Ọgbakọ Zuru ọha
Okwukwe iji Jụọ ma Mgbe ahụ Mee
Ọgbakọ Zuru ọha Ọktoba 2021


Okwukwe iji Jụọ ma Mgbe ahụ Mee

Okwukwe n’ime Jizọs Kraịst bụ ọtụghe-ụzọ nye ịnata mkpughe niile nke eziokwu.

Ụmụnne nwoke na ụmụnne nwanyị m hụrụ naanya, enwere m obi ekele maka ohere nke ikwuru unu okwu na nzukọ nke mgbede Satọde nke nzukọ zuru ọha nke a. Na ndubata ya n’ọgbakọ nke a na ụtụtụ a, Onyeisi Russell M. Nelson sịrị na “mkpughe n’enweghị ntụpọ maka ajụjụ ndị nọ nime obi unu ga eme ọgbakọ nke a bụrụ ịgba na ihe agaghị echefu echefu.” Ọbụrụ na ị chọbeghị maka ije ozi nke Mmụọ Nsọ inyere unu aka ịnụta ihe Onyenwe anyị ga achọ ka unu nụ nime ụbọchị abụọ ndịa, A na m asị ka unu mee otua ugbua.”1 A chọọla m ngọzi ahụ dịka m kwadoro ịnata mkpughe maka nnọkọ mụ na unu nke a. Ekpere si na obi m bụ na unu ga anata mkpughe site n’aka Chineke.

Ụzọ ahụ eji anata mkpughe site n’aka Chineke agbanwebeghị site na ụbọchị niile nke Adam na Iv. Ọ bụ otu ihe maka ndị odibo niile nke Onyenwe anyị kpọrọ site na mbido ruo taa. Ọ bụ otu ihe ahụ maka mụ na gị. A na eme ya mgbe niile site na itinye okwukwe n’ọrụ.2

Josef Smit gbara afọ iri na ụma nwere okwukwe zuru oke ịjụ Chineke ajụjụ, kwenye na Chineke ga-aza mkpa si n’obi ya. Azịza ahụ bịara gbanwere ụwa. Ọ chọbụrụ ịma nzukọ-nsọ nke ọ ga eso iji sachapụ mmehie ya. Azịza ọ natara gbara ya ume ịnọgide na ajụ ajụjụ ndị ọzọ ka mma ma jiri mkpughe ndị ọ nọ na-enweta n’arụ ọrụ.3

Nhụmihe unu nwere ike dị otu a nime ọgbakọ nke a. Unu nwere ajụjụ ndị unu chọrọ azịza ha. Unu nwere okwukwe zuru inwe olile anya na unu ga anata azịza niile site n’aka Onyenwe anyị site na ndị odibo Ya.4 Unu agaghị enwe ohere ịjụ ndị kwuru okwu ajụjụ a na-anụ anụ maka azịza, kama unu nwere ike jụọ Nna unu hụrụ nanya nime ekpere.

A mara m site na nhụmihe na azịza niile ga abịa imezi mkpa unu na nkwado ime mmụọ unu. Ọ bụrụ na ịchọrọ azịza dị mkpa nye ọdịmma ebighị ebi unu ma ọbụ nke ndị ọzọ, azịza ahụ kwesịrị ịbịa. Agbenyeghị ọbụnadị mgbe ahụ, unu nwere ike nata—dịka Josef Smit natara—azịza nke inwe ndidi.5

Ọ bụrụ na okwukwe unu nime Jizọs Kraịst emela Ka obi unu dị nrọ site na mmetụta nke Aja mgbaghara mmehie Ya, unu ga adị na njikere karịa inwe mmetụta ntaka ụka niile nke Mmụọ ahụ nime azịza nye ekpere unu. Nhụmihe nke m bụ na olu dị nwayọ, dịkwa ntakịrị— doro anya— ma kwe nkọwa nime uche m mgbe m nwere obi udo na nrube-isi nye uche nke Onyenwe anyị. Mmetụta ahụ nke ịdị umeala bụ ihe enwere ike kọwa dịka “N’abụghị uche nke m, kama nke gị, ga eme.”6

Usoro mkpughe nke a bụ ihe mere unu ga eji nụ ka ndị ga-ekwu okwu nime ọgbakọ nke a nye nkuzi a na akpọ ozizi nke Kraịst.7 Mkpughe na abịakwute anyị na ụdị anyị jirila chọọ iwere ozizi nke Kraịst tinye nime obi anyị ma tinye ya n’ọrụ nime ndụ anyị.

