu karịrị ịdị iche iche anyị niile ma na-eduba n’obi ụtọ.

Akpụrụakpụ nke Kraịst

Anyị bi n’oge mgbe mbilite nke oke ọgba aghara na-arị ibe ya elu na esemokwu na-agbasa n’akụkụ ụwa niile. Nke teknụzụ na-akwado na nke ndị obi ha jụrụ oyi na-akwado, ike nkewa ndị a na-eyi egwu imejuputa obi anyị na nlelị anya ma jiri esemokwu mebie nzikọrịta ozi anyị. Ihe ndị jikọtara ọha ọnụ na-ekewazi. Agha na-arị ibe ya elu.

N’ihi ọnọdụ nke a, ezi ndị na-eso ụzọ nke Jizọs Kraịst na-enwe oke agụụ maka udo ma na-achọsi ike iwulite ụdị ọha mmadụ dị iche—nke dabere na nkuzi niile nke Jizọs Kraịst. Niihi nke a, Onyenwe anyị enyewo anyị iwu nke: “ịdị n’otu; ma ọ bụrụ na unu a dịghị n’otu unu a bụghị ndị nke m” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 38:27). N’ezie, ịdị n’otu bụ ihe e ji amata ezi Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst.

Kedu ka anyị si arụ ọrụ emegide ike niile nke nkewa na esemokwu? Kedu ka anyị ga-esi enweta ịdị n’otu?

N’ịdaba nke ọma, 4 Nifaị niime Akwụkwọ nke Mọmọn na-enye anyị ihe ịmaatụ. Isi nke a dekọrọ na nke nke otu ndị ahụ si bie ndụ mgbe Onye Nzọpụta letasịworo ha, kuziere ha ihe, ma hiwe Nzukọ nsọ Ya n’etiti ha. Nkọwapụta nke a na-egosi otu ndị a si nweta ịdị n’otu na-enye obi ụtọ na udo, ma ọ na-enyekwa anyị nsoro anyị nwere ike ịgbaso iji nweta otu ịdị n’otu nke a n’onwe anyị.

Ntọghata

Niime 4 Nifaị 1:1, anyị na-agụ: “Ndị na-eso ụzọ nke Jizọs ehiwewo otu nzukọ nsọ nke Kraịst n’ala ahụ niile gbaa gburugburu. Ma [ndị mmadụ] bịakwutere ha, ma chegharịa nʼeziokwu site na mmehie ha niile.”

Anyị na-ejikọta ọnụ na Onyenwe anyị na Onye Nzọpụta Jizọs Kraịst. Dị ka onye ọbụla na-amụta ihe gbasara Jizọs Kraịst, ozi ọma Ya, na Nzukọ nsọ Ya, Mmụọ Nsọ na-agba ama nke eziokwu ahụ n’obi onye ọbụla. Onye ọbụla niime anyị nwere ike mgbe ahụ nabata ọkpụkpọ oku nke Onye Nzọpụta inwe okwukwe na Ya ma soro Ya site n’ichegharị.

Site otu ka njem nke nchegharị nke onye ọbụla si amalite—pụọ site na ọchịchọ nke ịchọ ọdịmma onwe na nke mmehie ma chuwe ihu n’ebe Onye Nzọpụta nọ. Ọ bụ Ya bụ ntọala nke okwukwe anyị. Ma dị ka onye ọbụla niime anyị na-elekwasị Ya anya n’echiche ọbụla (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 6:36) Ọ na-aghọ ike ịdị n’otu niime ndụ anyị.

Ọgbụgba ndụ niile

Ndekọihe dị na 4 Nifaị garaniihu ikwu na ndị ahụ bịara n Nzukọ nsọ ma chegharịa site na mmehie ha niile “ka e mere baptizim nʼaha nke Jizọs; ma ha natakwara Mmụọ Nsọ” (4 Nephi 1:1). Ha abanyewo n’ọgbụgba ndụ—mmekọrịta pụrụ iche, na-adịgide—ha na Chineke.

Mgbe anyị na-eme ma na-edebe ọgbụgba ndụ niile, anyị na-ewekwasị onwe anyị aha nke Onyenwe anyị n’otu n’otu. Na mgbakwunye, anyị na-ewekwasịkwa onwe anyị aha Ya dị ka ndị mmadụ. Ndị niile na-eme ọgbụgba ndụ niile ma na-agba mbọ idebe ha na-aghọ ndị nke Onyenwe anyị, akụ Ya pụrụ iche (lee Ọpụpụ 19:5). Site otu a, anyị na-aga n’ụzọ ọgbụgba ndụ ahụ n’otu otu ma na njikọta aka. Mmekọrịta ọgbụgba ndụ anyị na Chineke na-enye anyị otu ihe kpatara ya na otu njirimara anyị. Ka anyị na-ekekọta onwe anyị n’ebe Onyenwe anyị nọ, Ọ na-enyere anyị aka ime “ka obi anyị niile jikọta ọnụ n’ịdị n’otu na ịhụrịta ibe anyị n’anya” (Mozaya 18:21).

