Ntozu oke Abụghị Enweghị Ntụpọ
Mgbe ọ dị gị ka idawo ọtụtụ mgbe nke ịganihu na-anwa, cheta Aja mgbaghara mmehie nke Kraịst na amara nke ọ na-eme ya adị adị dị ire.
Otu mgbe e zigaara m nwaada m na ọgọ m nwoke ozi jiri atụmatụ olu-ruo-edeerede dị na ekwe ntị m. E kwuru m, “Hei, unu abụọ. N’ezie a hụrụ m unu n’anya.” Ha natara, “Akpọrọ unu abụọ asị. Ekwesịrị ịhụ unu n’anya.” Ọ bụ na ọdịghị ịtụnanya otu ozi dị mfe nghọta dị mma nwere ezi ebumnobi nwere ike nwee nghọtahie? Nkea bụ ihe na-eme ozi nke nchegharị na ntozu oke nke Chineke mgbe ụfọdụ.
Ụfọdụ na-amaghị ama na-anata ozi na nchegharị na mgbanwe adịghị mkpa. Ozi nke Chineke bụ na ha dị oke mkpa.1 Mana ọ bụ na Chineke ahụghị anyị na-anya n’agbanyeghị adịghị ike anyị. Ọ bụ eziokwu! Ọ hụrụ anyị n’anya n’ụzọ zuruoke. A hụrụ m ụmụ ụmụ m n’anya, etozughị oke niile na ihe niile, mana nke ahụ apụtaghị na m achọghị ka ha metazie ma bụrụzie ihe niile ha nwere ike ịbụ. Chineke hụrụ anyị n’anya otu anyị dị, mana Ọ hụkwara anyị n’anya nke ukwuu ịhapụ anyị otu a.2 Itolite niime Onyenwe anyị bụ ihe ndụ anụ ahụ bụ nnọọ maka ya.3 Mgbanwe bụ ihe Aja mgbaghara mmehie nke Kraịst bụ nnọọ maka ya. Ọbụghị naanị na Kraịst nwere ike ibilite n’ọnwụ, sachaa, kasie obi, ma gwọọ anyị, mana site na ya niile, O nwere ike ịgbanwe anyị ịdịrịzi dịka Ya karịa.4
Ụfọdụ na-amaghị ama na-anata ozi na ncheghar bụ ihe na-eme otu mgbe. Ozi nke Chineke bụ na, dịka Onyeisi Russell M. Nelson kuziworo na “Nchegharị … bụ ihe usoro.”5 Nchegharị nwere ike gbuo oge na mgbalị ugboro ugboro,6 ya mere ịgbahapụ njọ7 ma “ghara inwe omume ime ihe ọjọọ, kama ime ihe ọma mgbe niile”8 bụ nchụso ndị nke oge ndụ.9
Ndụ dị ka ọsọ mgbagharị okporo ụzọ obodo. Anyị agaghị eji otu tank gas eru ebe anyị na-aga. Anyị garịrị agbajugharị tank ahụ mgbe na mgbe. Ị nara oriri nsọ dị ka ịnyaba n’ime ebe a na-agba gas. Ka anyị na-echegharị ma megharịa ọgbụgba ndụ anyị ọhụụ, anyị na-ekwe nkwa ịdị njikere anyị idebe iwu nsọ niile, ma Chineke ma Kraịst e jiri Mmụọ Nsọ gọzie anyị.10 N’ezie, anyị na-ekwe nkwa ịga n’ihu na njem anyị, ma Chineke ma Kraịst na-ekwe nkwa ịgbajugharị tank ahụ.