Unu chetara na site na Akwụkwọ nke Mọmọn na Nifaị kuziri anyị na inwe okwukwe nime Jizọs Kraịst bụ ọtụghe ụzọ ahụ nye ịnata mkpughe niile nke eziokwu ma bụrụ ọtụgha-ụzọ nye inwe obi ike na anyị na eso ụzọ nke Onye nzọpụta. Nifaị dere mkpụrụ okwu ndị a n’eso ọtụtụ afọ tupu ọmụmụ nke Jizọs Kraịst n’ụwa:

“Ndị mmụọ-ozi na-ekwu okwu site n’ike nke Mmụọ Nsọ; ya mere, ha na-ekwu okwu niile nke Kraịst. Ya mere, a gwara m unu, n’eri nụ oriri n’elu okwu niile nke Kraịst; n’ihi na lee, okwu niile nke Kraịst ga-agwa unu ihe niile unu kwesịrị ime.

“Ya mere, ugbua mgbe m kwusịworo okwu ndị a, ọbụrụ na unu enweghị ike ịghọta ha ọ ga-abụ n’ihi na unu ajụghị ajụjụ, ọbụghị ma unu kụrụ aka; ya mere, ewebataghị unu n’ime ìhè ahụ, mana unu ga-alarịrị n’iyi n’ọchịchịrị.

“N’ihi na lee, ọzọ a sị m unu na ọbụrụ na unu ga-abata site n’ụzọ ahụ, ma nata Mmụọ Nsọ ahụ, ọ ga egosị unu ihe niile unu kwesịrị ime.

“Lee, nke a bụ ozizi nke Kraịst, ma agaghị enwe kwa ozizi ọzọ a ga-enye wee ruo mgbe o gosịpụtaworo onwe ya nye unu n’anụ arụ. Ma mgbe ọ ga egosịpụta onwe ya nye unu n’anụ ahụ, ihe niile ọ ga-agwa unu ka unu ga na-eleru anya na-eme.”8

Onyenwe anyị ga-ekwu ọtụtụ ihe site na ndị odibo Ya nye anyị taa ma ụbọchị niile ndị na abịa. Ọ ga agwa anyị ihe ndị anyị kwesịrị ime.9 Onye nzọpụta agaghị eti mkpu nye mụ na unu. Dịka Ọ kuziiri Elijah:

“Ma ọ sị, Gaa n’ihu, ma guzo na ugwu n’ihu Onyenwe anyị. Ma, lee, Onyenwe anyị gafere, ma oke ifufe dị ike na-agbawakwa ugwu niile, na etịpịakwa nkume dị elu niile n’ihu Onyenwe anyị; kama Onyenwe anyị anọghị na ifufe ahụ: ma mgbe ifufe gasịrị alaọma jijiji mara; ma Onyenwe anyị anọghị n’alaọma jijiji ahụ:

“Ma mgbe alaọma jijiji gasịrị okụ wee dị; kama Onyenwe anyị anọghị na ọkụ ahụ: ma mgbe ọkụ gasịrị olu nke dị ezi nwayọ dị nta dara.”10

Ịnụ olu ahụ ga abia site na okwukwe anyị n’ime Ya. Mgbe anyị nwere okwukwe zuru oke, anyị ga achọ ntuzi aka buru na obi ịga ma mee ihe ọbụla O kwuru.11 Mgbe ahụ anyị enweworị okwukwe ịmara na ihe ọbụla O kwuru ga agọzi ndị ọzọ ma anyị nwere ike nwee nsacha n’ime usoro ahụ maka ịhụnanya Ya ebe anyị nọ.

