Ọgbakọ Zuru ọha
Ikwu okwu banyere Ahụike nke Ụbụrụ
Ọgbakọ Zuru ọha Ọktoba 2021


Ikwu okwu banyere Ahụike nke Ụbụrụ

Kwe ka m kesaa ụfọdụ ihe m chọpụtara dịka ezi na ụlọ m gabigara ọtụtụ mnwale.

N’agbanyeghi na ezi na ụlọ anyị eritewo ọtụtụ ngọzị bara ụba dịka ha n’eje ije nụzọ ọgbụgba-ndụ, anyị ahụtawokwa ọtụtụ nnukwu ugwu dị oke elu. A chọrọ m ịkesaara unu ụfọdụ nhụmịhe nke onwe m gbasara ọrịa nke ụbụrụ. Ndị sonyere nime ya bụ oke obi mwute, obi mmafu, ọrịa bipola, ADHD—ma mgbe ufọdụ njikọta ha niile. A na m ekesaa nhụmịhe ndị a n’emetụ n’ọbị nihi ndị ọ metụtara nyere m nkwado.

N’oge ọrụ ije ozi m, A hụtara m narị kwuru narị mmadụ na ezị na ụlọ nwekwara otu ụdị nhụmịhe ndị a. Mgbe ụfọdụ, A na m atule uche ma “ọrịa-ịtọgbọrọ n’efu” nke n’ezu ala niile nke ekwuru nime akwụkwọ nsọ niile nwere ike ị gụnyekọta ọrịa nke ụbụrụ.1 O zuru ụwa niile, n’ekpuchi ala-kọntịnentị na omenala niile, ma na-emetụta onye niile—onye nta, ndị agadi, ndị bara ụba ma ndị ogbenye. Agụpụghị ndị otú Nzukọ nsọ site na nke a.

N’otu oge ahụ, ozizi anyị na-akụziri anyị k’anyị gbasie mbọ ike ị dịka Jizọs Kraịst ma tozuo oke nime Ya. Ụmụaka anyị na-abụ, “A na m agba mbọ ị dịka Jizọs.”2 Anyị nwere mmasị ịtozu oke tụmadị dịka otu Nna anyị nke Eluigwe na Jizọs Kraịst siri tozuo oke.3 Nihi ọrịa nke ụbụrụ nwere ike imebi otu anyị si n’eche banyere itozu oke, okwu banyere ya na-abụkarị ihe ajụrụ ajụ. Nihi nke a, enwere ọtụtụ amaghị ihe, ọtụtụ ntarama ahụhụ a na-amaghị maka ya, ma ọtụtụ obi nkoropụ. Ọtụtụ, na-enwe mmetụta ike ọgwụgwụ nihi ha etorughị ụfọdụ ogo, nihi echiche n’ezighi ezi, ha chere na ha enweghi ọnọdụ nime Nzukọ nsọ.

Ị luso ụdị echiche aghụghọ nke a agha, ọ dị mkpa ịcheta na “Onye nzọpụta hụrụ ụmụ niile nke Nna Ya n’anya. Ọ ghọtara nke ọma ihe mgbu na mgba nke ọtụtụ n’ahụta dịka ha na-agabiga ọtụtụ mnwale nke ahụike nke ụbụrụ. Ọ tara ahụhụ ‘mgbu niile na mkpagbu niile na ọnwụnwa ụdị ọbụla; … [ọ ga] ebukwasị onwe ya ihe mgbu niile na ọrịa niile nke ndị ya.’ (Alma 7:11; agbakwụnyere nkọwa; lee kwa Ndị Hiburu 4:15–16; 2 Nefi 9:21). Nihi Ọ ghọtara mkpagbu niile, Ọ matara otu esi ‘agwọ obi tiwara etiwa.’ (Luke 4:18; lee kwa Aisaia 49:13–16).”4 Ihe ịma aka mgbe ụfọdụ n’egosi mkpa ngwa ọrụ ndị ọzọ na nkwado dị, ma ha abụghị ihe merụrụ agwa.

