Ọgbakọ Zuru ọha
“Ị Hụrụ M N’anya Karịa Ihe Ndịa?”
Ọgbakọ Zuru ọha Ọktoba 2021


“Ị Hụrụ M N’anya Karịa Ihe Ndịa?”

Kedụ ihe ndị i nwere ike ime nime ndụ nke onwe gị iji gosi na gị buzọ hụ Onyenwe anyị n’anya?

Na Nọvemba 2019, mụ na enyi m gara nleta na Ala Nsọ ahụ. Mgbe ahụ, anyị nyochara ma mụọ banyere ndụ nke Jizọs Kraịst. Otu ụtụtụ anyị guzooro na n’ọnụmmiri ugwu ọdịda anyanwụ nke Osimiri nke Galili n’ebe nke nweworo ike bụrụ ebe Jizọs zutere ndị n’eso ụzọ Ya n’isote Mbilite N’ọnwụ Ya.

Mgbe Mbilite N’ọnwụ nke Jizọs gasịrị, dị ka anyị n’agụ nime Jọn isi nke 21, Pita na ndị n’eso ụzọ ndị ọzọ gburu azụ abali niile n’enweteghi ihe ọbụla.1 N’ụtụtụ, ha hụrụ otu nwoke guzoro n’ọnụmmiri onye gwara ha tụnye ugbu ha n’akụkụ nke ọzọ nke ụgbọ mmiri ha. N’iju ha anya, ugbu ahụ jupụtara n’ụzọ ọrụ ebube.2

Ozugbo ha matara na nwoke ahụ bụ Onyenwe anyị, ma ha mere ngwa ngwa ịga kelee Ya.

Dịka ha dọrọ ugbu ahụ ruo n’ọnụmmiri, nke azụ juru, Jizọs kwuru sị, “Bịanụ ma rie nri.”3 Jọn kọwara na “mgbe ha riworo nri, Jizọs gwara Simon Pita, Simon, nwa nke Jonas, ị hụrụ m n’anya karịa ihe ndịa?”4

Mgbe m guzoro na otu ọnụmmiri ahụ, a matara m na ajụjụ ahụ nke Onye Nzọpụta bụ otu n’ime ajụjụ ndị kachasị mkpa nke O nwere ike ịjụ m otu ụbọchi. Ọ dịrị m mfe ịnụta olu Ya na-ajụ, “Russell, ị hụrụ m n’anya karịa ihe ndịa?”

Ị na-eche ihe Jizọs nọ na-arụ aka mgbe Ọ jụrụ Pita, “Ị hụrụ m n’anya karịa ihe ndịa?”

Ịmetụta ajụjụ nkea nye onwe anyị n’ụbọchi anyị, Onyenwe anyị nwere ike na-ajụ anyị banyere otu anyị si arụ ọrụ na banyere ọtụtụ mmetụta ndị dị mma na ndị dị njọ na-ama aka maka ige ntị anyị na oge anyị. O nwere ike na-ajụ onye ọbụla n’ime anyị ma anyị hụrụ Ya n’anya karịa ihe ndị nke ụwa nkea. Nke a nwere ike bụrụ ajụjụ banyere ihe anyị kpọrọ ihe na ndụ n’ezie, onye anyị na-eso, na otu anyị si ahụta mmekọrịta anyị na ndị otu ezi na ụlọ na ndị agbata obi. Ma ọbụ enwere ike Ọ na-ajụ ihe n’ewetere anyị ọńụ na ańụrị n’ezie.

Ihe ndị ụwa nkea ọ n’ewetere anyị ọńụ, ańụrị, na udo nke Onye Nzọpụta n’enye ndị n’eso ụzọ Ya na nke Ọ na-enye anyị? Naanị Ya nwere ike iwetere anyị ezi ọńụ, ańụrị, na udo site na anyị ịhụ Ya n’anya na isoro nkuzi Ya niile.

Olee otu anyị ga-esi aza ajụjụ ahụ “Ị hụrụ m n’anya karịa ihe ndịa?”

Mgbe anyị chọpụtara ihe ajụjụ nkea pụtara n’uju, anyị nwere ike bụrụzie ndị otu ezi na ụlọ ka mma, ndị agbata obi, ndị amaala, ndị otù nke Nzukọ nsọ, na ụmụọkpara na ụmụada nke Chineke.

