Ọgbakọ Zuru ọha
Udo Nke Onwe n’Oge Ihe Ịma Aka
Ọgbakọ Zuru ọha Ọktoba 2021


13:48

Udo Nke Onwe n’Oge Ihe Ịma Aka

Enwebeghị ma ọlị mgbe ọ kacha dị mkpa ịchọ udo nke onwe.

E nyere m ọrụ na nso nso a i do nso otu akụkụ nke Nauvoo nke agụgụala. Dịka akụkụ nke ọrụ ahụ, e nwere m ike ịga nleta na Mkpọrọ Liberty dị na Missouri. Dịka m lere mkpọrọ ahụ, a tụgharịrị m uche ihe omume niile nke mere ya ụdịrị akụkụ dị mkpa nke agụgụala Nzukọ nsọ. Ndụ nke Ndị Nsọ ka eyiri egwu n’ihi iwu mgbuchapụ e nyere site n’aka gọvanọ nke Missouri. Na mgbakwunye, Onye Amụma Joseph na ndị enyi ole ma ole ahọọrọ ka atụworo mkpọrọ na-ezighị ezi n’ime Mkpọrọ Liberty. Otu n’ime ebumnuche maka mmegide ahụ kpụ ọkụ n’ọnụ nye ndị otu bụ na ọtụtụ n’ime ha megidere ịgba ohu.1 Mkpagbu nkea dị ike nke Josef Smith na ndị na-eso ya mejupụtara otu oke ihe ịma atụ nke ime nhọrọ n’ezighị ezi nke nwere ike imetụta ndị eziomume. Oge nke Josef na Mkpọrọ Liberty gosipụtara na nsogbu abụghị ihe akaebe nke enweghị mmasị nke Onyenwe anyị ma ọ bụ mwepụ nke ngọzi Ya niile.

O metụtara m nke ukwuu dị ka m gụrụ ihe Onye Amụma Josef Smith mara ọkwa ya dịka ejichiri ya n’ime Mkpọrọ Liberty: “O Chineke, olee ebe ị nọ? Ma olee ebe ụlọ-ntu n’ekpuchita ebe nzuzo gị nọ?”2 Josef rịọrọ ugboro ole ka ndị nke Onyenwe anyị ga “ata ahụhụ mmegide ndịa na mmegbu ndị iwu akwadoghị.”3

Okenye Cook gara nleta na Mkpọrọ Liberty

Dịka m guzoro na Mkpọrọ Liberty, e nwetere m mmetụta dị omimi ka m gụrụ aziza nke Onyenwe anyị: “Nwa m udo dịrị mkpụrụ obi gị; ihe isi-ike gị na nsogbu nile gị ga-abụ maka nwa oge nta; Ma mgbe ahụ, ọ bụrụ na ị nagide ya nke ọma, Chineke ga-ebuli gị n’elu.”4 Ọ kwere nghọta na mmegide nwere ike mezie anyị maka akara selestial dị ebighị ebi.5

Ọmarịcha okwu niile nke Onye Nzọpụta “Nwa m, udo dịrị mkpụrụ obi gị”6 na-adara m n’onwe ma baa nnukwu uru maka ụbọchi anyị. Ha n’echetere m maka nkuzi Ya niile nye ndị n’eso ụzọ Ya n’oge ije ozi nke ndụ anụ ahụ Ya.

Tupu ntaram ahụhụ nke Kraịst n’ime Ubi nke Getsemene ma n’elu obe, O nyere Ndị Ozi Ya iwu ị “hụrịkọta ibe ha n’anya; dị ka m hụworo unu n’anya”7 ma na-esote jiri okwu ndịa gbaa ha ume: “Udo ka M na-ahapụrụ unu, udo m ka m na-enye unu: n’abụghị dịka ụwa si enye, ka M na-enye unu. Unu enyela obi unu nsogbu, nke unu ji atụ ụjọọ.”8

Otu nime aha niile kachasị mma nke Onyenwe anyị na Onye Nzọpụta anyị, Jizọs Kraịst, bụ “Onyeisi nke Udo.”9 N’ikpeazụ alaeze Ya ka a ga-ehiwe tinyekọta udo na ịhụnaanya.10 Anyị na-atụ anya nke ọchịchị milenia nke Mezaya.

