Ọgbakọ Zuru ọha
Udo nke Kraịst Emechiwo Iro
Ọgbakọ Zuru ọha Ọktoba 2021


Udo nke Kraịst Emechiwo Iro

Mgbe ịhụnaanya nke Kraịst kpuchigidere ndụ anyị, anyị na-eji ịdị nwayọọ n’obi, ndidi, na obi ọma ezute nghọtahie.

Ezi ụmụnne m ndị nwoke na ndị nwanyị, n’oge mnwale nsogbu ahụike, ọrụ obi nwere ịrụ na-abawanye. Obi niile ndị ahụ ije ije na-adịrị mfe ka ọ nwere ike ị rara ahụ ị gba ọsọ gbagoo elu ugwu. N’ụzọ dị otu a, mnwale ahụike nke obi nwere ike kpughee ọrịa zoro ezo nke na-apụtabeghị ihe. Nsogbu ọbụla a chọpụtara ka enwere ike ịgwọ mgbe ahụ tupu ha ebute oke nsogbu n’ụbọchị ndụ niile.

Ọrịa mkpochapụ nke COVID-19 na-ezia abụrụwo mnwale ahụike nke obi zuru ụwa! Mnwale ahụ egosịwo mpụtara gwara ọgwa. E mepụtawo ọgwụ mgbochi n’adịghị egbu egbu ma n’arụ ọrụ.1 Ndị ọkacha mara n’okwu ahụ ike, ndị nkuzi, ndị na-enye nlekọta, na ndị ọzọ a chụwo aja eji mara dike—ma gaaniihu ịdị na-eme otu a. Ọtụtụ ndị mmadụ egosịwo nnyepụ aka na obi ọma—ma nọgide ime otu ahụ. Mana, ọghọm ndị zoro ezo a pụtawo ihe. Ndị na-esighị ike ihe na-emetụtakarị atawo ahụhụ—ma nọgide ime otu ahụ. Ndị ahụ na-arụ ọrụ ịhụ maka ịmegide ahaghị otu ndị a zoro ezo ka e kwesịrị ịgba ume ma nye ekele.

Ọrịa mkpochapụ ahụ bụkwa nnwale ahuike nke obi nke ime mmụọ maka Nzukọ nsọ nke Onye Nzọpụta na ndị otù ya. Mpụtara ya niile jikwa otu a gwakọta ọnụ. Ndụ anyị a bụrụwo ihe a gọziri agọzi site na ije ozi n’ụzọ kacha dị elu na ụzọ kacha dị nsọ,”2 na Bịanụ, Soro M usoro ọmụmụ ihe, na ọmụmụ ozi ọma hiwere isi n’ebe obibi, nke Nzukọ nsọ kwadoro. Ọtụtụ enyewo enyem aka ọmịiko na nkasi obi n’oge ihe isi ike ndị a ma nọgide ime otu ahụ.3

Mana, niime ụfọdụ ọnọdụ, nnwale nsogbu nke ime mmụọ egosịwo ụmara ndị na-eduba na-esemokwu na nkewasị. Nke a na-atụnye uche na anyị nwere ọrụ ịrụ iji gbanwee obi anyị ma bụrụ ndị e jikọrọ ọnụ dị ka ezigbo ndị na-eso ụzọ nke Onye Nzọpụta. Nke a abụghị ihe aka mgba dị ọhụụ, kama ọ bụ nke dị oke mkpa.4

Mgbe Onye Nzọpụta gara leta ndị Nifaị, Ọ kuziri, “Agaghị enwe arụmarụ ụka ọbụla na-etiti unu. … Onye nke nwere mmụọ nke esemokwu abụghị onye nke m, kama ọ bụ nke ekwensu, onye bụ nna nke esemokwu, ma ọ na-akpalite obi ndị mmadụ iji iwe see okwu, otu onye na ibe ya.”5 Mgbe anyị sesuru onye na ibe ya okwu n’iwe, Setan na-amụ amụ ma Chineke nke eluigwe na-ebe akwa.6