Dịka okwukwe anyị nime Jizọs Kraịst garala edu anyị ịjụ Nna maka azịza niile, okwukwe ahụ gakwa ewetere anyị mmetụ aka dị nro nke Onye nzọpụta nke ga eme ka anyị nụ ntụzi aka Ya ma nọrọ na njikere na obi ụtọ irube isi. Mgbe ahụ ka anyị ga eji ọńụ gụọ mkpụrụ okwu niiile nke abụ, ọbụna mgbe ọrụ ahụ siri ike: “Ọrụ ahụ dị ụtọ, Chineke m, Eze m.”12

Ka ozizi nke Kraịst na abawanye n’ime ndụ na obi anyị, ka anyị na enwe ịhụnanya na ọmịiko karịa maka ndị ahụ na-enwetụbeghị ngọzi nke okwukwe nime Jizọs Kraịst ma ọbụ na agba mbọ ijigide ya. O siri ike idobe iwu nsọ niile nke Onyenwe anyị mgbe anyị enweghị okwukwe na ntụkwasị obi n’ime Ya. Dịka ụfọdụ na adapụ na okwukwe nime Onye nzọpụta ahụ, ha nwere ike nupu isi nye ndụmọdụ Ya, na akpọ ihe dị mma njọ ma njọ mma.13 Ị gbanarị ọdachi amaghị-eme nke a, ọ dị mkpa na mkpughe nke onwe anyị natara nọ na usoro nke nkuzi niile nke Onyenwe anyị na ndị amụma Ya.

Ụmụnne nwoke na ụmụnne nwanyị, ọ na ewere okwukwe irube isi nye iwu nsọ niile nke Onyenwe anyị. Ọ na ewere okwukwe nime Jizọs Kraịst ijere ndị ọzọ ozi maka Ya. Ọ na ewere okwukwe ị ga kuzie oziọma Ya ma kwusara ya nye ndị mmadụ na enweghị ike nwee mmetụta olu nke Mmụọ ma-ọbụ nwere ike gọnarị eziokwu nke ozi ahụ. Kama dịka anyị na etinye okwukwe anyị nime Kraịst na ọrụ—ma soro onye amụma Ya dị ndụ—okwukwe ga abawanye n’ụwa niile. Nihi teknụzụ, enwere ike ụmụ karịrị-akarị nke Chineke ga anụ ma mata okwu nke Chineke na ngwụsị izu ụka a karịa ụbọchị abụọ ọzọ nime agụgụala.

Site na okwukwe na-abawanye na nke a bụ Nzukọ-nsọ na Alaeze nke Onyenwe anyị n’ụwa, ndị otu karịrị-akarị na akwụ otu ụzọ na ụzọ iri ma nye ego iji nyere ndị nwere mkpa aka, ọbụna dị ka ndị otu ahụ na-ezute onwụnwa ndị nke ha. Ijiri okwukwe na akpọrọ ha site n’aka Jizọs Kraịst, ndị mgbasa oziọma na gburugburu ụwa achọtawo ụzọ niile imeri aka mgba niile nke ọrịa mkpochapụ butere, were mgbam ume na obi ọma na-eme ya. Ma na itinye uchu ha karịa, okwukwe ha esikwuola ike.