N’agbanyeghị atụm anya ọchịchị milenia nkea, anyị ma na udo na nkwekọrịta nke ụwa ejughị n’ụbọchi anyị.11 N’oge ndụ m, ahụtụbeghị m enweghị ezi agwa karịrị akarị. Anyị jupụtara na okwu esemokwu, iwe na omume mkpasu iwe, na-agbawa obi nke na-emebi udo na obi iru ala.

Udo n’ime ụwa ka a n’ekweghị nkwa ma ọbụ jiri n’aka tutu ruo n’Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ nke Jizọs Kraịst. Onye Nzọpụta gwara Ndị Ozi Ya na ozi elu ụwa Ya agaghị emetali udo zuru ụwa. Ọ kuziri, “Echekwala na M na-abịa izite udo n’elu ụwa.”12 Udo eluigwe na ala abụghị akụkụ nke ije ozi ndụ anụ ahụ nke Onye Nzọpụta na mbụ. Udo eluigwe na ala adịghị adị taa.

Kosiladị, udo nke onwe ka enwere ike imeta n’agbanyeghị iwe, esemokwu, na nkewa nke na-emebi ma merụọ ụwa anyị taa. Enwebeghị ma ọlị mgbe ọ kacha dị mkpa ịchọ udo nke onwe. Otu ọmarịcha abụ ọhụrụ dị mmasị edere maka ndị ntoroọbịa nke taa site n’aka Nwanne nwoke Nik Day, akpọrọ “Udo n’ime Kraịst” na-ama ọkwa, “Mgbe ana enweghị udo n’elu ụwa, enwere udo n’ime Kraịst.”13 Agọziri anyị inwete abụ nkea naanị tupu ọrịa mkpochapụ COVID-19 gburugburu ụwa.

Abụ nkea na-egosipụta n’ọmarịcha ụzọ ọchịchọ ahụ maka udo ma n’ụzọ kwesịrị ekwesị kwusie ike na udo ka agbadoro na ndụ na ozi nke Jizọs Kraịst. Onyeisi Josef F. Smith mara ọkwa, “Enweghị ike ma ọlị abịa n’ụwa na mmụọ nke udo na ịhụnaanya … tupu ruo mmadụ ga-anata eziokwu nke Chineke na ozi nke Chineke … ma nakwere ike na ikike ya nke dị nsọ.”14

Ebe anyị enweghị ike echighaazụ na mbọ niile iji meta udo eluigwe na ala, ekwewo anyị nkwa na anyị nwere ike inwe udo nke onwe, dịka Kraịst na-akuzi. Ụkpụrụ nkea ka edepụtara n’ime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile: “Mana mụta nụ na onye ahụ na-arụ ọrụ nke eziomume ga-anata ụgwọ-ọrụ ya, ọbụna udo n’ime ụwa nke a na ndụ ebighi-ebi n’ụwa nke na-abịa.”15

Gịnị bụ ụfọdụ “ọrụ nile nke eziomume” nke ga-enyere anyị aka nagide okwu na ụka niile ma belata esemokwu ma chọta udo n’ime ụwa nkea.? Nkuzi Kraịst niile na-arụtụ aka n’ụzọ nkea. A ga m akpọpụta ole ma ole nke m kwere dịkarịsịrị mkpa.

Nke mbụ: Hụ Chineke n’anya, Debe Iwu nsọ Ya niile, ma Gbaghara Onye ọbụla

Onyeisi George Albert Smith bụrụziri Onyeisi Nzukọ nsọ na 1945. Amarawo ya rịị n’afọ ya niile ka Onye Ozi dịka onye ndu hụrụ udo n’anya. N’afọ ndị gara aga tupu ya abụrụ Onyeisi, aka mgba niile na mnwale niile nke ịda mbà n’obi jupụtara gburugburu ụwa, nke ọnwụ na mbibi nke World War II sotere, abụrụworịị ihe ọbụla ma ọ bụghị udo.