Setan na-amụ amụ ma Chineke na-ebe akwa ma opekata mpe nihi ihe abụọ. Nke mbụ, esemokwu na-eme ka aka ebe niile anyị na-agba nye ụwa banyere Jizọs Kraịst na mgbapụta ahụ na-abịa site na “ọnọdụ ọma kwesịrị ụgwọ ọrụ Ya, …ebere Ya, na amara Ya nyụọ nkọ.”7 Onye Nzọpụta sịrị: “Iwu nsọ ọhụrụ ka m na-enye unu. Ka unu hụ onye na ibe ya naanya. … “Site otua ka mmadụ niile si amata na unu bụ ndi na eso ụzọ m, ọbụrụ na unu nwee ịhụnaanya onye ọbụla nime unu.”8 Ntụgharị ahụ bụkwa ezi okwu—mmadụ niile maara na anyị a bụghị ndị na-eso ụzọ Ya mgbe anyị na-anaghị egosi ịhụnaanya nye onye ọbụla na ibe ya. Ọrụ Ya nke ụbọchị ikpeazụ na-abụ ihe a gwarụrụ aka mgbe esemokwu ma ọ bụ iro9 dapụtara n’etiti ndị na-eso ụzọ Ya.10 Nke abụọ, esemokwu anaghị enye ahụ ike nke ime mmụọ maka anyị dị ka ndị mmadụ. A na-anapụ anyị udo, ọńụ, na ezumiike, ma ike nke anyị inwe mmetụta nke Mmụọ ahụ gwarụrụ aka.

Jizọs Kraịst kọwara na ozizi Ya abụghị ịkpasu obi ndị mmadụ iwe, otu onye megide ibe ya; kama [na ozizi Ya] [bụ] na a ga-akwụsị ụdị ihe ndị ahụ.”11 Ọ bụrụ na ọ dị m ọkụọkụ iwe iwe ma ọ bụ zaghachi na uche obi dị iche iche site na-iwe iwe ma ọ bụ ịta ụta, a “dawo” m nnwale nke ime mmụọ ahụ. Nnwale nke a adara apụtaghị na m enweghị olileanya. Kama, ọ na-arụtụ aka na m kwesịrị ịgbanwe. Ma ọdịmma ịmata nke a.

Mgbe Onye Nzọpụta gachara leta ndị Amerika, ndị ahụ bụụrụ ndị ejikọtara ọnụ; “e nweghị esemokwu nʼala ahụ nile.”12 I chere na ndị ahụ ka ejikọtara ọnụ niihi na ha niile bụ otu ihe ahụ, ka ọ bụ niihi na ha enweghị ihe ndị dị iche iche na uche obi ha. E kweteghị m. Kama, esemokwu na iro riri mbọ mbọ niihi na ha jiri ozi ịbụ ndị na-eso ụzọ nke Onye Nzọpụta kporo ihu karịsịa ihe ndị ọzọ. Ịkpa iche iche ha belatara nke ukwuu ma atụnyere ya na ịhụnaanya nke Onye Nzọpụta ha nwere n’etiti ha, ma ha jikọtara ọnụ dị ka “ndị nketa oke alaeze nke Chineke.”13 Ihe si na ya pụta bụ na “na e nweghị ike inweta ndị nwere an̄ụrị karịa … bụ ndị e keworo site nʼaka nke Chineke.”14

Ịdị n’otu chọrọ ịgba mbọ.15 Ọ na-etolite mgbe anyị tinyere ịhụnaanya nke Chineke niime obi anyị16 ma tụkwasị obi na-akaraka anyị dị ebighị ebi.17 Anyị bụ ndị ejikọtara ọnụ site na isi njirimara anyị zuruoke, dị ka ụmụ Chineke18 na mkpebi anyị nye ezi okwu niile gbasara ozi ọma eweghachitere. Niihi ya, ịhụnaanya nke anyị nwere n’ebe Chineke nọ na ije ozi anyị dị ka ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst na-ebute ezi mmetụta maka ndị ọzọ. Anyị jiri kpọrọ ihe njirimara ihe niile, nhụnuuche niile, na akaraka niile nke ndị ọzọ gbariri agbari.19 Ọ bụrụ na anyị enweghị ike idebe ije ozi anyị dị ka ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst nogo karịsịrị ọdịmma nke onwe na kesirihụ nke onwe, anyị kwesịrị inyochagharị ihe ndị kachasị anyị mkpa ma mee mgbanwe.

