Come, Follow Me
Jenụwarị 13–19: “A Hụrụ M Ogidi nke Ìhè”: Josef Smith—Agụgụala 1:1–26


“Jenụwarị 13–19: ‘A Hụrụ M Ogidi nke Ìhè’: Josef Smith—Agụgụala 1:1–26,” Bịanụ, Soro Mụ—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 2025 (2025)

“Josef Smith—Agụgụala 1:1-26,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: 2025

Ọdọ osisi Dị Nsọ

Ọdọ osisi Dị Nsọ, site n’aka Greg Olsen

Jenụwarị 13–19: “A Hụrụ M Ogidi nke Ìhè”

Josef Smith—Agụgụala 1:1-26

I nwere ike kwuo na Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile bụ otu akwụkwọ nwere azịza maka ekpere niile: ọtụtụ niime mkpughe dị nsọ ndị dị niile akwụkwọ nke a bịara na azịza nye ajụjụ. Ajụjụ nke malitere ya niile—otu nke kpalitere mkpughe n’elu mkpughe ụbọchi ikpeazụ—ka nwantakịrị nwoke gbara afọ 14 jụrụ. “Agha nke mkpụrụokwu na ọgbaghara nke echiche niile” (Josef Smith—Agụgụala 1:10) agbagwojuwo Josef Smith anya banyere okpukperechi na mmekọrịta ya na Chineke. Elemanya ịnwere ike tụnyere onwe gị na nke a. Anyị na-ahụta ọtụtụ echiche ndị na-emegiderịta onwe ha na olu ndị na-akwagide n’ụbọchi anyị. Mgbe anyị na-achọ ịchọgharị site n’ozi ndị a ma chọta eziokwu, anyị pụrụ ime ihe Josef mere. Anyị pụrụ ịjụ ajụjụ niile, mụọ akwụkwọ nsọ, tulee uche, ma n’ikpeazụ rịọ Chineke. Na nzaghachi nye ekpere nke Josef, ogidi nke ìhè gbadatara site n’eluigwe. Chineke Nna na Jizọs Kraịst pụtara ma zaa ajụjụ ya niile. Ama nke Josef banyere nhụmiihe ọrụ ebube ahụ kwupụtara na-atụghị egwu na “onye ọbụla amamiihe [kọrọ] nwere ike ịrịọ Chineke, ma nwete” (Josef Smith—Agụgụala 1:26). Anyị niile pụrụ ịnata, ma ọ bụghị ọhụ nke si n’eluigwe, opekempe ọhụ doro anya, nke ìhè si n’eluigwe mụkere.

akara ngosi ihe ọmụmụ

Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe obibi na na Nzukọ nsọ

Josef Smit—Agụgụala 1:5–26

Josef Smith, Onye amụma nke Mweghachite.

Nzube nke agụgụala nke Josef Smith bụ itinye anyị “n’onwunwe ihe nke eziokwu niile” niihi na eziokwu banyere Josef ka agbagọwokarị ugboro ugboro (Josef Smit—Agụgụala 1:1). Dị ka ị na-agụ Josef Smith—Agụgụala 1:1-26, kedụ ihe na-agba ama gị ume banyere ọkpụkpọ oku ya si n’igwe?

Lee kwa Ndị Nsọ, 1:3-19.

Josef Smit—Agụgụala 1:5–25

akara ngosi semịnarị
Olee otu m nwere ike i si nata azịza niile nye ekpere m?

