Ọgbakọ Zuru ọha
Ekpere M Bụ Na Ọ Ga-eji Anyị Arụ ọrụ
Ọgbakọ Zuru ọha Ọktoba 2021


10:36

Ekpere M Bụ Na Ọ Ga-eji Anyị Arụ ọrụ

Obere mbọ ndị a gbakọtara aka mee na-aba nnukwu uru, na-eme ọtụtụ ihe anyị na-eme n’onwe anyị dị ka ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst adị ukwuu.

Kuki nke a eji achịcha filo na mkpụrụ pistachio mee bụ maka ekele I meela. Ọ bụ ezi na ụlọ Kadado mere ya ndị, kemgbe ọtụtụ afọ iri, nwere ụzọ ebe ruru atọ a na-eme achịcha na Damascus, Syria. Mgbe agha dara, iwu mmachibido ihe oriri kwụsịrị ihe oriri na ihe ndị eji enyere ndụ aka site n’irute mpaghara nnukwu obodo ahụ. Ndị Kadado malitere ịgba ọnụ. Na mgbe ọnọdụ ihe isi ike nke a bịara ka njọ, Ndị Onyinye Afọ ọma nke Ndị nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a na ụfọdụ ndị ọrụ Rahma Worldwide nwere ezigbo mgbam ume malitere inye otu ugboro nri dị ọkụ kwa ụbọchị ya na mmiri ara ehi maka ụmụntakịrị. Mgbe ihe isi ike gasịrị, ezi na ụlọ ahụ malitere ndụ ha—tinyekwara ọrụ ime achịcha ha—ọzọkwa n’obodo ọhụụ.

Na nso nso a, otu igbe kukiis bịarutere n’ụlọ ọrụ Nzukọ nsọ niile tinyere ozi a na-esote:“N’ihe karịrị ọnwa abụọ, anyị gbalịrị inweta ihe oriri site n’usekwu [Afọ ọma nke] Ndị nsọ Ụbọchị ikpeazụ a–Rahma . Ma ọ bụghị ma ya anyị [gaara] anwụ[rịị] site na agụụ. Biko nabata nke a … otu ihe iji maa atụ sitere n’ebe m na-ere ahịa dị ka obere ihe inye ekele. A na m arịọ Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile ka ọ gọzie gị … niihe niile ị na-eme.”1

Otu cookie nke obi ekele na ime ncheta. E mere ya maka gị. Nye ndị niile kpere ekpere mgbe e kirichara otu akụkọ na-ozi nzisa, nye ndị niile wepụtara onwe ha mgbe na ọ dịghị mfe ma ọ bụ ndị ji obi ọma wepụta ego tinye n’ego maka enyem aka ndị nwere mkpa; na-atụkwasị obi na ọ ga-enye aka, unu emeela.

Ọrụ Si na Chi nke Ilekọta Ndị ọ na-atụ n’ọnụ

Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nwere ọrụ si na chi nke ilekọta ndị ọ na-atụ n’ọnụ.2 Ọ bụ otu niime ogidi nke ọrụ nke nzọpụta na mbuli elu.3 Ihe bụ ezi okwu noge ụbọchị nke Alma hohaa bụkwa ezi okwu nye anyị: “Ma otu a, n’ọnọdụ ime nke ọma ha niile, ha achụpụghị ndị ọbụla gba ọtọ, ma-ọbụ ndị agụụ na-agụ, ma-ọbụ ndị akpịrị na-akpọ nkụ, ma-ọbụ ndị na-arịa ọrịa, ma-ọbụ ndị a na-azụbeghị azụ; ma ha etinyeghị obi ha niile n’akụ na ụba; ya mere ha na emepụ aka nye mmadụ niile, ma okenye ma nwata, ma oru ma ndị nwere onwe ha, ma nwoke ma nwanyị, ma ha anọghị n’ime nzukọ-nsọ ahụ ma-ọbụ ha nọ n’ime nzukọ-nsọ ahụ, na enweghị ịkpa-oke n’ebe ndị nọ na mkpa nọ.”4

