Ọgbakọ Zuru ọha
Dị Nnọọ Mma—Mara mma Dị Mfe
Ọgbakọ Zuru ọha Ọktoba 2021


13:10

Dị Nnọọ Mma—Mara mma Dị Mfe

Ka anyị debe oziọma n’ụzọ dị mfe dịka anyị n’ewekwasị onwe anyị ọrụ anyị ndị esi n’igwe họpụta.

Mmeghe

A na m enye ezigbo nnabata nye onye ọbụla n’ime unu soro n’ọgbakọ nkea.

Taa a tụrụ m anya ịkọwa mmewere abụọ nke oziọma nke Jizọs Kraịst eweghachitere, nke akụkọ na-akpali akpali sitere n’aka Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazụ gburugburu ụwa sotere nke n’egosi itinye ụkpụrụ ndịa n’ọrụ. Mmewere nke mbụ nke oziọma nke Jizọs Kraịst—ọrụ nke nzọpụta na mgbapụta nke Chineke—na-eleba anya n’ọrụ ndị esi n’igwe họpụta. Mmewere nke abụọ n’echetere anyị na ozi ọma ahụ dị larịị, dị oke ọnụ ahịa, ma dị mfe.

Ọrụ ndị Esi N’igwe Họpụta

I nata ndụ ebighị ebi, anyị garịrị a “bịakwute Kraịst, ma zuo oke na ya.”1 Dịka anyị na-abịakwute Kraịst ma nyere ndị ọzọ ime otu a, anyị n’esonye n’ọrụ nke nzọpụta na mgbapụta nke Chineke, nke n’eleba anya n’ọrụ ndị esi n’igwe họpụta.2 Ọrụ ndịa esi n’igwe họpụta na-adakọta onwe ha na ọtụghe niile nke ọkwa nchụaja eweghachitere site n’aka Moses, Elias, na Elijah, dịka edere na nkeji nke 110 nke Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile,3 na iwu nsọ nke abụọ kacha ukwuu enyere anyị site n’aka Jizọs Kraịst iji hụ onye agbata obi anyị n’anya dịka onwe anyị.4 A na ahụ ha n’ihu akwụkwọ abụọ nke mbụ emelitere nke Akwụkwọ ntuzi aka Zuruọha, enwere maka ndị otù niile.

Ọbụrụ na ịnụ okwu ndịa “Akwụkwọ ntuziaka Zuruọha” ma ọbụ “ọrụ ndị esi n’igwe họpụta” na-eme gị ịma jijiji n’egwu nke mgbagwoju anya, biko ekwela. Ọrụ ndịa dị mfe, nwee ike mmụọ nsọ, na-akpali akpali, ma kwe mmeta. Lee ha ebe a:

  1. Ibi oziọma nke Jizọs Kraịst

  2. Nlekọta maka ndị ahụ nọ na mkpa

  3. Ịkpọku ndị niile ịnata oziọma ahụ

  4. Ịdị n’otu ezi na ụlọ maka ebighị ebi

I nwere ike hụta ha dịka m si eme: dịka maapụ okporo ụzọ iji laghachiri Nna anyị nke Eluigwe dị ịhụnaanya.

Mmewere niile nke ọrụ nke nzọpụta na mbuli elu

Ozi ọma ahụ dị Larịị, Dị oke ọnụ ahịa, ma Dị mfe

Ekwuwo ya na ozi ọma nke Jizọs Kraịst “mara nnọọ mma ma dịrị mfe n’ụzọ mara mma.”5 Ụwa adịghị. Ọ gbara gharịị, dị mgbagwoju anya, ma jupụpta na enweghị ntụkwasị obi na esemokwu. A gọziri anyị dịka anyị na-akpachapụ anya ghara ikwe mgbagwoju anya, nke a na-ahụkarị n’ụwa, ịbanye n’ụzọ anyị si anata ma mee ozi ọma.