Izi ezi, Nha anya, na Inyere ndị ogbenye aka.

Nkọwapụta dị niime 4 Nifaị garaniihu: “Ma e nweghị esemokwu ọbụla na arụmarụ ụka ndị dị nʼetiti ha, ma onye ọbụla na-emeso onye na ibe ya n’ụzọ ziri ezi.

“Ma ha nwekọtara ihe niile ọnụ nʼetiti ha; ya mere e nweghị ndị ọgaranya na ndị ogbenye, ndị ohu na ndị nweere onwe ha, mana e mere ka ha niile nwere onwe ha, na ndị nketa oke nke onyinye nke eluigwe” (4 Nifaị 1:2–3).

Niihe gbasara mmekọrịta niile nke anụ ahụ anyị, Onyenwe anyị chọrọ ka anyị na-akwụwa aka ọtọ ma na-ekpe ikpe ziri ezi nye onye na ibe ya, ma ghara ịghọgbu ibe anyị ma ọ bụ na-erigbu ibe anyị (lee 1 Ndị Tesolonika 4:6). Dị ka anyị na-abịakwute Onyenwe anyị nso, anyị “agaghị enwe uche imejọ onye na ibe ya, mana ibi n’udo, na imere onye ọbụla dị ka ihe ahụ nke ruuru ya” (Mozaya 4:13).

Onyenwe anyị enyekwala anyị iwu ilekọta ndị ogbenye na ndị nọ na mkpa. Anyị kwesịrị “ikerịta ihe nke [anyị] nwere” iji nyere ha aka, dị ka otu ike anyị ime otu ahụ siri dị, na-amaghị ha ikpe (lee Mozaya 4:21-27).

Onye ọ bụla niime anyị “nye nwanne ya oke nsọpụrụ dị ka onwe ya” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 38:24). Ọ bụrụ na anyị ga-abụ ndị nke Onyenwe anyị ma dịrị notu, ọ bụghị naanị na anyị garịrị na-emeso ibe anyị dị ka nha, mana anyị ahaghị ịhụta onye na ibe ya dị ka nha n’ezie—ịha otu niihu Chineke, bụrụ ndị ha otu na-ịba uru ma hara otu n’ike eji eme ihe.

Nrube isi

Ihe ọmụmụ na-esote sitere na 4 Nifaị na-abịa n’okwu a dị mfe: “Ha gara ije n’usoro iwu nsọ niile nke ha nataworo site n’aka Onyenwe anyị na Chineke ha” (4 Nifaị 1:12).

Onyenwe anyị akuziworo ndị a ozizi Ya, enyewo ha iwu nsọ niile, ma kpọọ ndị odibo ga-elekọta ha. Otu niime ebumnobi Ya niile na-ime nke a bụ ịhụ na a gaghị enwe arụmarụ ụka n’etiti ha (lee 3 Nifaị 11:28-29; 18:34).

Nrube isi anyị nye nkuzi niile nke Onyenwe anyị na ndị odibo Ya dị oke mkpa nye anyị ịdị n’otu. Nke a gụnyere nkwa anyị kwere irube isi n’iwu nsọ ahụ ichegharị mgbe ọbụla anyị dapụrụ na inyere onye na ibe ya aka dị ka anyị na-agba mbọ ime nke ọma karịa na ịdị mma karịa kwa ụbọchị.

Ndị mmadụ na-ele anya n’akwụkwọ nsọ niime nzukọ

Nzukọta Ọnụ

Ọzọkwa, anyị mụtara na ndị mmadụ nọ na 4 Nifaị “[garaniihu] nʼobubu ọnụ na ekpere, na nʼizukọta ọnụ ugboro ugboro ma nʼikpe ekpere ma nʼịnụ okwu nke Onyenwe anyị” (4 Nifaị 1:12).

Anyị kwesịrị izukọta ọnụ. Nzukọ ofufe anyị na-enwe kwa izu ụka niile bụ ohere dị mkpa maka anyị inweta ume, ma n’otu n’otu ma na-igwe. Anyị na-eri oriri nsọ, mụọ ihe, kpee ekpere, bụkọta abụ ọnụ, ma na-akwdo onye na ibe ya. Mgbakọta ndị ọzọ na-enyekwa aka n’ịkwalite mmetụta nke isonye, ọbụbụenyi, na mkpakọrịta otu ebumnuche.

Ịhụnaanya

Ndekọihe ahụ dị na 4 Nifaị mgbe ahụ nyere anyị ihe bụ eleghị anya isi ọtụghe ụzọ nke ihe ndị a niile—ihe nke ọ bụrụ na-ahapụ ya a gaghị enweta ezi ịdị n’otu: “E nweghị esemokwu ọbụla nʼala ahụ, niihi ịhụnaanya nke Chineke nke bi niime obi nke ndị ahụ.” (4 Nifaị 1:15).