Na mmechi Agha Ụwa II, n’oge ọgbakọ zuru ọha ya mbụ dịka Onyeisi na Ọktoba 1945, Onyeisi Smith chetaara Ndị Nsọ maka ọkpụkpọ oku nke Onye Nzọpụta inwe ịhụnaanya n’ebe ndị agbata obi ha nọ ma gbaghara ndị iro ha ma mesịa kuzie na, “Nke ahụ bụ mmụọ nke Ndị Nsọ Ụbọchi ikpeazụ a niile kwesịrị ịchọ inwe ma ọbụrụ ma ha nwee olileanya otu ụbọchi iguzoro n’ihu Ya ma nata n’aka Ya nnabata dị ebube n’ebe obibi.”16

Nke abụọ: Chọọ Mkpụrụ niile nke Mmụọ ahụ

Onye ozi Pọl n’Ozi ya nye Ndị Galetia, depụtara ihe dị iche n’etiti ọrụ nke eziomume nke na-eme anyị etozuo oke irite alaeze nke Chineke na ọrụ nke nwere ike, na-enweghị nchegharị, mee anyị ahara itozu oke. N’etiti ndị ahụ na-eme anyị etozuo oke bụ mkpụrụ niile nke Mmụọ “ịhụnaanya, ọńụ, udo, ogologo ntachi obi, inwe obiọma, ịdị mma, okwukwe, ịdị umeala n’obi, [na] ịdị nwayọọ.”17 Pọl tinyekọtakwara ibukọrịta ibu onye na ibe ya ma ghara inwe ike ọgụgụ na-ime ihe dị mma.18 N’etiti ọrụ ndị ahụ nke n’enweghị eziomume o tinyekọtara ịkpọ asị, iwe, na esemokwu.19

Otu n’ime nnukwu nkuzi dị n’oge Agba Ochie kọrọ banyere Nna Ebraham. Ebraham na Lọt, nwa nwanne ya, bara ụba mana chọpụta na ha enweghị ike ịnọkọta ọnụ. Iwepụ esemokwu, Ebraham kwere ka Lọt họrọ ala nke ọ chọrọ. Lọt họọrọ ala larịị nke Jodan, nke nwere mmiri nke ọma ma maa mma. Ebraham weere ala larịị nke Mamre kacha peempe n’inwe nri. Akwụkwọ nsọ niile na-agụ na Ebraham bịara rụnye ụlọ ikwuu ya ma rụọ “ebe nchụaja nye Onyenwe anyị.”20 Lọt, naka nke ọzọ, “rụnyere ụlọ ikwuu ya gawa Sodom.”21 Inwe mmekọrịta jupụtara n’udo, nkuzi ahụ dị mfe nghọta: anyị kwesịrị ịdị njikere imejupụta ma wezuga esemokwu nihe gbasara ihe niile nke na-agụnyeghị eziomume inwe mmekọrịta ndị jupụtara n’udo. Dịka Eze Benjamin kuziri, “Unu agaghị enwe uche ịmerụ ibe unu ahụ, kama ibi n’udo.”22 Mana n’agwa gbasara ihe ndị dị mkpa nke eziomume na ozizi, anyị kwesịrị ịnọgide kwụrụ chịm ma guzosie ike.

Ọ bụrụ na anyị chọrọ inwe udo nke bụ ihe nrite nke ọrụ niile nke eziomume, anyị a gaghị arụnye ụlọ ikwuu anyị chewe ihu n’ụwa. Anyị ga a rụnye ụlọ ikwuu anyị chewe ihu na tempụl.