Mmegide na ọnwụnwa niile dị mbụ bụrụ ebe ọzụzụ maka otito nke okwukwe. Nke ahụ bụ eziokwu kemgbe ụwa, nke ka nke ka mgbe mbido nke Mweghachite na nhiwe nke Nzukọ nsọ nke Onyenwe anyị.14

Ihe Onyeisi George Q. Cannon kwuru ọtụtụ oge gara aga bụ eziokwu taa ma ga abụ ruo mgbe Onye nzọpụta ga abịa na onwe ya idu Nzukọ-nsọ Ya na ndị Ya: “Irube isi nye Oziọma na eme [mmadụ] na Onyenwe anyị inwe mmekọrịta siri ike. Ọ na ehiwe mmekọrịta siri ike n’etiti ndị mmadụ nọ n’ụwa na Oke Onye okike anyị n’ime eluigwe niile. Ọ na ewetara obi mmadụ mmetụta nke ntụkwasị obi zuru-oke nime Onye Pụrụ Ime Ihe Niile na ịdị na njikere Ya ige ntị nye ma zaa ekpere nke ndị tụkwasịrị obi na Ya. N’ime oge nke mnwale na ihe isi ike ntụkwasị obi nke a bụ nke ego apụghị ịzụta. Nsogbu nwere ike dakwasị mmadụ ma ọbụ ndị mmadụ, mmekpa-ahụ nwere ike bịa ma yie ka e meriwo olile anya nke mmadụ, agbanyeghị, ebe [ndị mmadụ] nwere ohere inweta oke niile nke irube isi nye Oziọma n’eweta, ha nwere ebe nguzo kara-aká; ụkwụ ha guzoro n’elu nkume n’enweghị ike ịkwapụ.”15

Ọ bụ ịgba-ama m na nkume ahụ anyị guzoro bụ akaebe anyị na Jizọs bụ Kraịst ahụ; na nke a bụ Nzukọ nsọ Ya, nke Ọ na edu na onwe Ya; ma na Onyeisi Russell M. Nelson bụ onye amụma Ya dị ndụ taa.

Onyeisi Nelson na achọ ma na anata ntụzi aka site n’aka Onyenwe anyị. Ọ bụ na anya m ihe eji ama atụ nke ịchọ ntuzi aka ahụ na mkpebi isoro ya. Otu ụdị mkpebi ahụ nke irube isi nye ntụzi aka nke Onyenwe anyị nọ n’ime obi ndị ahụ kwuworo okwu ma ọbụ ga ekwu okwu, ga-ekpe ekpere, ma ọbụ ga-agụ abụ n’ime ọgbakọ zuruọha nke Nzukọ nsọ Ya nke a.

A na m ekpe ekpere na ndị ahụ nọ na gburugburu ụwa na-ele anya ma ọbụ na ege ntị nye ọgbakọ nke a ga enwe mmetụta nke ịhụnaanya nke Onyenwe anyị nwere na-ebe ha nọ. Nna nke Eluigwe azawo ekpere m na m nwere ike nwee mmetụta nke opekata mpe ntakịrị akụkụ nke ịhụnaanya nke Onye nzọpụta maka unu na ịhụnaanya Ya maka Nna Ya nke Eluigwe, onye bụ Nna anyị nke Eluigwe.

A na m agba akaebe na Jizọs Kraịst dị ndụ. Ọ bụ Onye Nzọpụta anyị na Onye Mgbapụta anyị. Nke a bụ Nzukọ nsọ Ya. Ọ nọ n’isi ya. Ya, na Nna Ya nke Eluigwe, pụtara n’onwe ha nye Josef Smith n’ime ọdọ osisi nọ na New York. Oziọma nke Jizọs Kraịst na ọkwa nchụaja Ya ka eweghachitere site n’aka ndị ozi nke eluigwe.16 Site nʼike nke Mmụọ Nsọ, A ma m na ọ bụ eziokwu.

A na m ekpe ekpere ka unu nwee otu ụdị aka-ebe ahụ. A na m ekpe ekpere na unu ga arịọ Nna nke Eluigwe maka okwukwe n’ime Jizọs Kraịst unu chọrọ iji mee ma dobe ọgbụgba-ndụ niile ga eme ka Mmụọ Nsọ ahụ bụrụ onye nsiso unu mgbe ọbụla. A na m ahapụrụ unu ịhụnaanya m na akaebe m na aha dị nsọ nke Jizọs Kraịst, amen.

Bipụta