Kwe ka m kesaa ụfọdụ ihe m chọpụtara dịka ezi na ụlọ m gabigara ọtụtụ mnwale.

Nke mbụ, ọtụtụ ga-esoro anyị rie uju; ha agaghị ekpe anyị ikpe. Nihi ọtụtụ ọke obi mmafu, obi ịlọ mmiri, na oke ida mbà n’obi, nwa anyị nwoke si na ozi mgbasa oziọma ya lọta ụlọ naanị ka izu ụka anọ gafere. Dịka nne na nna ya, anyị hụtara na ọ rara anyị ahụ ị meri ngharịpụ na mwute ahụ nihi anyị kpere ọtụtụ ekpere maka ọdịmma ya. Dịka nne na nna niile, anyị chọrọ ka ụmụ anyị ga n’ihu ma nwe aṅụrị. Njem mgbasa oziọma kwesịrị ịbụ emume dị mkpa maka nwa anyị nwoke. Anyị tulere kwa nime obi anyị ịhe ndị ọzọ nwere ike iche.

Ihe anyị na-amaghị bụ na, nlọta nwa anyị nwoke karịsịrị gbawa ya obi. Matakwa na ọ hụrụ Onyenwe anyị n’anya nke mere o jiri chọọ ịje ozi, ma ọ nweghi ike ị mee nke a nihi ihe ndị ọ na-aghọtaghị. O teghi aka ọ hụtara onwe ya nime ọnọdụ nke olileanya n’adịghị kpamkpam, na-echekasị onwe ya site na ịma onwe ya ikpe. Ọ nweteghi mmetụta nke nnabata ma ọ nyụrụ ọkụ nke ime mmụọ. Echiche mgbe niile banyere onwụ riri ya obi nke ukwuu.

Mgbe ọ nọ n’ọnọdụ echiche ọgbaghara nke a, nwa anyị nwoke kwere na naanị ihe fọrọ ya ịme bụ ị were ndụ ya. Ọ bụ site na Mmụọ Nsọ na igwé ndị mmụọ ozi nọ n’ofe vel abụọ ahụ ka eji zọpụta ya.

Mgbe ọ nọ na-alụ agha maka ndụ ya ma n’oge nnukwu mkpagbu nke a, ezi na ụlọ anyị, ndị ndu ngalaba ukwu, ndị otú, na ndị enyi pụtara n’ụzọ ha ị kwado na ijere anyị ozi.

Ahụtụbeghi m udi mwụpụta ịhụnanya dị ọtu a. Ọ metụbeghi m n’obi n’ụzọ siri ike ma n’ụzọ mmetụta nke onwe ihe ọ pụtara ị kasị obi nye ndị nwere mkpa nkasị obi. Ndị ezi na ụlọ anyị ruo ebighi ebi ga-enwe obi ekele maka ngosipụta ahụ.

Enweghi m ike ị kọwa ọrụ ebube n’enweghi ọnụ ọgụgụ nke soro emume ndị ahụ. Na obi ekele, nwa anyị nwoke lanarịrị ya, mana ọ weere ogologo oge, ma ọtụtụ nlekota nke ọgwụ, nke ịme mmụọ ka ọ wee nata ọgwụgwọ ma ịnabata na ahụrụ ya n’anya, na o nwere ugwu, ma n’achọrọ ya.

A matara m na ọ bụghị udị ngabiga niile dị otua n’abịa na njedebe dịka nke anyị. E sooro m ndị ahụ nwere ndị ha hụrụ n’anya nwụrụ noge n’eri uju ma ugbu a ha na-enwe mmetụta nke iri uju makwa ajụjụ ndị n’enweghi ọsịsa.