Nke Atọ: Tinye Ohere Nhọrọ N’ọrụ iji Họrọ Eziomume

Udo na ohere nhọrọ ka ejikọtara ọnụ dịka ihe ndị dị mkpa nke atụmatụ nke nzọpụta. Dịka a kọwara nime Isiokwu Oziọma maka “Ohere nhọrọ na Inye nkọwa,” “Ohere nhọrọ bụ ike na ohere ọma Chineke na-enye anyị iji họrọ ma mee ihe maka onwe anyị.”23 Ya mere, ohere nhọrọ dị n’etiti uto na nhumihe nke onwe nke na-agọzi anyị dịka anyị n’eso Onye Nzọpụta.24

Ohere nhọrọ bụ isi okwu Kansụl ndụ tupu ndụ anụ ahụ n’ime Eluigwe na esemokwu n’etiti ndị ahụ họọrọ isoro Kraịst na ndị na-eso Setan.25 Ịgbaghapụ mpako na ike nchịkọta na ịhọrọ Onye Nzọpụta ga-ekwe ka anyị nwee ihé Ya na udo Ya. Mana udo nke onwe ga-enwe ịma aka mgbe ndị mmadụ tinyere n’ọrụ ohere nhọrọ ha n’ụzọ ndị na-emerụ ahụ ma na-afụ ụfụ.

Obi siri m ike na mmesi obi ike jupụtara n’udo n’emetụta anyị n’obị nwetere mgbam ume site na mmụta anyị nwetere nke ihe Onye Nzọpụta nke ụwa ga-emeta n’aha anyị. Nkea ka ekwuru nke ọma n’ime Kwusaa Ozi ọma M: “Dịka anyị na adabere na Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst, O nwere ike nyere anyị aka nagide mnwale anyị niile, nrịa nrịa niile, na mgbu. Anyị nwere ike jupụta n’ọńụ, udo, na nkasi obi. Ihe niile na-adịchaghị mma banyere ndụ ka enwere ike imezi site na Aja mgbaghara mmehie nke JIzọs Kraist.”26

Nke Anọ: Wulite Zayọn nime Obi na Ebe Obibi Anyị niile

Anyị bụ ụmụ nke Chineke na akụkụ nke ezi na ụlọ Ya. Anyị bụkwa akụkụ nke ezi na ụlọ nke n’ime ya amụrụ anyị. Nkwadebe nke ezi na ụlọ bụ ntọala maka ma ańụrị na udo. Onyeisi Russell M. Nelson akuziworo anyị—ma noge ọrịa mkp0chapụ a anyị amụtawo—na ememe dabeere n’ebe obibi, Nzukọ nsọ kwadoro nwere ike “tọpụta ike nke ezi na ụlọ niile … ịgbanwe ebe obibi [anyị] [niile] ịbụrụ ebe nsọ nke okwukwe.”27 Ọbụrụ na anyị mee ememe okpukperechi nkea n’ebe obibi anyị, anyị ga-enwekwa udo nke Onyenwe anyị.28 Anyị maara na ọtụtụ n’ime unu enweghị ngọzi niile nke ezi na ụlọ eziomume ma n’ese okwu mgbe niile unu na ndị họọrọ enweghị eziomume. Onye Nzọpụta nwere ike iwete nchekwa na udo iji tuziere unu aka n’ikpeazụ baa na nchekwa ma kpuchite unu site na ọgbaghara niile nke ndụ.

A na m ekwe unu nkwa na ọńụ ahụ, ịhụnaanya, na mmejupụta ahụtara n’ezi na ụlọ eziomume dị ịhụnaanya, n’ewete ma udo ma ańụrị. Ịhụnaanya na obi ọma dị n’etiti inwe Zayọn n’ime obi na ebe obibi anyị niile.29

Nke Ise: Soro Ndụmọdụ Nke Ugbua niile nke Onye Amụma Anyị

Udo anyị na-abawanye nke ukwuu mgbe anyị n’esoro onye amụma nke Onyenwe anyị, Onyeisi Russell M. Nelson. Oge na-adịghị anya anyị ga-enwe ohere ịnụ site n’aka ya. Akwadoro ya site na ntọala niile nke ụwa maka ọkpụkpọ oku nkea. Nkwadebe nke onwe ya adịrịwo iche kachasị.30

Ọ kuziworo anyị na anyị nwere ike “nwee mmetụta udo na ọńụ na-anọgide, ọbụna oge ọgba aghara niile,” dịka anyị na-agbalị ịdịrịzi karịa dịka Onye Nzọpụta anyị, Jizọs Kraịst.31 O nyewo anyị ndụmọdụ “ichegharị kwa ụbọchị” iji nata “nsacha, ọgwụgwọ, na ike mgbam ume” nke Onyenwe anyị.32 A bụ m onye akaebe na mkpughe ka anataworo ma na aganihu ịnata site n’eluigwe site n’aka onye amụma anyị hụrụ n’anya.