O nwere ike masị anyị ịsị, “Ee anyị nwere ike dịrị n’udo—naanị ma ọbụrụ na ị ga-ekwenyere m!” Ụzọ kacha mma bụ ịjụ, “Gịnị ka m nwere ike ime iji mee ka a dịrị nootu? Olee otu m nwere ike iji zaa iji nyere onye nke a aka ịbịakwute Kraịst nso? Gịnị ka m nwere ike ime iji belata esemokwu na iji wulite ọgbakọ Nzukọ nsọ nwere ọmịịko ma na-enye nlekọta?”

Mgbe ịhụnaanya nke Jizọs Kraịst kpuchigidere ndụ anyị,20 anyị na-eji ịdị nwayọọ n’obi, ndidi, na obi ọma ezute nghọtahie.21 Anyị anaghị esogbu onwe anyị nke ukwuu niihe gbasara ihe ndị na-emetụta anyị ma na-enwe mmetụta karịa niihe gbasara ndị agbata obi anyị. Anyị “na-achọ ịmụta ime ihe ka ọ dị n’oke na ime ka adị nootu.”22 Anyị anaghị etinye aka na “esemokwu ndị na-edoghị anya,” kpee ndị ahụ anyị na ha na-anaghị ekwekọrịta ikpe, ma ọ bụ nwaa ime ka ha kpọbie ụkwụ.23 Kama, k’anyị chee na ndị ahụ anyị na ha na-anaghị ekwekọrịta na-eme ihe ọbụla ha nwere ike ime site na nhụmiihe ndụ niile nke ha nwere.

Nwunye m rụrụ ọrụ dị ka ọka iwu ihe karịrị afọ 20. Dị ka onye ọkaiwu, mgbe ụfọdụ ọ na-arụkọ ọrụ ya na ndị ọzọ echiche ya na ha ekwekọrịtaghị mootu. Mana ọ mụtara otu esi ahapụ inwe nkwekọrịta na-enyeghị mkparị ma ọ bụ iwe iwe. O nwere ike gwa onye ahụ ya na n’ekwekọrịtaghị, “A na m ahụ na anyị agaghị ekwekọrịta n’okwu a. E nwere m mmasị n’ebe ị nọ. A na m asọpụrụ mkpebi gị. Enwere m olileanya na ị ga-enye m otu ụdịrị ezi ụma ahụ.” Ọtụtụ mgbe nke a na-eme ka enwekọrịta nkwanye ugwu ma ọbụla ime enyi na-agbanyeghị ndịiche niile.

Ọbụla ndị nọburu niiro nwere ike ghọọ ndị dị n’otu niime ije ozi ha ka ndị na-eso Onye Nzọpụta.24 Na 2006, a gara m ofufe ido nsọ nke Tempụl Helsinki Finland ị kwanyere nna m na ndị nna nna m ugwu, ndị bụrịị ndị isi mbụ atọghatara nye Nzukọ nsọ na Finland. Ndị Finland, gụnyere nna m, a rọworịị nrọ banyere inwe tempụl na Finland iri kwuru iri afọ. N’oge ahụ, distrikt Tempụl ga-agụnye Finland, Estonia, Latvia, Lithuania, Belarus, na Russia.

Na ofufe ido nsọ ahụ, a mụtara m ihe tụrụ m naanya. Ụbọchị mbụ nke ịrụ ọrụ izugbe ka edokwara maka ndị otù si Russia ime emume nsọ niile nke tempụl. Ọ rara ahụ ịkọwa nnọọ ụdị ịtụnaanya nke a dị. Russia na Finland a lụwo ọtụtụ agha ihe karịrị ọtụtụ narị afọ. Nna m enwebụghị ntụkwasị obi ma kpọọasị ọ bụghị naanị Russia kama ndị Russia niile. O kwupụtaworịị udịrị mmetụta ahụ n’obi ya niile, ma mmetụta ya bụ nnọọ e jiri mara iro ndị Finland nwere n’ebe Russia nọ. O tinyewo nuuche abụ akụkọdike nke e jiri mara agha ndị a lụrụ na 19th-century na-etiti ndi Finland na ndị Russia. Nhụmiihe ya niile n’oge Agha Mba Ụwa II, mgbe Finland na Russia bụkwarịị ọzọ ndị iro, enweghị ihe o mere iji gbanwee echiche ya niile.