Ihe ọzọ m hụrụ bụ na ọ nwere ike ịra ndị nne na nna ahụ ị chọpụta aka mgba niile nke ụmụ ha, mana anyị kwesịrịrị ịkụziri onwe anyị ihe. Kedụ otu anyị si ama ihe dị iche n’etiti isi ike niile metụtara ntolite na ejirimara niile nke nrịanrịa? Dịka ndị nne na nna, anyị nwere ọrụ dị nsọ ị nyere ụmụ anyị aka gafee ịma aka niile nọ na njem ndụ; otu osiladị, naanị ntakịrị nime anyị bụ ọka mmụta ahụike nke ụbụrụ. Anyị nagbanyeghi, kwesịrị ịlekọta ụmụaka anyị site n’ịnyere ha aka mụta ị nwe afọ ojuju maka ezi mgbalị ha niile dịka ha na-agba mbọ ị mezu ịhe atụmanya ha. Onye ọbụla nime anyị maara site na adịghị ike nke onwe anyị na uto nke ime mmụọ bụ nke na-aga n’ihu.

Anyị amatawo ugbua na “enweghi otu ọgwụgwọ dị mfe maka ahụike nke mmetụta na nke ụbụrụ. Anyị ga-enwete nhụmịhe nke nchekasị na ogba aghara n’ihi na anyị bi n’ime ụwa nke dara ada ya na anụ ahụ dara ada. Na mgbakwunye, ọtụtụ ihe nwere ike iso mee ka amata na ọ bụ ọrịa nke ụbụrụ. Nagbanyeghi ọdịmma nke ụbụrụ na mmetụta anyị, ịlekwasị anya na uto n’enye ahụike karịa ichekasị maka adịghị ike anyị niile.”5

Maka mụ na nwunye m, otu ihe nke n’enyere anyị aka mgbe niile bụ ị nọ Onyenwe anyị nso mgbe niile. Anyị lee anya n’azụ, anyị n’ahụzi ugbua otu Onyenwe anyị jiri were ndidi kuziere anyị ihe n’oge niile nke nnukwu amaghị ama. Ihé Ya duuru anyị site na otu nzepụ ụkwụ ruọ na otu nzepụ ụkwụ n’oge awa ọchịchịrị niile ndị ahụ. Ọnyenwe anyị nyere anyị aka ị hụ uru mkpụrụ obi ọbụla kachasị mkpa nime ihe ebighi ebi niile karịa ọrụ mọbụ nrite ọbụla nke ụwa.

Ọzọ, ịkụziri onwe anyị maka ọrịa ụbụrụ na-akwado anyị ị nyere onwe anyị na ndị ọzọ aka ndị na-agabiga aka mgba nke a. Mkparịta ụka asị n’adịghị n’etiti onye n’ibe ya ga-enyere isiokwu a aka ka ọ nwete nlebara anya nke ruuru ya. N’ezie, ị mata banyere ihe n’ebu ụzọ bịa tupu mkpali na mkpughe. Ịma aka ndịa niile a na ahụ anya nwere ike ị metụta ọnye ọbụla, ma mgbe anyị na-ezuta ha, ọ ga-adịka enweghi ike ịmeri ha.

Otu nime ihe mbụ anyị kwesịrị ị mụta bụ na n’ezie anyị anọghị naanị anyị. A na m akpoku unu ka unu mụọ maka ahụike nke ụbụrụ nime ebe Life Help dị nime app nke Gospel Library. Mmụta ihe ga-ebute mbawanye nke nghọta, mbawanye nke nnabata, mbawanye nke ọmịiko, mbawanye nke ịhụnanya. Ọ ga-eme ka mberede belata ma na-enyere anyị aka iwulite ma lekọta atụmanya na mkparịta ziri ezi.