Ka anyị na-enye nkwanye ugwu ma kwadoo ya dịka onye amụma anyị, anyị n’efe Nna anyị nke Eluigwe na Onye Nzọpụta anyị Jizọs Kraịst ofufe. Onye na-elekọta anyị bụ Mmụọ Nsọ.

A na m agba ama ma gbaa akaebe onye ozi nke onwe m na Jizọs Kraịst, Onye Nzọpụta na Onye Mgbapụta nke ụwa, na-edu ma tuziere Nzukọ nsọ Ya. Ndụ Ya na ozi aja mgbaghara mmehie Ya bụ ezi ụzọ nke udo. Ọ bụ Onyeisi Udo. A na m agba akaebe m siri ike ma dị nsọ na Ọ dị ndụ. N’aha nke Jizọs Kraịst, amen.

Hụba-ama

  1. “Ndị mmadụ dị na Independence enweghị mmasị na Ndị nsọ kwusara okwu Chukwu nye Ndị India na anabataghị ịbụ ohu.” (Saints: The Story of the Church of Jesus Christ in the Latter Days, vol. 1, The Standard of Truth, 1815–1846 [2018], 172).

  2. Ozizi na Ọgbụgba-ndụ niile 121:1.

  3. Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 121:3.

  4. Ozizi na Ọgbụgba-ndụ niile 121:7-8.

  5. Lee 2 Nephi 2:11–15

  6. Ozizi na Ọgbụgba-ndụ niile 121:7.

  7. Jọn 13:34.

  8. Jọn 14:27.

  9. Isaiah 9:6; 2 Nifaị 19:6. Onye Nzọpụta na Nkuzi Obiọma Ya, kuzikwara, “Ngọzi na-adịrị nke omee udo: n’ihi na ha ka a ga-akpọ ụmụ Chineke” (Matiu 5:9).

  10. “Jiri ọmụma ikpe na ikpe ziri ezi … mgbe niile” (lee Isaiah 9:6–7; 2 Nephi 19:6–7; lee kwa Ndị Galetia 5:22).

  11. Lee Ozizi na Ọgbụgbandụ nile 1:35. Onyeisi Wilford Woodruff mara ọkwa nkea na 1894 ma ọzọkwa na 1896 (lee The Discourses of Wilford Woodruff, sel. G. Homer Durham [1946], 251–52; see also Marion G. Romney, in Conference Report, Apr. 1967, 79–82; Ezra Taft Benson, “Ike nke Okwu ahụ,” Ensign, Me 1986, 79–80; Dallin H. Oaks, “Nkwadebe maka Ọbibịa nke Ugboro Abụọ,” Liahona, Me 2004, 9).

  12. Matiu 10:34.

  13. Nik Day, “Udo nime Kraịst,” 2018 Mutual theme song, Liahona, Jan. 2018, 54–55; New Era, Jan. 2018, 24–25. Abụ ahụ “Udo n’ime Kraịst” na-akuzi:

    Mgbe anyị biri n’ụzọ O siri bie,

    Enwere udo n’ime Kraịst.

    Ọ na-enye anyị olileanya

    Mgbe olileanya lara.

    Ọ na-enye anyị mgbam ume

    Mgbe anyị n’enwegh ike ịganiihu.

    Ọ na-enye anyị ebe mgbaba

    N’ufufe niile nke ndụ.

    Mgbe enweghị udo n’elu ụwa,

    Enwere udo n’ime Kraịst.

  14. Nkuzị niile nke Ndịisi Nzukọ Nsọ: JosephF. Smith (1998), 400.

  15. Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 59:23.