A na-enweta udo nke onwe mgbe anyị, n’umeala ruru n’obi, hụrụ Chineke n’anya n’ezie. Nke a bụ iwu nsọ nke mbụ ma dị ukwuu. Ịhụ Chineke n’anya karịa onye ọbụla ma ọ bụ ihe ọbụla ọzọ bụ ọnọdụ nke na-ewete ezi udo, ezi nkasị obi, ezi obisike, na ezi ọńụ. Ka anyị na-ewulite ịhụnaanya nke Chineke na Jizọs Kraịst, ịhụnaanya nke ezinaụlọ na ndị agbataobi ga-esochi n’ụdị ya.

Ọńụ kachasị ukwuu nke anyị ga-enwete mgbe niile na-abịa mgbe ịhụnaanya maka Chineke na ụmụ Ya niile juputara niime anyị.

Afọ ọma, ịhụnaanya nke Kraịst na-enweghị ntụpọ, bụ ajụ nsi nke esemokwu. Ọ bụ agwa bụ isi nke ezi onye na-eso ụzọ nke Jizọs Kraịst. Mgbe anyị wedara onwe anyị ala niihu Chineke ma kpee ekpere jiri ume niile nke obi anyị, Ọ ga-enye anyị afọ ọma (lee Moronaị 7:48).

Dịka anyị na-achọ inweta ịhụnaanya nke Chineke ibi niime obi anyị, ọrụ ebube nke ịdị n’otu ga-adị ka eke n’anya anyị.

Njirimara sinachi

N’ikpeazụ, ndị mmadụ nọ na 4 Nifaị gosipụtara ihe ịrịba ama nke ịdị n’otu nke kwesịrị nlebara anya anyị: “E nweghị ndị mpụnarị, ma ọ bụ ndị ogbu mmadụ, ọbụghị ma e nwere ndị Laman, ma ọ bụ ụdị -ites ọbụla; mana ha dị nʼotu, ụmụ nke Kraịst, na ndị nketa oke nke alaeze Chineke” (4 Nifaị1:17).

Akara niile nke kewaworo ndị mmadụ kemgbe narị kwuru narị afọ sụrụ tupu njirimara na-adịgide adịgide ma na-enye aka. Ha hụrụ ha—na onye ọ bụla ọzọ—dịka otu mmekọrịta ha na Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraịst siri dị.

Ndịiche na ịdị iche iche niile nwere ike ịdị mma ma baara anyị uru. Mana njirimara anyị ndị kachasị mkpa bụ ndị ahụ metụtara nsiripụta na ebumnuuche sinachi.

Nke mbụ na nke kachasị, onye ọbụla niime anyị bụ nwa Chineke. Nke abụọ, dị ka onye otu nke Nzukọ nsọ ahụ, onye ọbụla niime anyị bụ nwa nke ọgbụgba ndụ ahụ. Ma nke atọ, onye ọbụla niime anyị bụ onye na-eso ụzọ nke Jizọs Kraịst. Ana m arịọ anyị niile ka anyị ghara ikwe ka njirimara ọbụla ọzọ “kwapụ, nọchie, ma ọ bụ bute ụzọ karịa aha atọ ndị a na-adịgide adịgide.”

ezinaụlọ nọkọtara ọdụ ọnụ n’ala

Bụrụ Otu

Chineke na-akpọku mmadụ niile Ịbịakwute Ya. O here dịịrị onye niile. Anyị nwere ike ịgba iche n’omenaala, ndọrọ ndọrọ ọchịchị, agbụrụ anyị, ihe ndị na-amasị anyị, na ọtụtụ ụzọ ndị ọzọ. Ma dị ka anyị na-adị n’otu niime Kraist, ụdị ndị iche iche ndị ahụ na-ebelata n’ihe ha pụtara ma ọchịchọ anyị kasịnụ na-ịbụ otu na-anọchi—nke ga-eme ka anyị wee bụrụ nke Ya.

Tinye n’obi ihe ọmụmụ niile akuziri na 4 Nifaị. Dị ka onye ọbụla niime anyị na-agba mbọ itinye mmewere niile nke dị oke mkpa niime ndụ anyị, enwere ike ikwu maka anyị, dị ka ọ dị banyere ha, “Ma nʼezie e nweghị ike inweta ndị nwere an̄ụrị karịa ndị nọ nʼetiti niile e keworo site nʼaka Chineke” (4 Nifaị 1:16).

Hụba ama

  1. Maka ihe ndị ọzọ gbasara nkọwa na ngọzi niile nke ime ọgbụgba ndụ anyị na Chineke, lee Russell M. Nelson, “Ogbụgba ndụ Ahụ dị Ebighị ebi,” Liahona, Ọkt. 2022, 4–11.

  2. Russell M. Nelson, “Nhọrọ niile maka Ebighị ebi” (worldwide devotional for young adults, May 15, 2022), Ọba akwụkwọ Ozi ọma.