E nwewo mgbe “amamiihe kọrọ” gị ma ọ bụ nwee mgbagwoju anya banyere otu mkpebi i kwesịrị ime? (Josef Smith—Agụgụala 1:13). Nhụmiihe Josef Smith nwere n’afọ 1820 nwere ike rụọ ọrụ dị ka usoro dị mma maka mkpugbe nke onwe gị. N’ịma atụ, dị ka ị na-agụ Josef Smit—Agụgụala 1:5–25, chọọ maka nhụmiihe ịnwere ike ịtụnyere onwe gị na ya. Kedụ ihe ị na-amụ banyere:

Kpọkuo nkesa. Ịgụ akwụkwọ nsọ na-akpọku mmetụta niile sitere na Mmụọ Nsọ. Ikesa mmetụta ndịa pụrụ ịkpọku Mmụọ Nsọ ịgba aka ebe nye ndị ọzọ, nakwa nye onye ahụ nke na-ekesa.

Kedụ nghọta ndị agbakwunyere i nwere ike irite site na ederede nke Onyeisi Henry B. Eyring “Ọhụ Mbụ: Usoro maka Mkpughe nke Onwe”? (Liahona, Feb. 2020, 12–17).

I nwere ike chọọ ọmụmaatụ ndị ọzọ niime akwụkwọ nsọ banyere ndị mmadụ na-akparịta ha na Chineke. Eserese ndị dị niime Akwụkwọ Nka Ozi ọma ma ọ bụ akwụkwọ Bịanụ, Soro Mụ ndị ọzọ nwere ike tụnyere gị uche. Gbalịa ịza ajụjụ ndị edepụtara mgbe gara aga maka ọmụmaatụ ọbụla ị chọtara. Kedụ nhụmiihe ndị i nwetara mgbe ị na-anata azịza niile nye ekpere? Kedụ ihe i nwere ike ime iji nyere ndị ọzọ aka nwete nhụmiihe ndị dị mma kwa?

Lee kwa Russell M. Nelson, “Nụrụnụ Ya,” Liahona, Me 2020, 88–92; Isiokwu niile na Ajụjụ niile, “Mkpughe nke Onwe,” Ọba akwụkwọ Ozi ọma.

(Josef Smith—Agụgụala 1:15–20

Josef Smith hụrụ Chineke Nna na Okpara Ya, Jizọs Karịst.

Josef Smith tụkwasịrị obi na Chineke ga-aza ekpere ya, mana ọ tụghị anya otu azịza ahụ ga-esi agbanwe ndụ ya—na ụwa. Dị ka ị na-agụ banyere nhụmiihe nke Josef, tulee otu nsonaazụ nke Ọhụ Mbụ siworo gbanwee ndụ gị.

N’ịma atụ, Ọhụ Mbụ kpughere ọtụtụ eziokwu banyere Chineke Nna na Ọkpara Ya, Jizọs Kraịst, nke dịịrị iche site n’ihe ọtụtụ ndị mmadụ n’ụbọchi nke Josef kwenyere. Dị ka ị na-agụ Josef Smith—Agụgụala 1:15–20, tulee idedata ụzọ dị iche iche iji dezuo nkwupụta dị ka nke a: “Niihi Ọhụ Mbụ mere, Ama m na …”

Kedụ mmetụta ndị i nwere dị ka ị na-atụle nhụmiihe nke Josef na ihe niile nke si na ya bịa?

Lee kwa “Rịọ n’aka Chineke: Ọhụ Mbụ nke Josef Smith” (vidiyo), Ọba akwụkwọ Ozi ọma; “Ekpere Mbụ nke Josef Smith,” Abụ niile, no. 26.

6:35

Ask of God: Joseph Smith's First Vision

Short film produced for the Church History Museum depicting Joseph Smith's First Vision, including details drawn from each of Joseph Smith's accounts.

Josef Smith nọ niime Ọdọ osisi Dị Nsọ

Nkọwa sitere na Ọ Bụrụ Ma Amamiihe Kọrọ Onye Ọbụla niime Unu, site n’aka Walter Rane

(Josef Smith—Agụgụala 1:15–20

Gịnị mere e jiri nwee nkọwapụta dị iche iche nke Ọhụ Mbụ?