Onyeisi Dallin H. Oaks hụrụ na: “Akuziiri anyị ọtụtụ obere ihe dị mfe n’ime ozi ọma nke Jizọs Kraịst. Ekwesịrị icheteere anyị na na ngụkọta ọnụ oge ndị kacha mkpa, ihe obere ndịa ahụ nnọọ n’ewete na mmezu ihe ndị dị ukwuu.”6 Jizọs Kraịst N’onwe Ya na-akọwa na yok Ya dị mfe ma ibu Ya adịghị arọ.7 Anyị niile kwesịrị ịgbali debe ozi ọma ahụ mfe—n’ime ndụ anyị, n’ime ezi na ụlọ anyị niile, n’ime klas na kworum anyị niile, na n’ime ngalaba ukwu niile na stek anyị niile.

Dịka unu n’ege ntị n’akụkọ ndịa sotere m ga-akọrọ unu, mata na akpachapụrụ anya họrọ ha iji kpalie n’otu aka ma ji mata n’aka nke ọzọ. Omume nke Ndị nsọ Ụbọchi Ikpeazụ ndịa ọbụla na-abụrụ ihe ọmụmatụ nye onye ọbụla n’ime anyị na-itinye ozi ọma n’ụzọ dị mfe nghọta, dị oke mkpa, dị mfe mgbe a na-emezu otu n’ime ọrụ ndị esi n’igwe họpụta nke ekwuru.

Ibi Ozi ọma nke Jizọs Kraịst

Ibi oziọma nke Jizọs Kraịst Jens nke Denmark na-ekpe ekpere kwa ụbọchi ibi ozi ọma ma mata nkpalite niile nke Mmụọ Nsọ. Ọ mụtawo ime ihe ọsọọsọ mgbe ọ na-eche na Mmụọ ahụ na-eduzi ya.

Jens nke Denmark

Jens kesara ihe ndịa sotere:

“Anyị bi na ọmarịcha, mpempe, ụlọ ọkara osisi osisi nke nwere akịrịka elu ụlọ, dị n’etiti ime obodo mara mma, dị nsonso na ọdọ mmiri nke ime obodo ahụ.

Ọmarịcha obodo
Ọdọ mmiri obodo

N’abalị nkea na ihu igwe Danish kachasị maa mma amaara ama, ọnụ ụzọ niile na mgbupu niile gheoghe, ma ihe niile na-eku ume udo ma da jụọ. N’ihi ogologo abalị summer dị ihè n’ụzọ dị ebube, ọ dịbeghị m ọsọọsọ ịgbanwe ọkụ bọb nwụrụ anwụ dị n’ime ụlọ ngwa ọrụ.

Ọkụ ime ụlọ ngwa ọrụ

“Na mberede, e nwetere m oke mmetụta na m kwesịrịrịị ịgbanwe ya n’egbughị oge! N’otu oge ahụ kwa, a nụrụ m nwunye m, Mariann, kpọọ m na ụmụaka isa aka anyị n’ihi na nri abali adịwo!

Alụwo m nwunye kemgbe ịmara na ugbua a abụghị oge ime ihe ọbụla ọzọ karịa isa aka m, kama a nụrụ m onwe m ka m kpọrọ Mariann na m ga nnọọ aga n’ebe ụlọ ahịa ịzụ ọkụ bọb. E nwetere m mmetụta siri ike ịpụ n’egbughị oge.

Ụlọ ahịa nri nọọrọ naanị n’aka nke ọzọ nke ọdọ mmiri ahụ. Anyị naara ejikarị ụkwụ aga, mana taa a gbara m igwe m. Mgbe m naara agbafe ọdọ mmiri ahụ, site n’akụkụ anya m a hụtara m otu obere nwata nwoke, gbara ihe dịka afọ abụọ, na-aga ije naanị ya n’akụkụ ọnụ ọdọ mmiri ahụ, dị ezigbo nso na mmiri ahụ—na ntabi anya ọ dabanyere nime! N’otu nkeji ọ nọ n’ebe ahụ—ma na nke ọzọ ọ laa!

“Enwebeghị onye hụrụ nkea mere kama mụ. A tụpụrụ m igwe m n’ala, gbaa ọsọ, ma mụbanye n’ime ọdọ mmiri ahụ n’eru n’ukwu. N’egbughị oge ahịhịa ọbọgwụ bịara kpuchie elu mmiri ahụ, nke mere ya araa ahụ ịhụta ụzọ na mmiri ahụ. Mgbe ahụ mụ enwe mmetụta mmegharị n’otu akụkụ. Etinyere m aka m n’ime mmiri, jigide otu T-shirt, ma dọpụta obere nwa nwoke ahụ. O bidoro iku ume, ịkwa ụkwara, na ibe akwa. N’oge n’adịghị anya nwa nwoke ahụ na ndị nne na nna ya jikọghachiri.