Nzukọ nsọ Ahụ na-aza okù a na mbara ụzọ dị iche iche, gụnyere:

  • ije ozi nlekọta anyị na-eme site n’Otu Enyem aka, kworum ndị nke ọkwa nchụaja, na klas niile;

  • Ibu ọnụ na iji ego obubu ọnụ niile mee ihe;

  • Ubi ndị nke enyem aka na canneries;

  • Ogige nnabata niile maka ndị batara n’obodo;

  • Nlekọta maka ndị ahụ nọ na mkpọrọ;

  • Mbọ niile nke Nzukọ nsọ maka enyem aka ụmụ mmadụ;

  • nakwa JustServe app, ebe e nwere ya, nke na-ejikọ ndị wepụtara onwe ha na ohere ije ozi.

Ndị a niile bụcha ụzọ, a haziri site n’aka ọkwa nchụaja, ebe obere mbọ etikọtara ọnụ na enwe nnukwu mmetụta, na-eme ọtụtụ ihe anyị na-eme n’onwe anyị dị ka ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst adị ukwuu.

Ndị amụma Nwere Ọrụ Nlekọta maka Gburugburu Ụwa.

Ndị amụma ka ọ dịịrị ilekọta gburugburu ụwa, ọ bụghị naanị maka ndị otù Nzukọ nsọ ahụ. E nwere m ike ịkọwa site na nhụmiihe nke m otu ndị Otù Ndịisi Mbụ jiri tinye obi ha na uchu ha nime ọrụ nlekọta ahụ. Dị ka mkpa na-eto, Otù Ndịisi Mbụ a gwawo anyị ịmụbawanye nlekọta enyem aka ndị nọ na mkpa anyị n’ụzọ dị mma. Ha nwere mmasị maka akụkọ ndị ukwu a na-anụ maka ha ma ndị kachasị nta.

Na nso nso a, anyị weteere ha otu niime akwa mgbochi maka ahụike nke ndi Beehive Clothing kwara maka ọtụtụ ụlọ ọgwụ iji rụọ ọrụ n’oge ọrịa mkpochapụ ahụ. Dị ka onye dibịa bekee, Onyeisi Russell M. Nelson nwererịị mmasị dị ukwuu. Ọ chọghị naanị ịhụ ya. Ọ chọburu iyiri ya—tụlee kọf niile na ogologo ya na ụzọ o si kechie na-azụ. O mechara gwa anyị, n’olu akwa ya, “Mgbe i zutere ndị mmadụ n’ọrụ ndị ị na-arụ, kelee ha maka ibu ọnụ ha, maka onyinye ha niile, na ije ozi ha n’aha nke Onyenwe anyị.”

Nkọwa enyere Enyemaka ụmụ mmadụ

Na ntụzi aka nke Onyeisi Nelson, a na m akọwapụtara unu gbasara otu Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị ikpeazụ a ji na-enye aka niihe gbasara oke ifufe niile, ala ọma jijiji niile, mkposasị ndị gbara ọsọ ndụ—na ọbụna ọrịa mkpochapụ—ekele dịịrị Ndị nsọ Ụbọchị ikpeazụ a na ọtụtụ ndị enyi maka obi ebere ha. Ebe atụmatụ COVID-19 karịrị 1,500 bụrịị na-ezi okwu ihe a kachasị atụkwasị obi niihe gbasara enyem aka Nzukọ nsọ kemgbe ọnwa 18 gara aga, Nzukọ nsọ ahụ enyewokwa aka na oke ihe ọjọọ eke dị 933 na ọgbaaghara ndị gbara ọsọ ndụ na mba 108. Mana ọnụ ọgụgụ anaghị akọcha akụkọ ahụ niile. Ka m kọwaa na nke nke ụzọ ọmụmaatụ anọ gosịrị ihe ụtọ kachasị nta anọ banyere ihe ndị a na-eme.