  16. Lee George Albert Smith, in Conference Report, Oct. 1945, 169–70.

  17. Ndị Galeshia 5:22-23.

  18. Lee Ndị Galetia 6:2, 9.

  19. Lee Ndị Galetia 5:20.

  20. Genesis 13:18.

  21. Genesis 13:12.

  22. Mosiah 4:13.

  23. Gospel Topics, “Ohere Nhọrọ na Ịnye Nkọwa,” topics.ChurchofJesusChrist.org.

  24. Anyị ka “ọ dịịrị ịhọrọ ntọhapụ na ndụ ebighị ebi, site na nnukwu Onye Ogbugbo nke mmadụ niile.”(2 Nephi 2:27). Ohere nhọrọ na ekwekwa nhọrọ ọjọọ nke ndị ọzọ n’emebi ihe iwete mgbu na ntaram ahụhụ ma mgbe ụfọdụ ma ọnwụ. Akwụkwọ nsọ niile na-akọwa nke ọma na Onyenwe anyị Chineke nyere ohere nhọrọ ka mmadụ nwee ike họrọ ihe ọma ma ọbụ ajọọ ihe (lee 2 Nephi 2:16).

  25. Lee Gospel Topics, “Ohere Nhọrọ na Ịnye Nkọwa,” topics.ChurchofJesusChrist.org.

  26. Kwusaa Oziọma M: Ihe Ndu nye Ije ozi Mgbasa ozi ọma (2019), 52, ChurchofJesusChrist.org; emphasis added.

  27. Russell M. Nelson, “Ị ghọ Ndị nsọ Ụbọchị ikpeazụ a Eji amaatụ,” Liahona, Nov. 2018, 113.

  28. Lee Ozizi na Ọgbụgba-ndụ niile 19:23

  29. Ọ dabaara m itolite n’ebe obibi ebe udo meriri. Nkea bụ n’ihi naanị ike mmetụta nke nne anyị, onye bụ onye otu nke Nzukọ nsọ kwesịrị ntụkwasị obi. Nna m gbasiri ike n’ụzọ niile kama ọ dịghị ike n’ọrụ nzukọ nsọ. Nne kwanyere nna anyị ugwu ma zere esemokwu. Ọ kuziiri anyị ihe dịka ụmụ ntakịrị ikpe ekpere ma gaa nzukọ nsọ. Ọ kuzikwaara anyị inwe ịhụnaanya ma jeere ibe anyị ozi (lee Mosiah 4:14–15). Itolite n’ụdị ebe obibi ahụ wetere udo ma buworịị nnukwu ngọzi n’ime ndụ m.

  30. Russell M. Nelson gụsịrị akwụkwọ site na Ụlọakwụkwọ nke Ọgwụ Mahadum nke Utah onye mbụ na klas ya mgbe ọ gbara afọ 22. Ọ chọwo nke ukwuu ịbụ onye na-awa ahụ ma nwete ọzụzụ kachasị mma e nwere n’ụlọ ọrụ ukwu nke ahụisike. O jiri ikwesi ntụkwasị obi mejupụta nkwa ndị agha na Korea na Japan. N’ọtụtụ afọ ọ bụ onye ọsụ ụzọ na iwa obi emepere emepe ma a maara ya ama gburugburu ụwa. Ka nkwado nkea mabigara mma oke bụ iji gọzie mmadụ niile gburugburu ụwa jiri aka ọrụ ahụisike ya, nkwado ime mmụọ nke Onyeisi Nelson ọbụna dị mkpa karịa. Ọ bụ nna nke nnukwu ezi na ụlọ nke ụmụ, ụmụ ụmụ, na ụmụ ụmụ ụmụ. O jiri ikwesị ntụkwasị obi jeere ezi na ụlọ ya ozi na Nzukọ nsọ gburugburu ndụ ya.

  31. See Russell M. Nelson, “Ozi Mmepe,” Liahona, Me 2020, 6; lee kwa Russell M. Nelson, “Ọńụ na Nlanarị Ime mmụọ,” Liahona, Nov. 2016, 81–84.

  32. Russell M. Nelson, “Ozi Mmepe,” 6.