Na afọ m dị, a gawo m ọtụtụ nkwam ozu. O doro m anya na ọtụtụ n’ime unu a huwo ihe m huworo. Mgbe a na-eme mmemme ndụ nke onye otù ezi na ụlọ ma ọbụ otu enyi nwụrụ anwụ, ọ rara ahụ ka onye na-ekwu okwu kwuo banyere otu ebe obibi nke onye ahụ ha n’ibu, ọnụọgụgụ ụgbọala ya, ma ọbụ ihe ndị fọrọ na akaụnt ụlọ ego ya. Ha anaghị ekwukarị banyere ihe etinyere na ikuku. Na nkwam ozu ndị kacha nke m gaworo, ha n’etinye uche na mmekọrịta nke onye ha hụrụ n’anya, ije ozi nye ndị ọzọ, nkuzi niile nke ndụ na nhumihe niile, na ịhụnaanya ha nwere maka Jizọs Kraịst.

Aghọtaghekwala m. Anaghị m ekwu na inwe ebe obibi dị mma ma ọbụ ụgbọ ala dị mma ezighị ezi ma ọbụ na ime soshịal media dị njọ. Ihe m n’ekwu bụ na njedebe, ndị ahụ bara uru nwa obere tụnyere ịhụ Onye Nzọpụta n’anya.

Mgbe anyị hụrụ Ya n’anya ma soro Ya, anyị na-enwe okwukwe na Ya. Anyị echegharịa. Anyị esoro ọmụmaatụ Ya ma mee baptizim ma nata Mmụọ Nsọ. Anyị na anagide ruo ọgwụgwụ ma nọrọ n’ụzọ nke ọgbụgba ndụ. Anyị na-agbaghara ndị otù ezi na ụlọ na ndị agbata obi site n’ịhapụ iwe anyị nwere ike n’ewe. Anyị na-agbalịsike idebe iwụ nsọ nke Chineke. Anyị na-agbalịsike inwe nrube isi. Anyị na-eme ma n’edebe iwu ọgbụgba-ndụ niile Anyị na-akwanyere nna anyị na nne anyị ugwu. Anyị n’edopụ iche mmetụta niile nke ụwa na-adịghị mma Anyị na-akwado onwe anyị maka Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ Ya.

N’ime “Kraịst Dị-ndụ: Ọgbụgba ama nke Ndị Ọzi,” anyị na-agụ sị: [Jizọs] otu ụbọchi ga-alaghachi n’ụwa. … Ọ ga-achị dịka Eze ndị Eze ma chịa dịka Onyenwe anyị nke Ndịnwe anyị, ma ikpere niile ga-egbu n’ala ma ire niile ga-ekwu n’ofufe n’ihu Ya. Onye ọbụla nime anyị ga-eguzoro ka O kpee ikpe n’usoro nke ọrụ anyị niile na ọchịchọ niile nke obi anyị sịrị dị.”5

Dịka otu n’ime Ndị ozi onye kanyere aka n’akwụkwọ “Kraịst Ahụ Dị ndụ” e nwere m ike kwuo na ịmara na Jizọs “bụ ihè ahụ, ndụ ahụ, na olileanya nke ụwa”6 na-enye m ọchịchọ karịrị akarị ịhụ Ya n’anya ụbọchi niile karịa.

A na m agba ama na Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraịst dị ndụ. A na m agba ama na Ha hụrụ anyị n’anya. Akwụkwọ nsọ niile na-akuzi na “Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu, nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, ka e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke nwere kwere na ya, kama nwee ndụ ebighị ebi.”7 Akwụkwọ nsọ na-akuzikwa na Jizọs “hụrụ ụwa n’anya otu a na o nyere ndụ nke onwe ya, na ka ha ra bụ ndị kwere nwere ike bụrụ ụmụọkpara [na ụmụada] nke Chineke.”8

Nna nke Eluigwe hụrụ anyị n’anya otu a na Ọ kwadoro atụmatụ Ya nke nzọpụta jiri otu Onye Nzọpụta dịka onye nọ n’etiti. Ma Jizọs hụrụ anyị n’anya otu a na na nnukwu Kansụl n’ime Eluigwe, mgbe Nna nke Eluigwe jụrụ, “Onye ka M ga-eziga?” Jizọs, onye bụ nwa nke mbụ nke ụmụ nke ime mmụọ nke Nna, zara, “Lee M ebe a, ziga m.”9 Ọ gwara nye Nna, “Nna, ka uche gị mee, ma otito bụrụ nke gị ruo mgbe niile.”10 Jizọs nyere onwe ya ịbụ Onye Nzọpụta anyị na Onye Mgbapụta anyị ka anyị wee nwee ike bụrụ dịka Ha ma laghachi n’ihu Ha.

