Come, Follow Me
Olu niile nke Mweghachite: Ezi na ụlọ nke Josef Smith


“Olu niile nke Mweghachite: Ezi na ụlọ nke Josef Smith,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 2025 (2025)

“Ezi na ụlọ nke Joseph Smith,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: 2025

Olu niile nke Mweghachite

Olu niile nke Mweghachite

Ezi na ụlọ nke Joseph Smith

Onye ọbụla niime anyị ka ndụ ezi na ụlọ metụtara ebe ọ dị ukwuu, ma Josef Smith adịghị iche. Nkwenye okpukperechi na omume niile nke ndị nne na nna ya kụrụ mkpụrụ niile nke okwukwe nke mere Mweghachite adị ire. Jonaalụ nke Josef ka e dekọọrọ okwu nsọpụrụ nke a: “Mkpụrụokwu na asụsụ [bụ] nke n’ezughị ezu iji gosipụta obi ekele nke m ji Chineke n’ụgwọ niihi inye m ụdị nne na nna a dị nsọpụrụ.”

Nsere okwu ndịa sotere sitere n’aka nne ya Lucy Mack Smith; nwanne ya nwoke William Smith; na Onye amụma n’onwe ya na-enye anyị nlele anya niime ike mmetụta okpukperechi dị niime ezi na ụlọ Smith.

eserese nke ezi na ụlọ nke Joseph Smith Ụkwụ.

Ezi na ụlọ nke Joseph Smith, site n’aka Dan Baxter

Lucy Mack Smith

A painting depicting Lucy Mack Smith, mother of Joseph Smith.

“[Nihe ruru 1802], A dara m ọrịa. … Ka m gwara onwe m, adịghị m njikere ịnwụ niihi na amaghị m ụzọ niile nke Kraịst, ma o dịịrị m ka enwere olulu gbara ọchịchịrị n’enweghị ihe dị na ya n’etiti onwe m na Kraịst nke m na-anwaghị anwa agafe. …

“Elekwasịrị m Onyenwe anyị anya ma rịọ ma na-arịọ Onyenwe anyị arịrịọ ka o nwee ike debe ndụ m ka m wee nwee ike zulite ụmụ m ma ma kasie obi nke di m; site otu a ka si dina abalị niile. … Agbara m ndụ mụ na Chineke [na] ọ bụrụ ma o kwe ka m dị ndụ aga m agba mbọ inwete okpukperechi ahụ nke ga-ekwe ka m jeere ya ozi nke ọma, ma ọ dị niime Baịbụl ma ọ bụ ebe ọbụla enwere ike ịchọta ya, ọbụna ọ bụrụ ma aga enwete ya site n’eluigwe site n’ekpere na okwukwe. N’ikpeazụ otu olu gwara m okwu ma sị, ‘Chọọ, ma unu ga-achọta; kụọ aka, ma a ga-emeghere unu ya. Kwe ka obi unu nwee nkasị obi. Unu kwere na Chineke; kwerekwanụ na m.’ …

“Site n’oge nke a gaaniihu enwetere m mgbam ume esepụghị aka. Ekwuru m naanị nwa obere n’isiokwu gbasara okpukperechi agbanyeghị na o mejupụtara echiche m niile, ma echere m na aga m agbalịsike n’oge na-adịghị anya o kwere ịchọ otu onye nsọ onye maara ụzọ niile nke Chineke ikuziri m ihe niile nke Eluigwe.”

William Smith

Portrait of William Smith in latter years of his life.

“Nne m, onye bụụrụ ezigbo nwanyị dị nsọ na onye nwere nnukwu mmasị n’ọdịmma nke ụmụ ya, ma ebe a ma emesịa, jiiri ohere niile nke ịhụnaanya ịbụ nne na nna ya nwere ike ịrọpụta, ime ka anyị na-achọ nzọpụta nke mkpụrụ obi anyị, ma ọ bụ (dị ka esi ekwu ya mgbe ahụ) ‘n’inwete okpukperechi.’ O kwalitere anyị ịga nzukọ nsọ niile, ma ihe ruru onye ọbụla dum n’ezi na ụlọ bịara nwee mmasị n’okwu ahụ, na ndị na-achọ maka eziokwu.”

“Anyị na-ekpekarị ekpere ezi na ụlọ kemgbe m nwere ike ichete. Echetere m nke ọma nna naara eji igegbe anya ya niime akpa uwe ya, … ma mgbe anyị bụ ndị nwoke hụrụ ka ọ na-emetụ igegbe anya ya, anyị maara na ọ bụ ihe ngosi ijikere maka ekpere, ma ọ bụrụ na anyị ahụtaghị ya nne ga-asị, ‘William,’ ma ọ bụ onye ọbụla bụ nke leghaara anya, ‘jikere maka ekpere.’ Mgbe ekpere gasịrị anyị nwere otu egwu anyị ga-agụ.”

akwụkwọ nsọ emeghere emeghe

Josef Ukwu na Lucy Smith kuziiri ezi na ụlọ ha ịmụ akwụkwọ nsọ.

Joseph Smith

One drawing in pencil, charcoal and ink on paper.  A left profile, head/shoulders portrait of Joseph Smith; drawn basically in charcoal, highlighted with white paint and black ink.  titled at bottom "Jospeh Smith the Prophet."  Signed at left shoulder "Drawn from the most authentic sources by Dan Weggeland"  A drawn border surrounds it.  No date apparent.

“Ugbu a ana m asị, na [nna m] enweghị ma ọlị mgbe o mere oke ihe nke enwere ike isị na-adịghị obi ọma, niime ndụ ya, nke m maara. A hụrụ m nna m na ncheta ya naanya; na ncheta nke omume ọma ya niile, dabeere nke ukwuu niime obi m; na ọtụtụ nke mkpụrụokwu ya dị obi ọma nke onye nne na nna nye m, ka edere n’elu obi m. Dị nsọ nye m, bụ echiche niile nke masịrị m maka agụgụala nke ndụ ya, nke gafere m n’obi ma akụnyewo ya ebe ahụ, site na nghọta nke onwe m kemgbe a mụrụ m. … Nne m kwa bụ otu niime ndị mara mma agwa, na nke kachasị mma na ndịinyom niile.”