Otu afọ tupu ofufe ido nsọ nke Tempụl Helsinki Finland, ndị kọmitii tempụl, gụnyere naanị ndị otù si Finland, zukọtara ịkpa nkata banyere atụmatụ niile maka ofufe ido nsọ ahụ. N’oge nzukọ ahụ, otu onye hụtara na Ndị nsọ si Russia ga-eme njem ọtụtụ ụbọchị iji bịa ofufe ido nsọ ahụ ma tụọ anya ịnata ngọzi niile nke tempụl ha tupu laghachiwe ebe obibi ha. Onye isi oche kọmitii ahụ, Nwanne nwoke Sven Eklund, tụrụ ero na ndị si Finland nwere ike chetụkwuo obere oge, na ndị si Russia ga-abu ndị otù ga-ebu ụzọ eme emume nsọ niile nke tempụl na tempụl ahụ. Ndị otu kọmitii niile kwere. Ndị nsọ Ụbọchị ikpeazụ a nwere okwukwe si Finland gburu oge ngọzi niile nke tempụl ha iji nye Ndị nsọ nke Russia ohere.

Onyeisi Mpaghara ahụ onye nke nọ ebe ahụ na nzukọ nke ndị tempụl kọmitii ahụ, Okenye Dennis B. Neuenschwander, mechara dee : “e nwetụbeghị mgbe m nwere afọ ojuju karịrị akarị maka ndị si Finland karịa ka m nwere n’oge nke a. Agụgụala siri ike nke ndị Finland nwere ha na ndị agbata obi ha nọ na mpaghara ọwụwa anyanwụ … na obi ụtọ ha nke inwe na-ikpe azụ [otu tempụl] e wuru n’ala nke ha onwe ha bụ ihe ndị edokwara. Inye ndị Russia ohere ịbanye na tempụl ahụ mbụ [bụrịị] okwu gosịrị ịhụnaanya na ịchụ aja.”25

Mgbe m kọọrọ nna m ihe a, obi ya ruru ma o bere akwa, otu ihe na anaghị eme eme na ndụ onye nke a si Finland. Site n’oge ahụ tutu ruo n’oge ọnwụ ya mgbe afọ atọ gasịrị, o nweghị mgbe o kwuru okwu ọjọọ ọzọ gbasara Russia. Site na mkpakemmụọ si na-ọmụmaatụ nke ndị Finland ibe ya, nna m họọrọ idebe ije ozi dị ka onye na-eso Jizọs Kraịst elu karịa ihe niile a pụrụ itụle. Ọ pụtaghị na ndị Finland abụghịzi ndị Finland; maọbụkwanụ na ndị Russia abụghịzi ndị Russia; enweghị otù ọbụla jụrụ omenaala ha, agụgụala ha, ma ọ bụ nhụmiihe ha niile iji chụpụ iro. Ha ekwesịghị. Kama, ha họọrọ ime ije ozi ha dị ka ndị na-eso Jizọs Kraịst isi ihe mbụ ha pụrụ ịtụle.26

Ọ bụrụ na ha nwere ike ime ya, otu ahụkwa ka anyị nwere ike. Anyị nwere ike iweta ihe anyị ketara n’aka nne na nna anyị, omenaala anyị, na nhụmiihe anyị niile bịa na Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst. Samuel ahapụghị ihe o ketara n’aka nne na nna ya dị ka onye Laman,27 ma ọ bụ ma Mọmọn ọ hapụrụ nke ya dị ka onye Nifaị.28 Kama onye ọbụla niime ha buru ụzọ were ije ozi dị ka onye na-eso ụzọ Onye Nzọpụta kpọrọihu.

Ọ bụrụ na anyị abụghị otu, anyị abụghị ndị nke Ya.29 Ọkpụkpọ oku m bụ ka adị ike n’itinye ịhụnaanya nke anyị nwere na Chineke na ije ozi dị ka ndị na-eso Onye Nzọpụta n’ogo karịsịrị ihe ndị ọzọ anyị na-etinye uche.30 Ka anyị jisie ike ọgbụgba ndụ ahụ na-adịgide n’ije ozi anyị—ọgbụgba ndụ nke ịbụ otu.

