Liahona
Jizọs Gọziri Otu n’Otu
Ọktoba 2024


“Jizọs Gọziri n’Otu n’Otu,” Friend, Ọktoba 2024, 26–27.

Kwa Ọnwa FriendOzi, Ọktoba 2024

Jizọs Gọziri Otu n’Otu

Ndị amụma na-akuziri Ndị Nifaị ihe

Ngosipụta niile site n’aka Andrew Bosley

Ndị amụma kuziiri ndị Nifaị ihe gbasara ihe ịriba ama niile nke ọnwụ Jizọs Kraist. Mgbe Ọ nwụrụ, e nwere ọchịchịrị n’ala ahụ ruo mkpụrụ ụbọchị atọ. Emesia, ndị mmadụ nụrụ olu Nna nke Eluigwe ka o si n’eluigwe ekwu okwu.

Jizọs Kraịst na-eleta ndị Nifaị

Nna nke Eluigwe sịrị, “Lee Ọkpara m Hụrụ n’Anya” (3 Nifaị 11:7). Jizọs pụtara ihe nye ndị Nifaị. O bilitere n’ọnwụ! Ọ kụziiri ndị Nifaị ọtụtụ ihe. Ọ gwara ha ka ha chegharịa ma soro Ya.

Jizọs na-agwọ ndị ọrịa

Ọ gwara ndị mmadụ ka ha kpọtara Ya ndị na-arịa ọrịa ka a gwọọ ha. Ọ gọziri ha.

Jizọs na-agọzi ụmụntakịrị

O gọzikwara ụmụntakịrị niile n’otu n’otu. Ndị mmụọ ozi gbara ụmụntakịrị ahụ gburugburu.

Ihu akwụkwọ A na-ete agba

Onye Nzọpụta hụrụ nwa nke Nna nke Eluigwe ọbụla n’anya

Ihu akwụkwọ A na-ete agba

Ngosipụta site n’aka Adam Koford

Olee otu I si enwe mmetụta ịhụnanya nke Onye Nzọpụta?