Enyem aka COVID nke South Afrịịka

Dieke Mphuti nke Welkom, South Africa, gbara afọ iri na isii, ka nne na nna ya nwụrụ afọ gara aga, hapụrụ ya ilekọta ụmụnne ya atọ ndị ọ tọrọ n’onwe ya. Ọ bụụrụ ihe na-eyi egwu maka ya bụ nwanyị ịchọta ihe oriri ga-ezu ezu, mana nihi ụkọ ngwa enyemaka nke COVID na kwarantin niile, mere ka ọ raa ezigbo ahụ ikwe omume. Ọtụtụ mgbe agụrụ na-agụ ha, na-atụchata naanị site na-aka nnyepụ nke ndị agbata obi.

Dieke Mphuti

N’otu ụbọchị anwụ na-acha na Ọgọst 2020, Dieke nwere ịtụnaanya site n’aka a kụrụ n’ọnụ ụzọ ya. O meghere ya wee hụta mmadụ abụọ na ọ maghị ndị ha bụ—otu onye nnọchi anya Nzukọ nsọ sitere na mpaghara ụlọ ọrụ nọ na Johannesburg na onye nke ọzọ onye ọrụ sitere na mpaghara Social Development nke South Africa.

Otù abụọ ndị a ejikọtawo ọnụ n’iwete ihe oriri nye ezi na ụlọ ndị nọ niihe egwu. Obi kụdara Dieke mgbe ọ hụtara ukwu nri ọka na ihe oriri ndị ọzọ a na-eri eri, a zụrụ site n’ego Nzukọ nsọ maka enyemaka ụmụ mmadụ. Ihe ndị a ga-enyere ya aka ị kwado ezi na ụlọ ya ọtụtụ izu ụka tutu ihe enyem aka nke ndị gọọment kwadoro e nwee ike malite ịdị ire maka ya.

Akụkọ nke Dieke bụ otu niime puku kwuru puku nke ụdịrị nhụmiihe ndị ahụ na-emewo na gburugburu ụwa n’oge ọrịa mkpochapụ COVID ahụ, unu nwe ekele maka ntụkọta ego unu e doro nsọ.

Enyem aka Afghan na Ramstein

Anyị niile a hụwo oyiyi niile nọ na-akụkọ na nso nso a—puku kwuru puku nke ndị a na-ebupụ n’ụgbọ elu site na Afghanistan. Ọtụtụ bịarutere n’ọdọ ụgbọ elu ma ọ bụ ebe ndị e wepụtara nwa mgbe nta nọ na Qatar, United States, Germany, na Spain tupu gawaniihu n’ebe ikpeazụ ha ga-ebi. Mkpa ha dị ọkụ ọkụ, ma Nzukọ nsọ ahụ zara site na-inye ihe ndị dị iche iche na ndị wepụtara onwe ha maka enyem aka. Na Ramstein Air Base nọ na Germany, Nzukọ nsọ wetara nnukwu ihe ndị a tụkọtara gụnyere diapers, baby formula, ihe oriri na ọtụtụ akpụkpọ ụkwụ.

Onyinye maka Enyem aka ndị nọ na mkpa enyere ndị gbara ọsọ ndụ
Ndịinyom na-akwa akwa maka ndị Afghanistan gbara ọsọ ndụ

Ụfọdụ ụmụnne nwanyị ndị Otù Enyem aka hụtara na ọtụtụ ndịinyom Afghanistan naara eji uwe elu nke di ha were kpuchie isi ha niihi na ihe ndị ha ji ekpuchi isi n’usoro omenaala ha ka a dọpụrụ n’iwe n’ọdọ ụgbọ elu Kabul. Na omume nke ime enyi nke gafere otu okpukperechi ọbụla ma ọ bụ agbata omenaala niile, ụmụnne nwanyị si na Ngalaba ukwu Nke mbụ na Ramstein gbakọtara ịkwa uwe ọdịnaala nke ndị Muslim maka ndịinyom Afghanistan. Nwanne nwanyị Bethani sịrị, “anyị anụwo na ndịinyom nwere mkpa uwe mkpuchi nke ekpere, ma anyị na-akwa akwa ka ha nwee [ọnọdụ ọma] maka ekpere.”5