Ka anyị gbasoro ọmụmaatụ nke Ndị nsọ site na-akụkụ ụwa niile bụ ndị nke na-abụrụwo ndị na-eso ụzọ Kraịst na-ezia. Anyị nwere ike ịdabere na Jizọs Kraịst, onye “bụ udo anyị, onye … na-akwadawo mgbidi etiti nọchibidoro anyị na ya; ebe emechiworo niime [aja mgbaghara mmehie] ya, iro ahụ.”31 Aka ebe anyị na-agba nye ụwa banyere Jizọs Kraịst ga-akwụsi ike, ma anyị ga-enwe ahụ ike nke ime mmụọ.32 A na m agba ama na dịka anyị “na-agbanyere esemokwu azụ” ma ghọọ “ndị nwere otu obi anyị na Onyenwe anyị n’ịhụnaanya ma dị notu anyị na Ya n’okwukwe,” Udo Ya ga-abụ nke anyị.33 Site na aha nke Jizọs Kraịst, amen

Hụba-ama

  1. Lee “Otu Ndịisi Mbụ Na-arịọsi Ndị nsọ Ụbọchị ikpeazụ a arịrịọ ike Iyi Ihe Mkpuchi Ihu Mgbe A Chọrọ ma Gbaa Ọgwụ mgbochi Megide COVID-19,” Ụlọ ozi, Ọgọ. 12, 2021, newsroom.ChurchofJesusChrist.org; “Ọgwụ mgbochi niile Enyere nkọwa,” World Health Organization, who.int/emergencies/diseases/novel-coronavirus-2019/covid-19-vaccines/explainers; “Nchekwa nke Ọgwụ mgbochi niile nke COVID-19,” Ebe ndị ewepụtara maka Mbelata na Mgbochi Ọrịa, Sept. 27, 2021, cdc.gov/coronavirus/2019-ncov/vaccines/safety/safety-of-vaccines.html; “Ịdị nkọ na Inwe nchekwa nke Ọgwụ mgbochi COVID-19,” Mkpesa Kwa Izu ụka banyere Ịrịa ọrịa na Ịnwụ anwụ, Ebe ndị ewepụtara maka Mbelata na Mgbochi Ọrịa, cdc.gov/mmwr/covid19_vaccine_safety.html.

  2. Russell M. Nelson, “Ụmụnne ndị nwanyị I soro na Mkpokọta nke Izrel,” Laịhona,, Nọv. 2018, 69.

  3. Lee Ozizi na Ogbụgba ndụ nile 81:5

  4. Ọtụtụ ndị ozi na ndị amụma e kwuwo okwu banyere ịdị notu na esemokwu kemgbe ọtụtụ afọ. Lee, maka ọmụmaatụ, Marvin J. Ashton, “Oge Adịghị maka Esemokwu,” Ensign, Me 1978, 7–9; Marion G. Romney, “Ịdịnootu,” Ensign, Me 1983, 17–18; Russell M. Nelson, “Ọnya ọrịa nke Esemookwu na-ebute,” Ensign, Me 1989, 68–71; Russell M. Nelson, “Ụmụ nke Ọgbụgba ndụ ahụ,” Ensign, Me 1995, 32–35; Henry B. Eyring, “Na Anyị Ga-enwe ike Bụrụ Otu,” Ensign, Me 1998, 66–68; D. Todd Christofferson, “Bịanụ na Zayọn,” Liahona, Nọv. 2008, 37–40; Jeffrey R. Holland, “Ije ozi nke Mkpezi,” Liahona, Nov. 2018, 77–79; Quentin L. Cook, “Obi ndị Ejikọtara na Ezi omume na ỊdịnootuHearts,” Liahona, Nov. 2020, 18–22; Gary E. Stevenson, “Obi ndị Ejikọtara ọnụ,” Liahona, Me 2021, 19–23.

  5. 3 Nifaị 11:28–29

  6. Lee Mozis 7:26, 28, 33. Nke a apụtaghaị na Aja mgbaghara mmehie nke Onye Nzọpụta na-aganiihu ma ọbụ na Ọ na-aganiihu ịta ahụhụ; Jizọs Kraịst emezuwo Aja mgbaghara mmehie ahụ. Otu osila dị, ọmịiko na obi ebere Ya zuru oke na-enweghị ọgwụgwụ nke O nwetara niihi mmezu nke aja mgbaghara mmehie Ya nyere Ya ohere inwe mmetụta ndakpọ olileanya na iwe iwe.