Ihe nchọpụta nke ikpe azụ m: anyị kwesịrị mgbe niile ịlekọta onwe anyị anya. Anyị kwesịrị ịhụ onwe anyị anya ma belata ịma onwe anyị ikpe—tụmadị mgbe atụmanya anyị abịaghị na mmezu n’otu ntabi anya. Anyị kwesịrị ịnyere ụmụaka na ndị ntoroọbịa anyị aka nwete mmetụta ịhụnanya nke Jizọs Kraịst nime ndụ ha, tụmadị mgbe ha na-adọligbu onwe ha ị nwete ịhụnanya maka onwe ha. Okenye Orson F. Whitney, onye jere ozi dịka onye otú Kworum nke Ndị-ozi Iri na Abụọ, dụrụ ndị nne na nna ndụmọdụ maka otu ha si enyere ụmụ ha aka ndị na-adọligbu onwe ha: “Kpeere ụmụ unu … ekpere; jiri okwukwe unu jide ha.”6

Mgbe ụfọdụ ka m n’atule ihe ọ pụtara iji okwukwe jide ha. E kwere m na ihe sonyere ya bụ agwa nke ịhụnanya, umeala, obiọma na nkwanye ugwu. Ọ pụtara ị hapụ ha ka ha tolite dịka ike ha sịrị dị ma i kwupụtara ha ịgba ama nke ga-enyere ha aka nwete mmetụta ịhụnanya nke Onye nzọpụta. Ọ ga-ewe anyị ịche maka ha karịa ma chee ntakịrị maka onwe anyị mọbụ ndị ọzọ. Nke a pụtara ịbelata ikwu okwu ma gee ntị karịa, ma karịa nke ọma. Anyị kwesịrịrị ịhụ ha nanya, nye ha ike, ma too ha mgbe ụfọdụ nime mgbalị niile ha n’eme iji merie ma kwesị ntụkwasị obi n’ebe Chineke nọ. Ma n’ikpe azụ, anyị kwesịrị ịme ịhe nile anyị nwere ike ịme iji nọrọ ha nso—dịka otu anyị si nọrọ Chineke nso.

Maka ndị niile ọrịa ụbụrụ metụtara, jidesie ọgbụgba-ndụ gị niile ike, ọbụrụgodi na ị naghị enwete mmetụta ịhụnanya nke Chineke n’oge nke a. Mee ihe ọbụla i nwere ike ịmee ma emesịa “guzoro n’otu ebe … ịhụ nzọpụta nke Chineke, na ogwe-aka-ya nke aga ekpughe.”7

A na m agba ama na Jizọs Kraịst bụ Onye Nzọpụta anyị. Ọ maara anyị. Ọ hụrụ anyị n’anya, ma Ọ ga echere anyị. N’oge mnwale ezi na ụlọ anyị niile, A bịawo m mata otu O siri nọrọ anyị nso. Nkwa Ya nile bụ eziokwu:

Atụla egwu, A nọnyeerem gị; oh, obi alọla gị mmiri,

N’ihi abụ m Chineke gị ma aga m enyekwa gi enyemaka.

A ga m agba gị ume, nyere gị aka, ma mee ka gị kulie, …

Bulie gị site na aka ezi omume m, kachasị ike.

Nihi anyị amatawo otu ntọala anyị siri sie ike, k’anyị jiri obi ụtọ tikuo:

Mkpụrụ obi ahụ dabere na Jizọs maka nkasị obi

A gaghị m, enweghi m ike, ịgakwuru ndị iro ya;

Mkpụrụ obi ahụ, n’agbanyeghi na ọkụ mmụọ niile g’ebuso ya, …

A gaghị m ma ọlị, mba ma ọlị, mba ma ọlị ahapụ!8

Site na aha nke Jizọs Kraịst, amen

Hụba-ama

  1. Ozizi na Ọgbụgba-ndụ niile 45:31.

  2. “A na m Agba mbọ Ịdị ka Jizọs;” Children’s Songbook78–79.

  3. Lee 3 Nịfaị 12:48

  4. Like a Broken Vessel,” Ahụike nke uche: Ukpuru nke Zuru ọha, ChurchofJesusChrist.org.

  5. Sheldon Martin, “Strive to Be—A Pattern for Growth and Mental and Emotional Wellness,” LiahonaAug. 2021, 14.

  6. Orson F. Whitney, in Conference Report, Apr. 1929, 110.

  7. Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 123:17.

  8. “How Firm a Foundation,” Hymns,no. 85.

Bipụta