Akwụkwọ nsọ abụọ ndịa nakwa akuzi na ịlaghachi n’ihu Ha anyị kwesịrị ikwere. Anyị kwesịrị ikwere na Jizọs na n’ime atụmatụ nke ańụrị nke Chineke. I kwere bụ inwe ịhụnaanya ma soro Onye Nzọpụta anyị ma debe iwu nsọ niile, ọbụna n’etiti mnwale na esemokwu.

Ụwa taa enweghị ebumnuche. Enwere ndakpọ olileanya, ekweghị ekwe, mmekpa ahụ, na ihe ndọpụ uche.

Onyeisi Dallin H. Oaks, n’ikwu okwu na 2017, kwuru ihe ndịa sotere: “Ugbua bụ oge ihe ịma aka, jupụtara na nchegbu buru ibu: agha niile na asịrị agha niile, ọrịa ofufe nwere ike itiwapụ, oké ọkọchị, ide mmiri, na okpomọkụ gburugburu ụwa.”11

Anyị agaghị atụfu ịhụnaanya anyị maka ma olileanya n’ime Jizọs, ọbụna mọbụrụ anyị ezute aka mgba niile dịka ha karịrị akarị. Nna nke Eluigwe na Jizọs enweghị ike echefu anyị. Ha hụrụ anyị n’anya.

Ọktoba gara aga, Onyeisi Russell M. Nelson kuziri anyị mkpa nke itinye Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraịst mbụ n’ime ndụ anyị. Onyeisi Nelson kuziri anyị na otu ihe ọkwu ahụ Isreal pụtara bụ “kwe ka Chineke merie.”14

Ọ jụrụ onye ọbụla nime anyị ajụjụ ndịa niile: “Ị dị njikere i kwe ka Chineke merie nime ndụ gị? dị njikere ị kwe ka Chineke bụrụ mmetụ kachasị mkpa n’ime ndụ gị? Ị ga ekwe ka okwu Ya niile, iwu nsọ Ya, na ọgbụgba ndụ Ya niile metụta ihe i na-eme kwa ụbọchị? Ị ga-ekwe ka olu Ya dịrị mkpa karịa ihe ọbụla? Ị dị njikere ịkwe ihe ọbụla Ọ chọrọ ka gị mee bute ụzọ n’ihe niile ndị ọzọ ị chọrọ ime? Ị dị njikere ị kwe ka uche Ya kpugide uche gị?”13

Anyị garịrị mgbe niile cheta na ezigbo obi ụtọ anyị dabeere na mmekọrịta anyị na Chineke, na Jizọs Kraịst, na n’etiti onwe unu.

Otu ụzọ iji gosi ịhụnaanya anyị bụ isoro ndị ezi na ụlọ, ndị enyi, na ndị agbata obi na-ime ụfọdụ obere ihe niile iji jeere onwe unu ozi karịa. Mee ihe ndị na-eme ụwa nkea ebe dị mma karịa.

Kedụ ihe ndị i nwere ike ime nime ndụ nke onwe gị iji gosi na gị buzọ hụ Onyenwe anyị n’anya?

Dịka anyị n’etinye uche ịhụ ndị agbata obi anyị n’anya dịka Ọ hụrụ ha n’anya, anyị n’ebido ịhụ ndị gbara anyị gburugburu nanya n’ezie.14

A na m ajụ ọzọ, olee otu ị ga-esi aza ajụjụ nke Onye Nzọpụta “Ị hụrụ m n’anya karịa ihe ndịa?”

Dịka unu na-atule ajụjụ nkea otu m sịrị mee, a na m ekpe ekpere na unu ga-aza dịka Pita sịrị mee ogologo afọ gara aga, “Ee, Onyenwe anyị; ị maara na m hụrụ gị n’anya,”15 ma mgbe ahụ gosi ya site n’inwe ịhụnaanya na ijere Chineke na ndị niile gbara gị gburugburu ozi.

A na m agba ama na agọziwo anyị inwe ozi ọma nke Jizọs Kraịst iji duo anyị n’ụzọ anyị si ebi ndụ na otu anyị si akpasị onwe anyị agwa. N’ime Ya, anyị na-achọpụta na ụmụada na ụmụọkpara niile nke Chineke dị oke mkpa nye Ya.

A na m agba ama na Jizọs Kraịst bụ Onye Nzọpụta anyị hụrụ n’anya. Ọ bụ Ọkpara A Mụrụ Naanị nke Chineke. Ma A na m agba ama nkea n’obi umeala n’aha nke Jizọs Kraịst, amen.

Bipụta