“Jenụwarị 20–26: ‘Obi nke Ụmụ Ga-atụgharị nye Ndị Nna nna Ha ha’: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 2; Josef Smith—Agụgụala 1:27–65,” Bịanụ, Soro Mụ—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 2025 (2025)
“Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 2; Josef Smith—Agụgụala 1:27–65,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: 2025
Jenụwarị 20–26: “Obi nke Ụmụ Ga-atụgharị nye Ndị Nna nna Ha ha”
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 2; Josef Smith—Agụgụala 1:27–65
O ruworịị afọ atọ kemgbe Chineke Nna na Ọkpara Ya, Jizọs Kraịst, pụtara niihu Josef Smith niime ọdọ osisi, ma Josef anatabeghị mgbakwunye mkpughe ọbụla kemgbe ahụ. Ọ malitere iche ma obi adịghị Onyenwe anyị mma n’ebe ọ nọ. Dị ka onye ọbụla niime anyị, ọ zọghiewo ụkwụ n’ụzọ dị iche iche, ma ọ mara onwe ya ikpe site na ha. Ma Chineke ka nwere ọrụ maka nke ọ ga-eme. Ma ọrụ nke akpọrọ Josef ime jikọtara n’ihe Chineke na-achọ n’aka anyị. Josef ga-ewepụta Akwụkwọ nke Mọmọn; ana akpọku anyị ikesa ozi ya. Josef ga-anata ọtụghe niile nke ọkwa nchụaja iji tụgharịa obi nke ụmụ nye ndị nna nna ha ha; ugbu a anyị nwere ike ịnata emume nsọ niile maka ndị nna nna anyị ha niime tempụl. A gwara Josef maka mkpughe niile ga-emezu oge na-adịghị anya, ana akpọku anyị inye aka mejupụta mkpughe ndị a. Dị ka anyị na-eso n’ọrụ nke Chineke, anyị nwere ike tụọ anya izute mmegide ma ọbụna mkpagbu, dị ka nnọọ Onye amụma nwere. Mana anyị nwere ike nwee okwukwe na Onyenwe anyị ga-eji anyị mee ngwa ọrụ n’aka Ya, dị ka nnọọ O meere Josef.
Lee kwa Ndị Nsọ, 1:20-48.
Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe obibi na na Nzukọ nsọ
Chineke nwere ọrụ nke m ga-arụ.
Ọ bụ otu ihe ikwenye na Chineke nwere ọrụ nke Josef Smith ga-eme—anyị nwere ike leghachi anya azụ na ndụ ya ma hụta nke ọma ihe o mezuru. Mana enwewo mgbe ichere na Chineke nwere ọrụ nke ị ga-emekwa? Dị ka ị na-agụ Josef Smith—Agụgụala 1:27–33, chee banyere ihe ọrụ ahụ nwere ike ịbụ. Olee otu o na-esi enye aka na Mweghachite nke ozi ọma nke Onye Nzọpụta na-aganiihu?
Okenye Gary E. Stevenson kuziri: Dị ka anyị na-abịakwute Kraịst ma nyere ndị ọzọ aka ime otu a, anyị na-esonye n’ọrụ nke nzọpụta na mbuli elu nke Chineke, nke na-elekwasị anya n’oke n’ọrụ ndị esi n’igwe họpụta. … Oke n’ọrụ ndị a dị mfe, na-akpate mmụọ, na-akpali mmụọ, ma kwere omume. Lee ha ebe a:
-
Ibi oziọma nke Jizọs Kraịst
-
Nlekọta maka ndị ahụ nọ na mkpa
-
Ịkpọku ndị niile ịnata oziọma ahụ
-
Ijikọ ezi na ụlọ niile maka ebighị ebi” (“Dị mfe N’ịma Mma—Maa mma N’ịdị Mfe,” Liahona, Nov. 2021, 47).