Enyem aka Ala ọma jijiji ndị Haiti

Ọmụmaatụ nke ọzọ na-abịa na-egosị na ịkwesịghị ịbụ ọgaranya ma ọ bụ agadi ịbụ ngwa ọrụ maka ihe dị mma. Marie “Djadjou” Jacques gbara afọ iri na asatọ si na Ngalaba nta Cavaillon nọ na Haiti. Mgbe ala ọma jijiji ahụ jọgburu onwe ya mere n’obodo ya na Ọgọst, ụlọ nke ndị ezi na ụlọ ya bụụrụ otu niime iri puku kwuru iri puku nke ụlọ ndị dara ada. Ọ dịcha nnọọ ka ihe na-ekweghị omume iche echiche ịda mba nke ebe obibi gị ifu. Mana kama ịdaba na ịda mba ahụ, Djadjou—na nkwenye rara ahụ—wepụtara onwe ya inyere ndị ọzọ aka.

Marie Jacques
Enyem aka Ala ọma jijiji Haiti

Associated Press

Ọ hụrụ otu onye agbata obi mere agadi nọ na-adọga ma malite ilekọta ya. O nyeere ndị ọzọ aka kpochapụ unyi. Na-agbanyeghị ike ọgwụgwụ ya, o sonyeere ndị otù Nzukọ nsọ ndị ọzọ na-ike ihe oriri, na inye ndị ọzọ ngwa nlekọta ịdị ọcha. Akụkọ nke Djadjou bụ nnọọ otu niime ọmụmaatụ ndị dị egwu nke ije ozi nke ndị ntoroọbịa na ndị dimkpa mere dị ka ha na-agba mbọ i soro ọmụmaatụ nke Jizọs Kraịst.

Enyem aka Ide mmiri German

Naanị izu ụka ole ma ole tupu ala ọma jijiji ahụ, otù ndị dimkpa ọzọ naara eje ụdị ozi yiri nke ahụ n’ofe Atlantic. Ide mmiri ahụ nke ruru gburugburu ndịda ndịda Europe niile na Julaị kachasị sie ike kemgbe ọtụtụ afọ.

Ide mmiri nọ na Germany

Mgbe mmiri ahụ talatara n’ikpeazụ, otu onye nwere ụlọ ahịa na-akụkụ osimiri nke obodo Ahrweiler, Germany, nnyochara ihe mebiri emebi ma o riri ya ọnụ nke ukwuu. Nwoke nke a nwere umeala, onye kwesiri ike na Katọlik, takara ekpere ka Chineke zitere ya onye ga-enyere ya aka. Na ụtụtụ ụsara chi ya, Onyeisi Dan Hammon nke Germany Frankfurt Mission bịarutere n’okporo ụzọ ahụ ya na obere otù ndị mgbasa oziọma yiri ves Ndị Na-enye aka na-acha odo odo. Mmiri ahụ e ruola 10 feet (3 m) na mgbidi ụlọ onye nwe ụlọ ahịa ahụ, hapụzie ogo pọtọpọtọ dị omimi. Ndị ahụ wepụtara onwe ha maka inye aka kupuru pọtọpọtọ ahụ, wepụ kapet na ihe eji jide okwute, ma bukọta ihe niile ọnụ n’okporo ụzọ maka mbupụ. Onye nwere ụlọ ahịa ahụ nwebigara ọńụ oke sooro ha rụọ ọrụ ọtụtụ awa, n’ịtụnaanya na Onyenwe anyị ezitewo otù ndị ozi Ya ịza ekpere ya—ma niime awa 24!6