Jens na ezinụlọ

Dịka nwanne nwoke Jens na-ekpe ekpere ụtụtụ ọbụla maka enyem aka ịmata nkpali niile sitere na Mmụọ Nsọ, ọbụna ihe na-anaghị eme ọtụtụ mgbe dịka ịgbanwe ọkụ bọb n’egbughị oge, ọ nakwa ekpe ekpere na e nwere ike mee ya ngwa ọrụ iji gọzie ụmụ nke Chineke. Jens n’ebi ozi ọma site n’ịchọ ntụzi aka ụbọchi ọbụla, n’agbalịsike itozu oke, emesịa ime nke ya kachasị mma iji soro ntụzi aka ahụ mgbe ọ bịara.

Nlekọta maka Ndị Ahụ nọ na Mkpa

N’ebe a bụ otu ọmụmaatụ nke ilekọta ndị nọ na mkpa. Otu ụbọchi otu onyeisi stek dị n’ime Stek Cúcuta na Onyeisi Ndịinyom Nta na Stek ahụ gara leta ndịinyom nta abụọ—na nwanne ha nwoke dị afọ iri na ụma tọrọ ha—ndị naara agabiga ụfọdụ ndọli ndị siri ike. Na nso nso a nna ha nwụrụ, ma nne ha anwụwo otu afọ gara aga. Ụmụnne atọ ahụ ugbua nọọrọ naanị ha n’ime ntakịrị ụlọ ahụ dị jụụ. Mgbidi ya ka eji osisi nkụ na akpa plastik rụọ, elu ụlọ ahụ akpara akpa kpuchiri naanị mpaghara ebe ha na-arahụ ụra.

N’isote nleta ha, ndị ndu ndịa maara na kwesịrị inye aka. Site na kansụl ngalaba ukwu ahụ, atụmatụ iji nyere ha aka malitere ịpụta. Ndị ndu ngalaba ukwu na stek—Otù Enyem aka, kworum ndị okenye, Ndị Ikom Nta, Ndị Inyom Nta—na ọtụtụ ezi na ụlọ ha niile tinyere onwe ha n’ọrụ ahụ nke ịgọzi ezi na ụlọ ahụ.

Ụlọ a na-ewu ewu
Ụlọ a na-ewu ewu

Otù niile nke ngalaba ukwu ahụ kpọtụụrụ ọtụtụ ndị otù ngalaba ukwu ndị na-arụ ọrụ n’ihe owuwu. Ụfọdụ nyere aka na mmewe, ndị ọzọ nyere onyinye oge na aka ọrụ, ndị ọzọ siri nri, nakwa ndị ọzọ nyere onyinye ihe ndị achọrọ.

Ebe obibi emezichara

Mgbe arụsịrị obere ụlọ, ọ bụ ụbọchi jupụtara n’ọńụ nye ndị ahụ nyere aka ma nye ndị otù atọ nke ngalaba ukwu ahụ. Ụmụ mbịị ndịa nwetere mmetụta mkpom ọkụ na adị na mma na-emesi obi ike nke ezi na ụlọ ngalaba ukwu ha ịmara na ha anọghị naanị ha ma na Chineke nọ n’ebe ahụ maka ha mgbe niile. Ndị ahụ kpọtụrụ nwetere mmetụta ịhụnaanya nke Onye Nzọpụta maka ezi na ụlọ nkea ma rụọ ọrụ dịka aka Ya n’ijere ha ozi.

Ịkpọku Ndị niile Ịnata Ozi ọma ahụ

E chere m na ị ga-ańụrị ọńụ na ọmụmaatụ nkea nke ikpọku ndị niile ịnata oziọma ahụ. Cleiton nke Cape Verde gbara afo Iri na Asaa amaghị ihe ga-eme n’ihi ịbanye n’ime klas seminary ngalaba ukwu ya otu ụbọchi. Mana ndụ ya na ndụ nke ndị ọzọ ga-agbanwe ruo mgbe ebighị ebi n’ihi na ọ bara.