Ụfọdụ mmadụ na-amaghị ama na-anata ozi ahụ na ha etozughị isoro n’uju mee ihe n’ime oziọma ahụ n’ihi na ha ewepụchabeghị aka kpamkpam na-agwa ọjọọ. Ozi nke Chineke bụ na ntozu oke abụghị enweghị ntụpọ.11 Ntozu oke bụ ịkwụwa aka ọtọ ma na-agbalị. Anyị ga-akwụwarịrị aka ọtọ n’ebe Chineke, ndị ndu ọkwa nchụaja, na ndị ọzọ hụrụ anyị na-anya nọ,12 ma anyị ga-agbalịsirịrị ike idebe iwu nsọ niile nke Chineke ma ghara ịda mba naanị n’ihi na anyị dahiere.13 Okenye Bruce C. Hafen kwuru na izulite agwa dịka nke Kraịst “na-achọ ndidi na ntachi obi karịa otu o si chọọ enweghị ntụpọ.”14 Onyenwe anyị ekwuwo na onyinye nke Mmụọ ahụ ka a “na-enye n’ihi nrite uru nke ndị ahụ hụrụ m n’anya ma na-edebe iwu nsọ m niile, na onye nke na-achọ ime otu a.”15
Otu nwata nwoke m ga-akpọ Damon dere: “N’itolite, agbara m mbọ ịhapụ nziakwụna. Ihere mekwara m na m enweghị ike imetazi ụmụ ihe.” Oge ọbụla Damon dahiere, mgbu nke mmakwaara adịrịzie nke ukwuu, mere ya ekpee onwe ya ikpe nke etozughị oke maka ụdị amara ọbụla, mgbaghara, ma ọbụ ohere ndị ọzọ sitere na Chineke. O kwuru: “Ekpebiri m na o kweere m nnọọ inwe mmetụta obi ọjọọ oge niile. Echere m na ikekwe Chineke kpọrọ m asị n’ihi na adịghị m njikere ịrụsị ọrụ ike ma gbanahụ nkea kpamkpam. A ga m agbalị otu izu ma mgbe ụfọdụ otu ọnwa, mana emesịa m daa mba ma chee, ’enweghị m ike nnọọ itozu oke, ya mere kedụ mkpa ọ dị n’ịgbalị nnọọ?’”
Otu mgbe n’ụdị ịda mba, Damon gwara onye ndu ọkwa nchụaja ya, “Elemanya ekwesịrị m ịkwụsị nnọọ ịbịa nzukọ nsọ. Ike a gwụwo m ịdị na-abụ onye ihu abụọ.”
Onye ndu ya zaghachiri: “Ị bụghị onye ihu abụọ n’ihi na i nwere agwa ọjọọ ị na-agba mbọ ịkwụsị. Ị bụ onye ihu abụọ ma ị zotuo ya, tụọ asị banyere ya, ma ọbụ nwaa ịgwa onwe gị na Nzukọ nsọ nwe nsogbu ahụ maka ihiwe ụdị ụkpụrụ ahụ dị elu. Ịkwụwa aka ọtọ banyere omume gị niile na ịgbaso usoro iji gaanihu abụghị ịbụ onye ihu abụọ. Ọ bụ ịbụ onye na-eso ụzọ.”16 Onye ndụ a ńomiri Okenye Richard G. Scott, onye kuziri na: “Onyenwe anyị na-ahụta adịghị ike niile n’ụzọ dị iche iche karịa otu O sị ahụta nnupu isi. … Mgbe Onyenwe anyị na-ekwu maka adịghị ike niile, ọ na-ejikarị ebere.”17
Echiche nke ahụ nyere Damon olile anya. Ọ matara na Chineke anọghị nelu ebe ahụ na-asị, “Damon emebiwo ya ọzọ.” Kama, ọ dị nnọọ ka Ọ na-ekwu sị, “Lee ka Damon siri meruo.” Nwata nwoke nkea nikpeazụ kwụsịrị ileda anya nihere ma ọbụ ile anya aka abụọ maka ngọpụ na mgbanahụ ụta. O leliri anya elu maka enyem aka si n’igwe, ma ọ chọtara ya.18
Damon kwuru si: “Naanị oge m tụgharịrị chewe ihu na Chineke mgbe gara aga bụụrụ ịrịọ maka mgbaghara, mana ugbua a nakwa m arịọ maka amara—ike Ya na-akwado’ [Bible Dictionary, “Amara”]. Emebeghị m nke ahụ mbụ. N’oge ugbua a na m egbu ntakịrị oge iji kpọọ onwe m asị ma wee ọtụtụ oge na-ahụ Jizọs n’anya maka ihe O meworo.”
