Liahona
Olee otu anyị nwere ike i si dị n’otu ma ọbụrụ na anyị niile gbara nnọọ iche iche?
Ọktoba 2024


“Olee otu anyị nwere ike i si dị n’otu ma ọ bụrụ na anyị niile gbara nnọọ iche iche?,” Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa, Okt. 2024.

Ozi Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa Kwa Ọnwa, Ọktoba 2024

Olee otu anyị nwere ike i si dị n’otu ma ọ bụrụ na anyị niile gbara nnọọ iche iche?

Kub niile nwere akụ niile n’elu ha

Anyị niile dị iche iche. Mana Onyenwe anyị chọrọ ka anyị “bụrụ otu” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 38:27). Nke a bụ ụkpụrụ ole ma ole nke ịdị n’otu nke ndị amụma na ndị ozi kuziwooro anyị:

Anyị dị n’otu niime Jizọs Kraịst, ozi ọma Ya, na Nzukọ nsọ Ya. “Ọ bụ naanị niime na site na iguzosi ike nke onwe anyị nye na ịhụnaanya nke Jizọs Kraịst ka anyị nwere ike inwe olileanya ịbụ otu”.

Ịdị n’otu chọrọ ịhụnaanya. “Ọbụna site n’asụsụ dị iche iche na ọmarịcha, omenala ọdịnala na-ebuli elu, anyị ahaghị ijikọ obi ọnụ n’ịdị n’otu na ịhụnaanya.”

Ịdị n’otu abụghị ịbụ otu ụdị ihe. “Ịdị n’otu na ịgba iche iche abụghị ihe ndị megidere ibe ha. Anyị nwere ike nweta ịdị n’otu ka ukwuu ka anyị na-akwalite ikuku nke nsonye na nkwnye ugwu maka ịgba iche iche.” “Ịdị n’otu adịghị achọ ịbụ otu ụdị ihe, mana ọ chọrọ mmagba.”

Ịdị n’otu na-achọ iwepụ esemokwu na akparamoke. “O here dịịrị onye niile. Ka osila dị, enweghị ohere maka akparamoke, amamikpe, ma ọ bụ esemokwu n’ụdị ọbụla.”