Cleiton, ya na nne ya na nwanne ya nwoke okenye, ka emeworo baptizim n’ime Nzukọ nsọ n’oge mbụ, ma n’agbanyeghị ezi na ụlọ ya kwụsịrị ịbịa. Naanị otu omume ya ịbịa seminary ga-egosi ịbụ ihe njikọ maka ezi na ụlọ ahụ.

Ndị ntoroọbịa n’ime klas seminary ahụ nweere obi ọma ma dị nnabata. Ha mere Cleiton enwee mmetụta ụlọ ma gbaa ya ume ịbịa ihe omume ọzọ. O mere otu ahụ ma n’eteghị anya malite ịbịa nzukọ ya ndị ọzọ nke Nzukọ nsọ. Otu bishọp nwere amamihe hụrụ ike mmepụta ime mmụọ n’ime Cleiton ma kpọkuo ya ịbụrụ onye nnyem aka ya. “Site n’oge ahụ gawa,” ka Bishọp Cruz kwuru, “Cleiton bụrụziri ihe ọmụmaatụ na ike onwunwe nye ndị nta ndị ọzọ.”

Onye mbụ Cleiton kpọghachiri na nzukọ nsọ bụ nne ya, emesịa nwanne ya nwoke ukwu. O mesịrị gbatịa okirikiri ya ruo ndị enyi. Otu n’ime ndị enyi ahụ bụ otu nwoke ebiri ya, Wilson. Nzukọ nke mbụ ya na ndị mgbasa ozi ọma, Wilson kwupụtara ọchịchọ ya ime baptizim. Ọ masịrị ma tụọ ndị mgbasa ozi ọma anya n’ole Cleiton gwawooro Wilson.

Ndịikom Nta dị n’ime Cape Verde
Ikpọku ndị ọzọ ịbịa nzukọ nsọ
Otu ndị ntoroọbịa dị ike n’ọrụ n’eto eto

Mgbali Cleiton akwụsịghị ebe ahụ. O nyeere ndị otu ọzọ dara mba n’ọrụ aka laghachi, na mgbakwunye ikesa ozi ọma nye ndị enyi nke okpukperechi ọzọ. Taa ngalaba ukwu ahụ nwere ndị ntotoọbịa 35 kwusiri ike n’ọrụ, nwee atụmatụ seminary na-eme nke ọma, nnukwu ekele dịrị mgbalị Cleiton inwe ịhụnaanya, ikesa, na ịkpọku. Cleiton, na nwanne ya nwoke ukwu, Cléber, ha abụọ na-akwado ije ozi mishọn n’uju oge.

Ịdị n’otu Ezi na ụlọ maka Ebighị ebi

N’ikpeazụ, ka m kesaa otu ọmarịcha ọmụmaatụ nke ịdị n’otu ezi na ụlọ maka ebighị ebi. Lydia sitere na Kharkiv, Ukraine, na mbụ mụtara banyere tempụl site n’aka ndị mgbasa ozi ọma. Ozugbo, Lydia nwetere mmetụta ọchịchọ siri ike ịga tempụl, ma mgbe baptizim ya gasịrị, ọ malitere nkwado ịnata rekọmend tempụl.

Lydia gara Tempụl Freiberg Germany ịnata onyinye dị nsọ ya ma emesịa nọrọ ọtụtụ ụbọchi na-eme ọrụ nnọchite anya n’ebe ahụ. N’isote ido nsọ nke Tempụl Kyiv Ukraine, Lydia gara tempụl mgbe niile. Ya na di ya, Anatoly, ka arachiri mgbe ebighị ebi n’ebe ahụ ma emesịa akpọọ ha ije ozi dịka ndị mgbasa ozi ọma nke tempụl. Ha abụọ achọtawo karịa aha 15,000 nke ndị nna nna ma arụwo ọrụ inwete emume nsọ maka ha.