Tulee nhụmiihe ndị a i nweteworo n’isonye niime oke n’ọrụ nke ọbụla ndị a ahọpụtara si n’igwe. Kedụ ihe Onye Nzọpụta ga-achọ ka gị mee ọzọ? Enwere ihu akwụkwọ Isiokwu niile na Ajụjụ niile maka oke n’ọrụ nke ọbụla ndị a (lee “Ọrụ Anyị niime Ọrụ nke Nzọpụta na Mbuli elu,” Ọba Akwụkwọ Ozi ọma). I nwere ike nyocharịa ihu akwụkwọ ndị a iji nyere gị aka zaa ajụjụ ndị a.
I nwere ike mgbe ụfọdụ chee na Onyenwe anyị enweghị ike iji gị rụọ ọrụ niihi nzọghie ụkwụ ndị i meworo. Kedụ ihe ị mụtara site na nhụmiihe nke Josef Smith niime Josef Smith—Agụgụala 1:28–29? Olee otu ị nwere ike i si mata “ọnọdụ gị niihu [Chineke]?
Lee kwa “Ọrụ Ndị Ntoroọbịa niime Ọrụ nke Nzọpụta” (vidiyo), ChurchofJesusChrist.org; “Ọrụ nke Nzọpụta na Mbuli elu,” Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe, 1.2.
Site n’iweghachite ozi ọma Ya, Onye Nzọpụta mejupụtara mkpughe mgbe ochie niile.
Mgbe Moronaị pụtara nye Josef Smith, o kwuru ọtụtụ mkpughe Agba Ochie na Ọhụrụ, dị ka Aịzaya 11; Ọrụ 3:22–23; na Joel 2:28–32. Dị ka ị na-agụ Josef Smith—Agụgụala 1:34–47, chee banyere ihe mere mkpughe ndị a nwere ike dịrịị mkpa maka Josef ịmata. Kedụ ihe mere ha ji dị mkpa na anyị ga-amata?
I nwekwara ike gụọ ihe Okenye Devid A. Bednar kuziri banyere nleta mbụ nke Moronaị nye Josef Smith niime “Jiri Ike nke Chineke niime Ebube Dị Ukwuu” (Liahona, Nov. 2021, 28).
Lee kwa “Otu Mmụọ ozi sitere N’igwe,” Abụ niile, no. 13.
Chineke ga-akwado m ịrụ ọrụ niime alaeze Ya.
Josef gbara naanị afọ 17 mgbe mbụ ọ hụrụ epekele niile nke ọlaedo. Enyeghị ya ha ilekọta, kosiladị, tutu ruo mgbe afọ anọ gasịrị. Gụọ Josef Smith—Agụgụala 1:48–60, na-achọgharị ihe mere niime ndụ nke Josef n’oge ahụ. Olee otu i si chee na ihe omume ndị a kwadoro ya maka ọrụ Chineke kpọrọ ya ime? Kedụ nhụmiihe ndị i nwetaworo nke kwadoworo gị ijere Chineke na ndị ọzọ ozi? Kedụ ihe ị na-ahụbiga ugbu a nke nwere ike inyere gị aka kwadoo maka ije ozi n’ọdịniihu?
Onyenwe anyị zigara Elijah ịtụgharị obi m nye ndị nna nna m ha.
Kedụ ihe mkpụrụ okwu dị ka “kụnye,” “obi,” na “tụgharịa” niime nkeji nke a na-akuziri gị banyere ozi nke Elijah na ngọzi nke ọtụghe ọkwa nchụaja niile o weghachitere? Olee otu o siworo nwee mmetụta n’obi gị echigharịwo n’ebe ndị nna nna gị ha nọ? Chee maka ụzọ ndị i nwere ike i si hụbiga ụdị mmetụta a ugboro ugboro. Ị na-achọgharị ndị nna nna gị ha ma na-eme emume nsọ niile maka ha niime temple bụ otu ụzọ (lee FamilySearch.org). Kedụ ndị ọzọ i nwere ike iche maka ya?
Lee kwa Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 110:13–16; Gerrit W. Gong, “Dị Obi ụtọ ma Ruo Ebighị ebi,” Liahona, Nov. 2022, 83–86.
Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị
E nwere m ike ichegharị ma nwete mgbaghara.
-
Anyị mgbe ụfọdụ “na-ama onwe anyị ikpe niihi adịghị ike na emetazighị [anyị],” dị ka Josef Smith mere. Gị na ụmụ gị nwere ike mụkọta Josef Smith—Agụgụala 1:29 ọnụ, na-achọgharị ihe Josef mere mgbe o chere otu ahụ. Kedụ ihe anyị nwere ike ịmụ site na ọmụmaatụ ya nwere ike inyere anyị aka mgbe anyị zọghiere ụkwụ? Gịnị mere o ji dị mkpa ịmata na Chineke kpọrọ Josef ọbụna agbanyeghị na o zughị oke?
Nna nke Eluigwe kpọrọ Josef Smith iji nyere Ya aka rụọ ọrụ Ya.
-
Ụmụ gị nwere ike nwee obi ụtọ ime ka à ga-asị na ha bụ Josef Smith dị ka ị na-akọ nkọwapụta nke nleta Moronaị niime Josef Smith—Agụgụala 1:27–54 ma ọ bụ “Isi nke 3: Mmụọ ozi Moronaị na Epekele niile nke Ọlaedo” (dị niime Akụkọ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile, 13–17, ma ọ bụ vidiyo kwekọrọ ya niime Ọba Akwụkwọ Ozi ọma). N’ịma atụ, ha nwere ike gbakọta aka ha dị ka ha na-ekpe ekpere ma ọ bụ ime ka a ga-asị iri elu Ugwu Kumora, na ndị ọzọ. Mgbe ahụ i nwere ike rịọ ha ikwu ihe banyere ihe Chineke kpọrọ Josef Smith ime na otu esiworo gọzie anyị niihi ya. N’ịma atụ, olee otu esiworo gọzie anyị niihi na Josef Smith tụgharịrị asụsụ Akwụkwọ nke Mọmọn? Olee otu ọrụ ya si nyeere anyị aka bịaruo nna nke Eluigwe na Jizọs Kraịst nso?
NaN:NaN
Nna nke Eluigwe chọrọ ka a rachie ezi na ụlọ niile niime tempụl.
-
Eleghị anya gị na ụmụ gị ga-enwe obi ụtọ ile anya na ụfọdụ foto nke ezi na ụlọ gị, ikekwe gụnyekọta otu foto nke ezi na ụlọ gị n’ebe tempụl (ma ọ bụ lee Akwụkwọ Nka Ozi ọma, no. 120). I nweziri ike gụọ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 2 ma kesaara onye nibe ya echiche unu banyere ihe kpatara anyị ji nwee tempụl na ihe mere Nna nke Eluigwe si na-achọ ka ezi na ụlọ nọkọta ọnụ ruo ebighị ebi. Tulee ịgụkọ “Ezi na ụlọ niile Pụrụ Ịnọkọta Ruo Ebighị ebi” ọnụ (Akwụkwọ Abụ Ụmụ ntakịrị, 188). Kedụ ihe egwu nke a na-ekwu na anyị nwere ike ime iji nọnyere ezi na ụlọ anyị ruo ebighị ebi?
Ịmụ ihe banyere ndị nna nna m ha nwere ike iwetere m ọṅụ.
-
Ụmụntakịrị nwere ike nwee oke obi ụtọ banyere ma nwee ọṅụ nke agụgụala ezi na ụlọ. Iji nyere ha aka, i nwere ike kọọ akụkọ niile ma ọ bụ foto niile nke ndị nna nna gị ha. Gị na ụmụ gị kwuo okwu banyere otu ndụ dịbuuru maka ndị nna nna gị ha mgbe ha bụụrụ ụmụntakịrị. Ụmụ unu nwekwara ike nwee obi ụtọ n’ụfọdụ ihe omume agụgụala ezi na ụlọ na FamilySearch.org/discovery.