“Ọ dị mma, Ekpere M Bụ Na Ọ Ga-eji Anyị Arụ ọrụ”

Na-ikwu okwu maka mbọ niile nke enyem aka maka ndị nọ na mkpa nke Nzukọ nsọ, Okenye Jeffery R. Holland kwuru otu mgbe: “A na-aza ekpere niile … ọtụtụ mgbe … site na Chineke iji ndị ọzọ rụọ ọrụ. Ọdị mma, Ekpere M Bụ Na Ọ Ga-eji Anyị Arụ ọrụ. Ekpere m bụ na anyị ga-abụ azịza ekpere nke ndị ọzọ.”7

Ụmụnne ndị nwoke na ndị nwanyị, site n’ozi nlekọta unu, ntụkọta ihe unu, oge unu, na ịhụnaanya unu, unu abụrụwo azịza nye ọtụtụ ekpere. Ma a ka nwekwara ọtụtụ ihe e nwere ime. Dịka ndị otù Nzukọ nsọ mere baptizim, anyị nọ n’okpuru ọgbụgba ndụ ilekọta ndị nwere mkpa. Mbọ nke onwe anyị n’otu n’otu abụchaghị ihe chọrọ ego ma ọ bụ ebe ndị tere anya;8 ha chọrọ nduzi nke Mmụọ nsọ na obi dị njikere ị sị Onyenwe anyị: “Ebe a ka m nọ, ziga m.”9

Afọ nke Onyenwe anyị Nabatara

Luk 4 kwuru na Jizọs bịara na Nazaret, ebe a zụrụ ya, ma guzoro n’ụlọ ọgbakọ ịgụ ihe. Nke a bụ na nso nso mmalite nke ozi anụ ahụ Ya, ma O ńomiri otu nkeji sitere na-akwụkwọ nke Aịzaya:

“Mmụọ nke Onyenwe anyị nọnyeere m, niihi na o tewo m mmanụ ikuziri ndị ogbenye oziọma; o zitewo m ịgwọ obi tiwara etiwa, ikwusa nnapụta nye ndị a dọkpụụrụ n’agha, na ime ka onye isi hụ ụzọ, na ime ka ndị a na-echi ọnụ n’ala nwere onwe ha,

“Ikwusa afọ nke Onyenwe anyị nabatara. …

“… Ụbọchị taa ka akwụkwọ nsọ nke a mejupụtara na ntị gị.”10

A na m agba ama na akwụkwọ nsọ ahụ a bụrụwo ihe emejuputara n’oge nke anyị kwa. A na m agba ama na Jizọs Kraịst a bịawo ịgwọ obi tiwara etiwa. Oziọma Ya bụ ime ka ndị isi hụ ụzọ Nzukọ nsọ Ya bụ ikwusa mgbapụta nye ndị a dọkpụụrụ n’agha, ma ndị na-eso ụzọ Ya n’ofe mba ụwa na-agba mbọ ime ka ndị a na-echi ọnụ n’ala nwere onwe ha.

Ka m mechie site n’ịjụgharị ajụjụ ahụ Jizọs jụrụ Onye ozi Ya Simon Pita: “ Ị hụrụ m naanya?”11 Isi uru oziọma bara bụ ihe a ga-ahụ niime otu anyị si zaa ajụjụ ahụ maka onwe anyị ma nye atụrụ [Ya] nri.”12 N’oke nkwanye ugwu na ịhụnaanya maka Jizọs Kraịst, Nna anyị ukwu, a na m akpọku onye ọbụla niime anyị ịbịa bụrụ akụkụ nke ije ozi Ya mara oke mma, ma ekpere m bụ na Ọ ga-eji anyị arụ ọrụ. Site na aha dị nsọ nke Jịzọs Kraịst, amen