Di na nwunye Ndị Ukraine nọ na tempụl

Mgbe ajụrụ banyere mmetụta ya gbasara ọrụ tempụl, Lydia na-ekwu sị, “Gịnị ka natara n’ime tempụl? Emewo m ọgbụgba ndụ ọhụrụ mụ na Chineke. Ọgbụgba ama m enwetewo mgbam ume. A mụtawom ịnata mkpugbe nke onwe. E nwere m ike ime emume nsọ nzọpụta maka ndị nna nna nwụrụ anwụ. Ma enwere m ike inwe ịhụnaanya ma jeere ndị ọzọ ozi. O ji ezi nkwupụta nkea mechie: “Onyenwe anyị chọrọ ịhụ anyị na tempụl ọtụtụ mgbe.”

Mmechi

Ịma mma nke Ndị nsọ Ụbọchi Ikpeazụ ndịa kpaliri m, nke ọbụla jiri nzulite dịgasị iche iche, nke dabeere n’akụkọ anọ ndịa. Ọtụtụ ka enwere ike ịmụta site n’ihe mpụtara dị ebube nke bịara site ntinye n’ọrụ dị mfe ụkpụrụ niile nke ozi ọma dị mfe. Ihe niile ha mere nọkwa n’ime ike anyị.

Ka anyị debe ozi ọma ahụ mfe dịka anyị n’ebukwasị onwe anyị ọrụ ndị esi n’igwe họpụta: Iji bie ndụ ozi ọma nke Jizọs Kraịst iji nwee mmetụta na mkpali, dịka Jens dị n’ime Denmark nwere. I lekọta ndị nọ na mkpadịka egosipụtara site n’aka ndị otù nke stek Cúcuta dị n’ime Colombia n’iwete ebe obibi nye ụmụ mbịị ngalaba ukwu ahụ. I kpọku ndị niile ịnata ozi ọma ahụ, n’ụzọ nke Cleiton sitere na Mba African island nke Cape Verde mere na ndị enyi na ezi na ụlọ ya. N’ikpeazụ, i kpọkọta ezi na ụlọ maka ebighị ebi, dịka Nwanne nwanyị Lydia sitere na Ukraine mara atụ site na emume nsọ tempụl nke onwe ya, mgbalị agụgụala ezi na ụlọ, na ije ozi n’ime tempụl.

Imme otu a n’ezie ga-ewete udo na ọńụ. Maka nkea a na m ekwe nkwa na-agba ama—na nke Jizọs Kraịst dịka Onye Nzọpụta anyị na Onye Mgbapụta anyị—n’aha nke Jizọs Kraịst, amen.

Hụba-ama

  1. Moronaị 10:32.

  2. Lee Akwụkwọ ntụzi aka Zuruọha: Ije ozi na Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazu a,, 1.2, ChurchofJesusChrist.org.

  3. Lee Ozizi na Ogbụgba ndụ niile 110:11–16. Lee kwa Dallin H. Oaks, “The Melchizedek Priesthood and the Keys,” Liahona, Me 2020, 70: “Nisote ido nsọ nke tempụl nke mbụ nke agba nkea nime Kirtland, Ohio, ndị amụma atọ—Moses, Elias, na Elijah—weghachitere ‘ọtụghe niile nke agba nkea,’ tinyekọtara ọtụghe niile gbasara mkpokọta nke Isreal na ọrụ nke tempụl niile nke Onyenwe anyị.” Lee kwa Quentin L. Cook, “Kwadoo Izute Chineke,” Liahona, Me 2018, 114: “Ndị amụma mgbe oche weghachitere ọtụghe niile nke ọkwa nchụaja maka emume nzọpụta ebighị ebi nke oziọma nke Jizọs Kraịst. … Ọtụghe ndịa niile n’ewete ‘ike si n’elu’ [Ozizi na Ogbụgba ndụ niile 38:38] maka ọrụ ndị esi n’igwe họpụta nke mejupụtara isi ebumnuche nke Nzukọ nsọ.”

  4. Lee Matiu 22:36-40.

  5. Nime Matthew Cowley Na-ekwu: Okwu niile nke Okenye Matthew Cowley nke Kworum Ndị Ozi nke Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazu a (1954), xii.

  6. Dallin H. Oaks, “Ihe ndị Dị Ntakiri ma Dị mfe,” Liahona, Me 2018, 89.

  7. Lee Matiu 11:30.