Ị chewe ogologo oge Damon gbalịsiworo ike, o nyeghị aka ma o kweghị omume ka ndị nne na nna na ndị ndu na-enyere ya aka ikwu “agaghịkwa ọzọ” ọsọọsọ ma ọbụ na-aka ike hiwe ụfọdụ ụkpụrụ nke nzere iwere dịka “ntozu oke.” Kama, ha jiiri ebumnobi dị obere, kwere mmeta bido. Ha tufuru atụmanya ndị nke ihe niile ma ọbụ enweghị ma tụkwasị uche na uto na amụba amụba, nke kwere ka Damon metazie ọganiihu dị iche iche kama nke ọdịda.19 Ya, dịka ndị Limhi emere ohu, mụtara na ya nwere ike “nwee ọganiihu ntakịrị ntakịrị.”20
Okenye D. Todd Christofferson enyewo ndụmọdụ si: “Iji mee ihe buru [oke] ibu, ọ dị mkpa na anyị ga-arụ ya ọrụ kwa ụbọchị ntakịrị ntakịrị. … Itinye àgwà ọhụrụ na nke dị mma n’ime omume anyị ma ọbụ imeri àgwà ọjọọ ma ọbụ mmara ahụ [ọtụtụ] mgbe pụtara mbọ taa nke ọzọ ga-esoro echi ma emesịa ọzọ, elemanya ruo ọtụtụ ụbọchị, ọbụna ọtụtụ ọnwa na ọtụtụ afọ. … Mana anyị nwere ike ime ya n’ihi na anyị pụrụ ịrịọ Chineke … maka enyem aka anyị chọrọ ụbọchị ọbụla.”21
Ugbua, ụmụnne nwoke na ụmụnne nwanyị, ọrịa mkpochapụ COVID-19 enwebeghị onye ọbụla ọ dịịrị mfe, mana nnọpụ iche soro mgbochi ndebe iche emewo ndụ esie ike karịsịa maka ndị ahụ na-agbalịsị ike ịhapụ àgwà ọjọọ. Chetakwa na mgbanwe dị ire, nchegharị bụ usoro, ma ntozu oke abụghị enweghị ntụpọ. Kachasị mkpa, chetakwa na Chineke na Kraịst dị njikere inyere anyị aka n’ebe a ma ugbua.22
Ụfọdụ na-amaghị ama na-ata ozi na Chineke na-eche inye aka tupu ruo mgbe anyị chegharịworo. Ozi nke Chineke bụ na Ọ ga-enyere anyị aka dịka anyị na-echegharị. Amara Ya dịịrị anyị “na-agbanyeghị ebe anyị nọ n’ụzọ nke nrube isi.”23 Okenye Dieter F. Uchtdorf ekwuwo si: “Chineke achọghị ndị n’enweghị ntụpọ. Ọ na-achọ ndị ahụ ga-enye ‘obi ha na uche dị njikere’ [Ozizi na Ọgbụgba-ndụ niile 64:34], ma Ọ ga-eme ha ‘zuo oke n’ime Kraịst’ [Moroni 10:32–33].”24
Ọtụtụ enwewo mmekuta site na mmekọrịta mebiri emebi na nke na-adịghị mma na o siiri ha ike ikwere na ọmịiko na ogologo ntachi obi nke Chineke. Ha na-agbalisike ịhụta Chineke dịka Ọ dị—Nna dị ịhụnaanya n’ezute anyị na mkpa anyị25 ma marakwa otu esi “enye ndị rịọrọ ya ihe ndị dị mma.”26 Amara Ya abụghị nnọọ naanị ihe nrite maka ntozu oke. Ọ bụ “enyem aka sị n’igwe” Ọ na-enye bụ ihe na-enyere anyị aka itozu oke. Ọ bụghị nnọọ ụgwọ maka eziomume. Ọ bụ “ onyinye dị nsọ nke ume” Ọ na-enye bụ ihe na-enyere anyị aka ighọ ndị eziomume.27 Anyị a naghị aga nnọọ ije chewe ihu na Chineke na Kraịst. Anyị so Ha na-aga ije.28
Gburugburu Nzukọ nsọ, ndị na-eto eto na-agụpụta isiokwu nke NdịInyom Nta na nke ndị Kworum Ọkwa nchụaja nke Erọn. Site na New Zealand ruo na Spain ruo Ethiopia ruo Japan, ndịinyom nta na-ekwu sị, “eji m onyinye nke nchegharị kpọrọ ihe.” Site na Chile ruo na Guatemala ruo Moroni, Utah, ndịikom nta na-ekwu sị, “Dịka m na-gbalịsie ike ije ozi, nwee okwukwe, chegharịa, ma metazie ụbọchị ọbụla, a ga m etozu oke ịnata ngọzi niile nke tempụl na ọńụ nke oziọma na-anọgide.”
A na m ekwe nkwa ngọzi niile ndị ahụ na ọńụ dị ire ma dịrị nso maka ndị ahụ ndị n’edebe iwu nsọ niile na “ya nke na-achọ otu ahụ ime.”29 Mgbe ọ dị gị ka idawo ọtụtụ mgbe nke ịganihu na-anwa, cheta Aja mgbaghara mmehie nke Kraịst na amara nke ọ na-eme ya adị adị dị ire.30 “Ogwe aka ebere [Ya] ka esetipụrụ ruo na gị.31 A hụrụ gị n’anya—taa, na-afọ 20, na mgbe niile. Na aha nke Jizọs Kraịst, amen