“Jenụwarị 6–12: Ńaanụ nti, O Unu Ndị mmadụ”: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 1,” Bịanụ, Soro Mụ—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 2025 (2025)
“Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 1,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: 2025
Jenụwarị 6–12: “Ńaanụ nti, O Unu Ndị mmadụ”
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 1
Na Nọvemba 1831, Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst eweghachitere gbara naanị otu afọ na ọkara. Agbanyeghị ọ na eto eto, ọ ka bụ naanị nnọọ otu nke ndị kwere ekwe a na-amaghị nke ọma bi niime obodo ukwu ndị dịtụ ntakịrị, nke onye amụma na-edu mgbe ọ gbara afọ iri abụọ na ụma. Mana Chineke weere ndị a kwenyere ịbụ ndị odibo Ya na ndị na-ejere Ya ozi, ma Ọ chọrọ ka mkpughe ndị o nyeworo ha ka ebipụta ya nye ụwa.
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile nkeji 1 bụ okwu mmalite nke Onyenwe anyị, ma ọ bụ ndubata, nye mkpughe ndị a. Ọ na-egosi nke ọma na na-agbanyeghị ịbụ onye otu nke Nzukọ nsọ dịịrị obere, enweghị ihe dị obere banyere ozi Chineke chọrọ Ndị nsọ Ya ikesa. Ọ bụ “olu nke ịdọ aka na ntị” nye ndị niile “bi niime ụwa,” na-akuziri ha ichegharị ma hiwe “ọgbụgba ndụ ebighị ebi” nke Chineke (amaokwu 4, 8, 22). Ụmụ odibo ji ozi nke a bụ “ndị na-adịghị ike na ndị dị mfe.” Mana ụmụ odibo dị umeala bụ nnọọ ihe Chineke na-akpọ maka—mgbe ahụ na ugbua—ịkpọpụta Nzukọ nsọ Ya “site na ikpu isi na site na ọchịchịrị” (amaokwu 23, 30).
Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe obibi na na Nzukọ nsọ
“Ńaanụ nti, O Unu Ndị mmadụ.”
Okwu mmalite na-edubata akwụkwọ. Ọ na-egosi isiokwu niile na ebumnobi niile nke akwụkwọ ma na-enyere ndị na-agụ agụ aka jikere ịgụ ihe. Dị ka ị na-agụ nkeji 1—okwu mmalite Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile (amaokwu 6)—chọgharịa maka isiokwu niile na ebumnobi niile Onyenwe anyị nyere maka mkpughe Ya. Kedụ ihe ị na-amụ ga-enyere gị aka nihe ọmụmụ gị nke Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile afọ nke a? N’ịma atụ, i nwere ike tulee ihe ọ pụtara “ịnụ olu nke Onyenwe anyị” niime mkpughe niile (amaokwu 14) ma ọ bụ “ịchọgharị iwu nsọ ndị a” (amaokwu 37).
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 1: 4–6, 23-24, 37–39
Onyenwe anyị na-ekwu okwu site na ụmụ odibo Ya, gụnyekọta ndị amụma ụbọchi ikpeazụ.
Nkeji 1 na-amalite ma mechie jiri nkwuputa nke Onyenwe anyị nke Ọ na-ekwu site na ụmụ odibo Ya ahọọrọ (lee amaokwu 4-6, 23-24, 38). Detuo ihe ịmụrụ site na mkpughe nke a banyere:
-
Onyenwe anyị na olu Ya.
-
Ihe kpatara eji nwee mkpa ndị amụma niime ụbọchi anyị.
Kedụ ihe na-emetụta gị ime niihi ihe ịchọtara?
Olee mgbe ị nụworo olu nke Onyenwe anyị site n’olu ụmụ odibo Ya? (Lee amaokwu 38).
I nwekwara ike chee na otu enyi na-amaghị banyere ndị amụma dị ndụ so gị na-agụ nkeji 1. Kedụ ajụjụ ndị enyi gị nwere ike inwe? Kedụ amaokwu ndị ị ga-achọ ikwurịta gị na enyi gị iji nyere ya aka ghọta otu o si emetụta gị banyere inwe ndị amụma n’ụbọchi anyị?
O nwere ike ịmasị gị ịmata na mgbe kansụl ndị okenye zukọrọ n’afọ 1831 ikwu okwu banyere ibipụta mkpughe niile nke Josef Smith, ụfọdụ ndị mmadụ megidere echiche ahụ. Ihere mere ha niihi adịghị ike na-ide ihe nke Josef, ma ha chegburu na ibipụta mkpughe ndị ahụ nwere ike ịkpata nsogbu ndị ọzọ nye Ndị nsọ (lee Ndị Nsọ, 1:140-43). Ọbụrụ na ị buworịị onye otu kansụl nke a, olee otu ị gaara esi egbo nchegbu ndị a? Kedụ nghọta ndị ị chọtara niime nkeji 1 nke gaara enye aka? (Lee, n’ịma atụ, amaokwu , 24, 38).
Tulee ịgụnyekọta otu abụ dị ka “Bịa, Gee ntị nye Olu nke Onye amụma” (Abụ niile, no. 21) niime ihe ọmụmụ na ofufe gị. Chọọ nkebiokwu niile dị niime abụ na-akuzi otu ụdị ụkpụrụ dị ka amaokwu ndị dị niime nkeji 1.
Leekwa Isiokwu niile na Ajụjụ niile, “Ndị Amụma,” Ọba Ozi ọma.
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 1:12-30, 34-36
Mweghachite ahụ na-enyere m aka zute aka mgba niile nke ụbọchi ikpeazụ ndị a.
Niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile nkeji 1, Onyenwe anyị na-akọwa ihe kpatara O jiri weghachite ozi ọma Ya. Lee ihe ndị kpatara ole n’ole nke i nwere ike idetu dị ka ị na-agụ amaokwu 12-23. Niime nhụmiihe gị, olee otu esi emezu nzube niile nke Onyenwe anyị maka Mweghachite ahụ?
Onyenwe anyị maara na ụbọchi anyị ga-enwe aka mgba ndị siri ike (lee amaokwu 17). Kedụ ihe ndị ị chọtara niime amaokwu 17-30, 34-36 na-enyere gị aka nwee mmetụta udo na obisike na-agbanyeghị aka mgba ndị a?
Leekwa Russell M. Nelson, “Nabata Ọdịniihu jiri Okwukwe,” Liahona, Nov. 2020, 73-73–76.
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 1:19–28
Onyenwe anyị na-eji “ndị na-adịghị ike na ndị dị mfe” emezu ọrụ Ya.
Dị ka ị na-agụ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 1:19-28, i nwere ike tulee ihe ọ pụtara ịbụ nwa odibo nke Onyenwe anyị. Kedụ njirimara ndị Onyenwe anyị chọrọ ụmụ odibo Ya inwe? Kedụ ihe Onyenwe anyị na-emezu site n’ụmụ odibo Ya? Olee otu mkpughe niile dị niime amaokwu ndị a si na-emejupụta gburugburu ụwa na niime ndụ gị?
Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 1:4, 37-39
Site na ndị amụma Ya, Onyenwe anyị na-adọ m aka na ntị maka ihe egwu ime mmụọ.
-
Ịmalite mkparịta ụka banyere ịdọ aka na ntị niile sitere n’aka Onyenwe anyị, i nwere ike ikwu okwu banyere ịdọ aka na ntị ndị anyị natara site n’aka ndị ọzọ banyere ihe egwu ndị anyị anaghị ahụ. Ụfọdụ ịma atụ nwere ike gụnye ala ụlọ na-amị amị, oké ifufe na-abịa, ma ọ bụ ụgbọala na-agba abịa. Ikekwe enwere ike gị na ụmụ gị achọọ ọmụmaatụ ihe iriba ama ịdọ aka na ntị ma tụnyere ịdọ aka na ntị ndịa nye ịdọ aka na ntị ndị Onyenwe anyị nyere anyị. Dị ka otu Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 1:4, 37-39 siri dị, olee otu Onyenwe anyị si adọ anyị aka na ntị? Kedụ ihe Ọ dọworo anyị aka na ntị nso nso a banyere? Ikekwe i nwere ike ile ma ọ bụ gụọ akụkụ ozi ndị nke ọgbakọ zuru ọha ọhụrụ ma chọọ ọmụmaatụ niile nke “olu nke ịdọ aka na ntị.”
-
Gụkọọ otu egwu ọnụ banyere ndị amụma, dị ka amaokwu ikpeazụ nke “Soro Onye Amụma ahụ” (Akwụkwọ Abụ Ụmụntakịrị, 111). Kesaa ama gị na onye amụma na-ekwu okwu Chineke.
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 1:17
Mweghachite ahụ na-enyere m aka zute aka mgba niile nke ụbọchi ikpeazụ ndị a.
-
Iji kwalite mkparịta banyere Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 1:17, gị na ụmụ gị nwere ike were onwe unu dị ka unu na-akwado maka njem. Kedụ ihe ị ga-akwakọta? Ọ bụrụ na ị maara n’oge na mmiri ga-ezo ma ọ bụ na ụgbọala unu ma ọ bụ bọọsụ unu ga-enwe taya dara ada, olee otu ọ ga-esi emetụ otu unu ga-esi akwado maka njem a? Gụkọta ọnụ amaokwu 17, ma kwuo banyere ihe Onyenwe anyị maara ga-eme anyị. Olee otu O si kwadoo maka ya? (Ọ bụrụ ma ọ dị mkpa, kọwaa na “ọdachi” bụ ọghọm dị egwu ma ọ bụ oke ihe ọjọọ.) Olee otu iwu nsọ niile nke Chineke si enyere anyị aka nagide aka mgba niile nke oge anyị?
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 1:17, 29
Onyenwe anyị kpọrọ Josef Smith ịbụ onye amụma.
-
Ịmụ ihe banyere ọrụ Josef Smith na mweghachite ozi ọma nke Onye Nzọpụta, gị na ụmụ gị nwere ike lelee foto nke Onye Nzọpụta na foto nke Josef Smith (lee foto niile niime ntụpụta nke a) ma kwuo okwu banyere ihe Onye Nzọpụta nyere anyị site n’aka Josef Smith. Ụmụ gị nwere ike chọgharịa ọmụmaatụ ndị dị niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 1:17, 29. Gwa ụmụ gị otu o si emetụta gị ịmara na Chineke “kpọkuru nwa odibo m Josef Smith, Nta., ma site n’eluigwe gwa ya okwu” (amaokwu 17).
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 1:30
Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazu a bụ “nzukọ nsọ dị eziokwu ma dị ndụ” nke Onyenwe anyị.
-
Kedụ ihe ọ pụtara ikwu na Nzukọ nsọ a bụ nke “eziokwu ma dị ndụ”? Ime ka ụmụ gị na-eche banyere ajụjụ nke a, ikekwe i nwere ike igosi ha ihe ndị dị ndụ na ndị na-adịghị ndụ—dị ka osisi dị ndụ na osisi nwụrụ anwụ. Olee otu anyị si ama na ihe dị ndụ? Mgbe ahụ i nwere ike ịgụ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 1:30 ma kwuo okwu banyere ihe o nwere ike ịbụ nye Nzukọ nsọ ịbụ nke “dị eziokwu ma dị ndụ.”