N’oge ndụ ya, Josef Smith dekọrọ nhụmiihe ya niime Ọdọ osisi Dị Nsọ ihe rukwara ugboro anọ, mgbe ụfọdụ kpọrọ odee akwụkwọ. Na mgbakwunye, ọtụtụ nkọwapụta ka edere site n’aka ndị ọzọ ndị nụrụ Josef ka o kwuru okwu banyere ọhụ ya. Agbanyeghị na nkọwapụta ndịa were ụfọdụ nkọwa ndị dị iche, ịdabere nonye dere ya, ndị na-ege ntị, na ọnọdụ, ma ọ bụghị ya ha dakọtara. Ma nkọwapụta nke ọbụla na-agbakwunye nkọwa na-enyere anyị aka ghọtazie nhụmiihe nke Josef Smith, dị nnọọ ka otu Ozi ọma Agba Ọhụrụ anọ si nyere anyị aka ghọtazie ije ozi nke Onye Nzọpụta.

Leekwa Isiokwu niile na Ajụjụ niile, “Nkọwapụta Ọhụ Mbụ,” Ọba akwụkwọ Ozi ọma.

Josef Smith—Agụgụala 1:21–26

E nwere m ike ịnọgidesi ike n’ihe m maara, ọbụna ma ndị ọzọ jụ m.

Mgbe Ọhụ Mbụ ya dị ịrịba ama gasịrị, Josef Smith tụrụ anya ikesa nhụmiihe ya nye ndị ọzọ. Mmegide o zutere tụrụ ya na anya. Dị ka ị na-agụ nkọwapụta ya, kedụ ihe na-akpate mmụọ gị ịnọgidesike n’ama gị? Kedụ ọmụmaatụ ndị ọzọ—site na akwụkwọ nsọ, onye nna nna, ma ọ bụ ndị mmadụ ịma—na-enye gị mgbam ume ịnọgidesike na nhụmiihe ime mmụọ i nwewororịị?

Lee kwa Gary E. Stevenson, “Imezi na Ikwupụta Ama Gị,” Liahona, Nov. 2022, 111–14.

Maka nchepụta ndị ọzọ, lee mbipụta niile nke ọnwa nke a nke Liahona na magazin niile Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa.

nkeji ụmụntakịrị 03

Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị

Josef Smith—Agụgụala 1:3-14

Josef Smith ka akwadoro ịbụ onye amụma nke Chineke.

  • Ịmụ ihe banyere oge ntoroọbịa nke Josef Smith nwere ike inyere ụmụ gị aka tụnyere onwe ha nye ya dị ka ha na-amụ site na nhụmiihe ya niile. Enwere ike ha ejide otu foto Josef Smith ma kọọ ihe ha maara banyere ya. Ọ bụrụ ma ọ dị mkpa, i nwere ike gbakwunye eziokwu ndị gbasara ya sitere na Josef Smith—Agụgụala 1:3–14 (lee kwa “Isi nke 1: Josef Smith na Ezi na ụlọ Ya,” niime Akụkọ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile, 6–8, ma ọ bụ vidiyo nke kwekọrọ ya dị niime Ọba Akwụkwọ Ozi ọma). Kedụ nhụmiihe Josef nwere nke nyeere ya aka kwadoo ịbụ onye amụma? Kedụ ihe Chineke nwere ike ịdị na akwadoro anyị ime?

    1:59

    Chapter 1: Joseph Smith and His Family: 1805–1820

otite agba nke Josef Smith Nta na Ọhụ Mbụ

Nkọwa sitere na Ọhụ Mbụ nke Josef Smith, site n’aka Greg Olsen

Josef Smith—Agụgụala 1:10–13

Chineke pụrụ ịza ajụjụ m niile site n’akwụkwọ nsọ.

  • Tulee igosi ụmụ gị akwụkwọ dị iche iche, gụnyekọta akwụkwọ nsọ. Nyeere ha aka chee maka ajụjụ niile akwụkwọ ndị a nwere ike ịsa. Mgbe ahụ unu nwere ike gụkọta Josef Smith—Agụgụala 1:10–11 ọnụ iji chọpụta ụdị ajụjụ ndị Josef Smith nweburu na ụdị azịza ndị ị chọtara niime akwụkwọ nsọ.