  7. 2 Nịfai 2:8

  8. Jọn 13:34, 35

  9. Iro bụ ọnọdụ ma ọ bụ mmetụta nke ịdị nkọ na-ikwugide mmadụ ma ọ bụ ihe; ọ gụnyere ịkpa agwa ka onye iro, ntakasị ahụ, oke mkpọrọm asị, oke ajọọ akpọm asị, na enweghị mmasị nebe mmadụ nọ miri emi ma ọ bụ obi ọjọọ. Okwu Grik asụgharịrị dị ka “iro” bụkwa ma asụgharịa ya “mkpọrọm asị.” Ọ bụ ọdị iche nke ịhụnaanya ndị na-eso Kraịst,nke asụgharịa ya bụ “ịhụnaanya.” Lee Jems Strong, Nkwekọrịta nke Baịbụlụ Agbasaworo Kpamkpam nke Strong Dị Ọhụụ (2010), mpaghara ọkọwa okwu Greek, ọnụ ọgụgụ 2189.

  10. Lee John 17:21, 23.

  11. 3 Nifaị 11:30.

  12. 4 Nifaị 1:18.

  13. 4 Nifaị 1:17.

  14. 4 Nịfaị 1:16

  15. Onyeisi Russell M. Nelson e kwuwo na, “Onyenwe anyị na-enwe mmasị na mbọ” (niime Joy D. Jones, “Ọkpụkpọ oku Nwere ugwu Pụrụ iche,” Liahona, Me 2020, 16).

  16. Lee 4 Nịfaị 1:15 E nwere ndị na-enwetawo ụdịrị ịdị notu nke a. Nụbọchị nke Enọk, “Onyenwe anyị wee kpọọ ndị ya Zayọn, n’ihi na ha nwere otu obi na otu uche, ma biri n’ezi omume; ma e nweghị ogbenye n’etiti ha.” (Moses 7:18).

  17. Lee Mosaia 18:21

  18. Lee Ọrụ 17:29; Abụ ọma 82:6

  19. Lee 1 Ndị Korịnt 12:12–27

  20. Lee Moronai 7:47-48

  21. Lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 107:30–31

  22. Dallin H. Oaks, “Ichekwa Iwu ala Anyị si na Mkpakemmụọ nke Eluigwe,” Liahona, Me 2021, 107.

  23. Lee Ndị Rom 14:1–3, 13, 21

  24. Onye Nzọpụta katọrọ “ndị na-eso ụzọ Ya, mgbe gboo, [bụ ndị] chọrọ ohere imegide onye na ibe ya ma hapụ ịgbagharagha onye na ibe ya n’ime obi ha; ma n’ihi ihe ọjọọ nke a a tara ha ahụhụ ma baara ha mba dị egwu. Ya mere,” Jizọs dọrọ ndị na-eso ụzọ Ya Ụbọchị ikpeazụ a aka na ntị, “A sị m unu, na unu kwesịrị ịgbaghara onye na ibe ya.” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 64:8–9).

  25. Okenye Dennis B. Neuenschwander, nzimozi nke onwe.

  26. Nụzọ ndị Finland si nnọọ eme ihe, mgbe Nwanne nwoke Eklund kpara nkata maka mkpebi nke a, ọ sịrị na ọ bụ nnọọ ihe e mere nusoro. Kama itowe afọma nke ndị Finland, o nyere ekele maka ndị Russia. Ndị Finland nwere obi ekele maka oke enyem aka nke ndị Russia nọrụ ahụ a rụrụ na Tempụl Helsinki Finland. (Sven Eklund, nzimozi nke onwe.)

  27. Lee Hilaman 13:2, 5

  28. Lee 3 Nifaị 5:13, 20

  29. Lee Ozizi na Ogbụgba ndụ nile 38:27

  30. Lee Luk 14:25–33

  31. Ndị Efesọs 2:14–15

  32. Lee Ndị Efesọs 2:19

  33. Lee Russell M. Nelson, “Ọnya ọrịa nke Esemookwu na-ebute,” Ensign, Me 1989, 71.

Bipụta