  • Ụmụ gị nwere ike chọta mkpụrụokwu niime amaokwu 12 nke kọwara otu ịgụ Jemis 1:5 si metụta Josef. Emesịa unu nwere ike kesaa nhụmiihe otu onye n’ibe ya na nke amaokwu akwụkwọ nsọ nwererịị mmetụta dị ike niime gị. Unu nwekwara ike gụkọọ otu egwu ọnụ banyere ịgụ akwụkwọ nsọ, dị ka “Chọgharịa, Tulee, ma Kpee ekpere” (Akwụkwọ Abụ Ụmụ ntakịrị, 109). Kedụ ihe egwu ahụ na-akuzi banyere ihe mere anyị si agụ akwụkwọ nsọ?

Josef Smith—Agụgụala 1:10–17

Nna nke Eluigwe na-anụ ma na-aza ekpere m niile.

  • Ibido mkparịta ụka banyere otu anyị na Nna nke Eluigwe si ekwurịta, elemanya gị na ụmụ gị nwere ike jụọ onye n’ibe ya ajụjụ niile jiri usoro nkwukọrịta dị iche iche, dị ka ozi ekwe ntị, oku ekwe ntị, ma ọ bụ ihe eji aka dee. Olee otu anyị ga-esi ajụ ajụjụ niile nye Nna nke Eluigwe? Olee otu anyị ga-esi egosi Ya na anyị nwere ịhụnaanya ma na-akwanyere Ya ugwu niime ekpere anyị? Gụkọọ Josef Smith—Agụgụala 1:16–19 ọnụ ma kparịta ụka otu Nna nke Eluigwe si zaa ekpere nke Josef Smith. Gị na ụmụ gị nweziri ike kesaa nhụmiihe mgbe unu rịọrọ Nna nke Eluigwe maka enyemaka ma nata azịza.

Josef Smith—Agụgụala 1:17–19

Josef Smith hụrụ Nna nke Eluigwe na Okpara Ya, Jizọs Karịst.

  • Obere ụmụntakịrị nwere ike nwee obi ụtọ iguzoro setipụ aka mee ka à ga-asị na ha bụ osisi ndị nọ niime Ọdọ osisi Dị Nsọ dị ka ị na-agwa ha banyere Ọhụ Mbụ. Gwa ụmụaka ka ha fegharịa aka dị ka ifufe na-efe mgbe ị na-ekwu banyere Josef na-ekpe ekpere. Mgbe ahụ gwa ha iguzoro emegharịghị ahụ ọbụla mgbe ị na-agwa ha na Nna nke Eluigwe na Jizọs pụtara n’ihu Josef.

  • Ụmụntakịrị ndị toliteworo nwere ike nwee obi ụtọ iji otu foto ma ọ bụ karịa dị niime ntụpụta nke a ịgwa gị ihe ha maara banyere Ọhụ Mbụ. Gbaa ha ume ịrụtụ aka na Josef Smith—Agụgụala 1:14–17 na ikesa echiche na mmetụta ha banyere nhụmiihe nke Josef (lee kwa “Isi nke 2: Ọhụ Mbụ nke Josef Smith,” niime Akụkọ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile, 9–12, ma ọ bụ vidiyo nke kwekọrọ dị niime Ọba Akwụkwọ Ozi ọma).

    2:19

    Chapter 2: Joseph Smith’s First Vision: 1820

Maka echiche ndị ọzọ, lee mbipụta ọnwa nke a nke magazin Friend.

otite agba nke Ọhụ Mbụ

Eziokwu Eweghachitere, site n’aka Leon Parson

ihu akwụkwọ ihe omume maka ụmụntakịrị